Jeremaya 37:1-21

  • Ndị Kaldia hapụrụ ịlụso ndị Izrel agha, mechaa bịaghachi (1-10)

  • A tụrụ Jeremaya mkpọrọ (11-16)

  • Zedekaya na Jeremaya kparịtara ụka (17-21)

    • A na-enye Jeremaya achịcha (21)

37  Nebukadneza* eze Babịlọn chiri Zedekaya+ nwa Josaya eze ka ọ chịwa Juda.+ N’ihi ya, Zedekaya nọchiri Konaya*+ nwa Jehoyakim malite ịchị.  Ma, ya na ndị na-ejere ya ozi na ndị obodo ahụ emeghị ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.  Eze Zedekaya wee zie Jehukal+ nwa Shelemaya na Zefanaya+ nwa Measaya onye nchụàjà ka ha gaa gwa Jeremaya onye amụma, sị: “Biko, rịọrọ anyị Jehova bụ́ Chineke anyị arịrịọ.”  Jeremaya nọkwa na-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga n’obodo ahụ, n’ihi na ha akpọchibeghị ya n’ụlọ mkpọrọ.+  Mgbe ndị Kaldia nọchibidoro Jeruselem ma nụ na ndị agha Fero si Ijipt na-abịa,+ ha laghachiri, hapụzie ịlụso Jeruselem agha.+  N’oge ahụ, Jehova gwara Jeremaya onye amụma, sị:  “Mụnwa bụ́ Jehova, bụ́ Chineke Izrel, sịrị, ‘Gakwurunụ eze Juda, onye ziri unu ka unu bịa jụọ m ase, gwakwanụ ya, sị: “Ndị agha Fero, ndị na-abịa inyere unu aka, ga-alaghachi n’obodo ha, bụ́ Ijipt.+  Ndị Kaldia ga-abịaghachi lụso obodo a agha, weghara ya ma gbaa ya ọkụ.”+  Jehova kwukwara, sị: “Unu aghọgbula onwe unu,* na-asị, ‘Ndị Kaldia ga-alarịrị. Ha agaghị alụso anyị agha.’ Unu ekwula otú ahụ n’ihi na ha agaghị ala. 10  Ọ bụrụgodị na unu egbuo ndị agha ndị Kaldia niile na-alụso unu agha, ya abụrụkwa na ndị fọdụrụ n’ime ha bụ naanị ndị e merụrụ ahụ́, ha ga-esikwa n’ụlọikwuu ha pụta gbaa obodo a ọkụ.”’”+ 11  Mgbe ndị agha Kaldia hapụrụ Jeruselem n’ihi ndị agha Fero,+ 12  Jeremaya si Jeruselem gawa n’ala Benjamin+ ka e kenye ya ala n’ala ahụ bụ́ ala ndị obodo ha. 13  Ma, mgbe o ruru n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin, onyeisi ndị na-eche nche ebe ahụ jichiri ya. Aha ya bụ Iraịja. Ọ bụ nwa Shelemaya nwa Hananaya. Ọ gwakwara Jeremaya onye amụma, sị: “Ị chọrọ ịgbakwuru ndị Kaldia.” 14  Ma Jeremaya sịrị: “Ọ bụghị eziokwu. Anaghị m agbakwuru ndị Kaldia.” Ma, Iraịja egeghị ya ntị. Kama, ọ kpụụrụ Jeremaya kpụgara ndị isi. 15  Ndị isi ahụ wesokwara Jeremaya iwe,+ tie ya ihe, ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ,+ n’ụlọ Jehonatan bụ́ odeakwụkwọ, ebe e jizi mere ụlọ mkpọrọ. 16  A tụbara Jeremaya n’otu n’ime ọnụ ụlọ ndị dị n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ala. Ọ nọtekwara aka ebe ahụ. 17  Eze Zedekaya mechara zie ozi, a kpọtara ya Jeremaya, ya ajụọ ya ajụjụ n’ụlọ* ya na nzuzo.+ Ọ jụrụ ya, sị: “Ò nwere ihe Jehova kwuru?” Jeremaya asị ya: “O nwere. A ga-enyefe gị n’aka eze Babịlọn.”+ 18  Jeremaya gwakwara Eze Zedekaya, sị: “Olee ihe ọjọọ m mere gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo a, nke mere unu ji tụba m n’ụlọ mkpọrọ? 19  Oleezi ebe ndị amụma unu nọ, ndị buuru unu amụma, sị, ‘Eze Babịlọn agaghị alụso unu na ndị obodo a agha’?+ 20  Ugbu a, onyenwe m eze, biko, gee ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m na-arịọ. Akpọghachila m n’ụlọ Jehonatan+ bụ́ odeakwụkwọ, ka m ghara ịnwụ ebe ahụ.”+ 21  N’ihi ya, Eze Zedekaya kwuziri ka a tụba Jeremaya n’ụlọ mkpọrọ dị n’Ogige Ndị Nche.+ A na-esikwa n’okporo ámá ndị na-eme achịcha+ ewetara ya otu ogbe achịcha kwa ụbọchị, ruo mgbe achịcha gwụrụ n’obodo ahụ.+ Jeremaya nọgidekwara n’Ogige Ndị Nche ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
A na-akpọkwa ya Jehoyakin na Jekonaya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “n’obí.”