Jeremaya 40:1-16

  • Nebuzaradan hapụrụ Jeremaya (1-6)

  • E mere Gedalaya onyeisi ala (7-12)

  • A kpara nkata igbu Gedalaya (13-16)

40  Jehova gwara Jeremaya okwu mgbe Nebuzaradan+ bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ Jeremaya na Rema ka ọ lawa.+ N’oge ahụ, Jeremaya so ná ndị bi na Jeruselem nakwa na Juda a dọọrọ n’agha na-ala Babịlọn, a tụkwara ya ịga.  Onyeisi ndị nche ahụ kpọkwaara Jeremaya, sị ya: “Ọ bụ Jehova Chineke gị kwuru na ọdachi a ga-adakwasị obodo a.  Jehova emezuola ihe o kwuru, n’ihi na unu mehiere Jehova. Unu emeghịkwa ihe o kwuru. Ọ bụ ya mere ihe a ji na-eme unu.+  M na-atọpụ gị ịga a tụrụ gị n’aka taa. Ọ bụrụ na ị chọrọ iso m laa Babịlọn, bịa soro m. M ga na-elekọtakwa gị. Ma ọ bụrụ na ị chọghị iso m, nsogbu adịghị. Lekwa obodo a niile, i nwere ike ịga ebe ọ bụla masịrị gị.”+  Ma tupu Jeremaya ekpebie ma ọ̀ ga-alaghachi, Nebuzaradan sịrị ya: “Laghachikwuru Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ onye eze Babịlọn mere onyeisi obodo ndị dị na Juda. Gị na ya biri n’obodo unu. Ma ọ bụkwanụ, gị agawa ebe ọ bụla ọzọ dị gị mma.” Onyeisi ndị nche ahụ nyekwara ya nri ọ ga na-eri, nyekwa ya onyinye ma hapụ ya ka ọ lawa.  Jeremaya wee gakwuru Gedalaya nwa Ahaịkam ebe ọ nọ na Mizpa,+ ya na ya na ndị fọrọ ebe ahụ ebiri na Juda.  Ka oge na-aga, ndị ọchịagha niile nọ n’obodo ahụ na ndị agha ha nụrụ na eze Babịlọn emeela Gedalaya nwa Ahaịkam onyeisi ala ha nakwa na o meela ya onyeisi ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nakwa ụmụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha nọ n’obodo ahụ, bụ́ ndị a na-adọrọghị n’agha laa Babịlọn.+  Ha wee bịakwute Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa.+ Ndị bịakwutere ya bụ: Ishmel+ nwa Netanaya, Johenan+ na Jonatan bụ́ ụmụ Kariya, Seraya nwa Tanhumet, ụmụ Ifaị onye Netofa, na Jezanaya+ nwa onye Meakat, ha na ndị agha ha.  Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan ṅụkwaara ha na ndị agha ha iyi, sị: “Unu atụla egwu ijere ndị Kaldia ozi. Birinụ n’ala a jewere eze Babịlọn ozi. Ihe ga-agazikwara unu.+ 10  Mụnwa ga-ebi na Mizpa ebe a na-anọchite anya unu mgbe ọ bụla ndị Kaldia bịara ịhụ anyị. Ma, na-ebukọtanụ mmanya, mkpụrụ osisi dị iche iche na mmanụ. Hapụkwanụ ha n’ime ite unu na-eji echekwa ihe. Birikwanụ n’obodo ndị unu weghaara.”+ 11  Ndị Juu niile nọ na Moab, Amọn, na Ịdọm nakwa ndị nke nọ n’obodo ndị ọzọ niile nụkwara na e nwere ndị eze Babịlọn hapụrụ ka ha biri na Juda nakwa na o mere Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan onyeisi ha. 12  N’ihi ya, ha niile si n’ebe niile a chụsasịrị ha na-alọta. Ha batara na Juda, gakwurukwa Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa. Ha bukọtakwara mmanya na mkpụrụ osisi hiri ezigbo nne. 13  Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile nọ n’obodo ahụ bịakwutere Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa. 14  Ha wee sị ya: “Ị̀ ma na Bealis, bụ́ eze ụmụ Amọn,+ zitere Ishmel nwa Netanaya ka o gbuo gị?”*+ Ma Gedalaya nwa Ahaịkam ekwetaghị ihe a ha kwuru. 15  Johenan nwa Kariya nọkwa na Mizpa gwa Gedalaya na nzuzo, sị: “Achọrọ m ịga gbuo Ishmel nwa Netanaya. E nweghị onye ga-ama ma m gbuo ya. Gịnị mere ọ ga-eji gbuo gị?* Gịnịkwa mere ndị Juda niile bụ́ ndị na-alọghachikwute gị ga-eji gbasasịa, ndị fọrọ na Juda alaakwa n’iyi?” 16  Ma Gedalaya+ nwa Ahaịkam gwara Johenan nwa Kariya, sị: “Emela ihe a i kwuru. Ị na-aghagide Ishmel ụgha.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”