Jeremaya 4:1-31

  • A ga-agọzi ndị Izrel ma ha chegharịa (1-4)

  • A ga-esi n’ebe ugwu mee ka e nwee ọdachi (5-18)

  • Obi na-egbu Jeremaya mgbu n’ihi ọdachi ga-adakwasị ndị obodo ya (19-31)

4  Jehova kwuru, sị, “Izrel, ọ bụrụ na ị lọghachi,Ọ bụrụ na ị lọghachikwute m,Ọ bụrụkwa na i wepụ arụsị gị dị iche iche na-asọ oyi n’ihu m,A gaghịzi enwe ihe na-achụgharị gị.+   Ọ bụrụkwa na ị na-ekwu eziokwu, na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume ma na-aṅụ iyi, sị,‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, ṅụọ iyi,’Mgbe ahụ, ọ* ga-agọzi mba dị iche iche. Ha ga-ejikwa ya na-anya isi.”+  N’ihi na Jehova gwara ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị: “Kọọnụ ihe n’ala unu na-akọbeghị ihe. Kwụsịkwanụ ịkụ mkpụrụ ebe ogwu dị.+   Ndị Juda na ndị bi na Jeruselem,Debenụ onwe unu ọcha n’anya mụnwa bụ́ Jehova,Debekwanụ obi unu ọcha,*+Ka iwe m ghara ịdị ọkụMa ree unu, n’enweghị onye ga-emenyụ ya,N’ihi àgwà ọjọọ unu.”+   Kọsaanụ ihe a na Juda, kwusaakwanụ ya na Jeruselem. Tienụ mkpu, fụọkwanụ opi n’ala a niile.+ Tienụ ezigbo mkpu, sị: “Zukọtanụ,Ka anyị gbaga n’obodo ndị a rụsiri ike.+   Gwunyenụ ihe ga-egosi ụzọ e si aga Zayọn. Chọtanụ ebe unu ga-agbaba. Unu eguzola otu ebe,”N’ihi na m ga-esi n’ebe ugwu mee ka e nwee ọdachi,+ nke ga-ebibi ọtụtụ ihe.   Onye na-ebibi mba dị iche iche apụtala+Dị ka ọdụm si n’ọhịa ọ nọ pụta.+ O sila n’obodo ya pụta ka o mee ka ala gị bụrụ ihe na-awụ akpata oyi. Obodo gị niile ga-aghọ ikpo nkume. E nweghịkwa onye ga-ebi na ha.+   N’ihi ya, yirinụ ákwà iru uju,+Ruwenụ uju,* bewekwanụ ákwá,N’ihi na ezigbo iwe Jehova na-ewesa anyị adajụbeghị.   Jehova kwuru, sị,“N’ụbọchị ahụ, obi ga-awụnye eze na ndị isi n’afọ.+ Ụjọ ga-atụ ndị nchụàjà, ihe na-emenụ ejukwa ndị amụma anya.”+ 10  M kwuziri, sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! N’eziokwu, ị ghọgbuola ndị Juda na ndị bi na Jeruselem.+ Ọ fọrọ obere ka e jiri mma agha gbuo anyị,* ma, ị na-agwa anyị, sị, ‘Udo ga-adịrị unu.’”+ 11  N’oge ahụ, a ga-agwa ndị Juda, gwakwa ndị bi na Jeruselem, sị: “E nwere ifufe na-ekpo ọkụ nke si n’ugwu ndị dị n’ọzaraFere na-aga ebe ndị m* nọ. O feghị na-abịa ka ọ fụchaa ihe ma ọ bụ ka o mee ka ihe dị ọcha. 12  Ọ bụ m mere ka ifufe ahụ nke na-efesi ike si ebe ndị ahụ fere na-abịa. Ugbu a, m ga-agwa ndị m ihe m kpebiri ime ha. 13  Ndị iro unu ga-abịa otú mmiri rujuru n’ígwé si ebido izo. Ụgbọ ịnyịnya ha dịkwa ka oké ifufe.+ Ịnyịnya ha na-efe ọsọ karịa ugo.+ Anyị efuola, n’ihi na a ga-ebibi anyị! 14  Jeruselem, sachapụ ihe ọjọọ n’obi gị, ka a zọpụta gị.+ Olee mgbe ị ga-akwụsị ịna-eche ihe ọjọọ n’obi gị? 15  E nwere onye na-akọ gbasara ọdachi ga-eme na Dan,+Na-akọkwa gbasara ọdachi ga-eme n’Ifrem. 16  Gwanụ mba dị iche iche gbasara ya. Kọsaanụ ya na Jeruselem.” “Ndị nche* si n’ala dị anya na-abịa. Ha ga-etikwa mkpu agha iji lụso obodo ndị dị na Juda agha. 17  Ha agbaala Jeruselem gburugburu otú ndị na-eche ubi nche si agba ubi ha na-eche nche gburugburu,+N’ihi na ndị bi na ya enupụrụla m isi.