Jeremaya 39:1-18

  • A kwaturu mgbidi Jeruselem (1-10)

    • Zedekaya gbara ọsọ, e jide ya (4-7)

  • A hapụrụ Jeremaya ebe a ga na-elekọta ya (11-14)

  • E gbughị Ibed-melek (15-18)

39  N’ọnwa iri n’afọ nke itoolu n’ọchịchị Zedekaya bụ́ eze Juda, Nebukadneza* eze Babịlọn na ndị agha ya niile bịara Jeruselem ma nọchibido ya.+  N’abalị itoolu n’ọnwa anọ n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya, a kwaturu mgbidi Jeruselem.+  Ndị niile eze Babịlọn mere ndị isi banyere n’obodo ahụ nọdụ ala n’Ọnụ Ụzọ Ámá Etiti.+ Ndị isi ahụ bụ, Negal-shariza bụ́ Samga,* Nibo-sasekim bụ́ Rabsaris,* Negal-shariza bụ́ Rabmag,* na ndị ọzọ niile eze Babịlọn mere ndị isi.  Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha niile hụrụ ha, ha si ụzọ e si aga n’ubi eze gbaa ọsọ+ n’abalị. Ha si n’ọnụ ụzọ ámá a rụnyere n’agbata mgbidi abụọ gbapụ, tinye isi n’ụzọ gara Araba.+  Ndị agha Kaldia chụwara ha, chụkwutekwa Zedekaya n’ọzara Jeriko.+ Ha kpụụrụ ya kpụgara Nebukadneza* eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla+ dị na Hemat.+ Ebe ahụ ka ọ nọ kpee ya ikpe.  Eze Babịlọn nọkwa na Ribla gbuo ụmụ Zedekaya n’ihu ya. O gbukwara ndị Juda niile a ma ama.+  Ọ rụkpọsịrị Zedekaya anya, tụọkwa ya ịga e ji ọla kọpa mee, ka a kpụga ya Babịlọn.+  Ndị Kaldia gbaziri ụlọ* eze na ụlọ ndị mmadụ ọkụ,+ kwatuokwa mgbidi Jeruselem.+  Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche dọọrọ ndị fọdụrụ n’obodo ahụ n’agha laa Babịlọn, dọrọ ndị chịliiri ya aka elu ma na-akwadozi ya, dọrọkwa ndị ọzọ fọrọ ebe ahụ. 10  Ma Nebuzaradan onyeisi ndị nche hapụrụ ụfọdụ n’ime ha na Juda. Ndị ahụ ọ hapụrụ bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị na-enweghị ihe ọ bụla. N’ụbọchị ahụ, o nyere ha ubi vaịn na ebe ndị ha ga na-arụ ọrụ.*+ 11  Nebukadneza* eze Babịlọn gwara Nebuzaradan, bụ́ onyeisi ndị nche, ihe ọ ga-emere Jeremaya. Ọ gwara ya, sị: 12  “Gaa kpọrọ ya, lekọtakwa ya anya nke ọma. Emekwala ya ihe ọjọọ ọ bụla. Meere ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ gị.”+ 13  Nebuzaradan onyeisi ndị nche na Nebushazban bụ́ Rabsaris,* na Negal-shariza bụ́ Rabmag* nakwa ndị nwoke niile a ma ama n’ọchịchị eze Babịlọn wee zie ozi, 14  a kpọpụta Jeremaya n’Ogige Ndị Nche,+ nyefee ya n’aka Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ ka ọ kpọrọ ya laa n’ụlọ ya. Otú a ka Jeremaya si biri ebe ndị obodo ya bi. 15  N’oge ahụ a kpọchiri Jeremaya n’Ogige Ndị Nche,+ Jehova gwara ya, sị: 16  “Gaa gwa Ibed-melek+ onye Etiopia, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-eme ka ihe m kwuru gbasara obodo a mezuo. Ọdachi ga-adakwasị ya. Ihe ọma agaghị eme na ya. Ị ga-ahụkwa ya n’ụbọchị ọ ga-eme.”’ 17  “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-anapụta gị n’ụbọchị ahụ. A gaghịkwa enyefe gị n’aka ndị ị na-atụ egwu.’ 18  “Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-anapụtarịrị gị. A gaghị egbu gị.*+* ga-adịrị ndụ na-aga, ya abụrụ ihe ị kwatara, n’ihi na ị tụkwasịrị m obi.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Samga nwere ike ịbụ aha a na-etu mmadụ, ma ihe ọ pụtara edochaghị anya.
N’Akwụkwọ Nsọ Hibru dị iche na nke e si sụgharịa amaokwu a, otú e si dee ya bụ, “Negal-shariza, Samga-nibo, Sasekim, Rabsaris.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-eme majik (onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu).”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “obí.”
O nwere ike ịbụ, “ọrụ ọ manyere ha ka ha na-arụ.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-eme majik (onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu).”
Ma ọ bụ “A gaghị eji mma agha gbuo gị.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi gị.”