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 18  “A ga-ata gị ahụhụ maka otú i si akpa àgwà na ihe ndị ị na-eme.+ Ọdachi nke ga-adakwasị gị ga-adị egwu,N’ihi na isi ị na-enupụrụ m si gị n’ala ala obi.” 19  Efuola m.* Efuola m! Obi na-egbusi m mgbu ike. Obi na-akụ m kpum kpum. Enweghị m ike ịgbachi nkịtị,N’ihi na anụla m* ụda opi,Ya bụ, ụda opi agha.*+ 20  A na-akọ akụkọ ọdachi ndị na-eme, otu mechaa, ibe ya esochie,N’ihi na e bibiela ala a niile. E bibiela ụlọikwuu m na mberede. E bibiekwala ákwà ụlọikwuu m n’otu ntabi anya.+ 21  Olee mgbe m ga-akwụsị ịhụ ihe na-egosi ụzọ e si aga Zayọn,Kwụsịkwa ịnụ ụda opi?+ 22  “N’ihi na ndị m dị nzuzu.+ Ha amaghị m. Ha bụ ụmụ na-amaghị ihe. Ha anaghịkwa aghọta ihe. Ụbụrụ na-aghọ ha nkọ* ma a bịa n’ime ihe ọjọọ,Ma, ha amaghị otú e si eme ihe ọma.” 23  Mgbe m lere anya n’ala ha, ọ tọgbọ chakoo, bụrụkwa ebe e bibiri ebibi.+ Mgbe m lekwara anya n’eluigwe, ìhè ya adịghịzi.+ 24  Mgbe m lere anya n’ugwu dị iche iche, ha nọ na-ama jijiji. Ugwu nta dị iche iche nọkwa na-ama jijiji.+ 25  Elere m anya, ma, e nweghị onye m hụrụ. Nnụnụ niile efepụchaakwala.+ 26  Ahụkwara m na ebe a kụrụ mkpụrụ osisi aghọọla ala ịkpa. E bibiekwala obodo ndị dị n’ala a.+ Ọ bụ Jehova bibiri haN’ihi ezigbo iwe ji ya. 27  Jehova kwuru, sị: “Ala ahụ niile ga-aghọ ikpo nkume,+Ma agaghị m ebibi ya kpamkpam. 28  N’ihi ya, ala ahụ ga-eru uju.+ Eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.+ Ọ bụ n’ihi na ekwuola m ya. Ekpebiela m ya. Agaghị m agbanwe obi m.* Agaghịkwa m ahapụ ime ya.+ 29  Ndị obodo ahụ niile na-agba ọsọ+N’ihi mkpọtụ ndị na-agba ịnyịnya na ndị na-agba ụta na-eme. Ha na-agbaba n’ọhịa dị iche iche,Ha na-agbagokwa n’elu nnukwu nkume dị iche iche.+ Ha agbapụla n’obodo niile. E nweghịkwa onye bi na ha.” 30  Ugbu a e bibiri ihe niile i nwere, gịnị ka ị ga-eme? Ị na-eyibu ákwà dị oké ọnụ. Ị na-ejibu ihe e ji achọ mma e ji ọlaedo mee achọ onwe gị mma. Ị na-etebu uri anya ka anya gị maa ezigbo mma. Ma, ọ bụ n’efu ka ị nọ na-achọ onwe gị mma,+N’ihi na ndị ọ na-agụ agụụ ka gị na ha kwaa iko ajụla gị. Ha na-achọzi igbu gị.*+ 31  N’ihi na m nụrụ olu yiri nke nwaanyị ahụ́ na-egbu mgbu,Ya bụ, mkpu ákwá nke na-ada ka nke nwaanyị na-amụ nwa mbụ ya. Ọ bụ olu Zayọn,* onye ọ na-esiri ike ikute ume. Ọ gbasara ọbụ aka ya, na-asị:+ “Efuola m, maka na ike agwụla m* n’ihi ndị na-egbu mmadụ!”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Jehova.
Na Hibru, “Bienụ onwe unu úgwù maka Jehova, biekwanụ obi unu úgwù.”
Ma ọ bụ “Tiwenụ aka n’obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”
Ya bụ, ndị na-eleru obodo anya ka ha mara mgbe ha ga-aga lụso ya agha.
Na Hibru, “Eriri afọ m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m anụla.”
O nwere ike ịbụ, “ndị na-eti mkpu agha.”
Ma ọ bụ “Ha ma ihe.”
Ma ọ bụ “akwa mmakwaara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”