Jeremaya 41:1-18

  • Ishmel gburu Gedalaya (1-10)

  • Johenan chụụrụ Ishmel gawa (11-18)

41  N’ọnwa nke asaa, Ishmel+ nwa Netanaya nwa Elishama, onye si n’ezinụlọ eze, onye bụ́kwa otu n’ime ndị isi na-ejere eze ozi, du mmadụ iri ọzọ bịakwute Gedalaya nwa Ahaịkam ebe ọ nọ na Mizpa.+ Ka ha nọ na-eri nri na Mizpa,  Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ahụ ya na ha so biliri jiri mma agha gbuo Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan. Otú a ka ha si gbuo onye eze Babịlọn mere onyeisi ala.  Ishmel gbukwara ndị Juu niile ha na Gedalaya nọ na Mizpa, gbuokwa ndị agha Kaldia nọ ebe ahụ.  N’ụbọchị nke abụọ mgbe e gbuchara Gedalaya, tupu onye ọ bụla amata na e gbuola ya,  e nwere ụmụ nwoke iri asatọ si Shikem,+ Shaịlo,+ na Sameria+ bịa ebe ahụ. Ha kpụchara afụ ọnụ ha, dọwaa uwe mwụda ha,+ bekasịakwa onwe ha ahụ́. Ha jikwa àjà ọka na frankinsens+ bịa n’ụlọ Jehova.  Ishmel nwa Netanaya wee si na Mizpa bere ákwá gawa ịhụ ha. Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha: “Bịanụ ka unu hụ Gedalaya nwa Ahaịkam.”  Ma mgbe ha batara n’ime obodo ahụ, Ishmel nwa Netanaya na ndị agha ya gburu ha, tụba ha n’olulu mmiri.  Ma, e nwere ụmụ nwoke iri n’ime ha ndị gwara Ishmel, sị: “Egbula anyị, n’ihi na e nwere ọka wit, ọka bali, mmanụ, na mmanụ aṅụ anyị zoro n’ọhịa.” N’ihi ihe a ha kwuru, o gbughị ha otú o gburu ụmụnne ha.  Olulu mmiri ahụ Ishmel tụbara ozu ndị ahụ niile o gburu bụ nnukwu olulu. Ọ bụ nke ahụ Eze Esa gwuru oge ọ na-alụso Beasha eze Izrel agha.+ Ọ bụ olulu mmiri a ka Ishmel nwa Netanaya tụjuru ozu ndị ahụ o gburu. 10  Ishmel dọọrọ ndị niile fọrọ na Mizpa n’agha,+ ma ụmụ nwaanyị eze mụrụ ma ndị ọzọ niile fọrọ na Mizpa, ndị Nebuzaradan bụ́ onyeisi ndị nche nyefere n’aka Gedalaya+ nwa Ahaịkam ka o lekọtawa. Ishmel nwa Netanaya dọọrọ ha n’agha gawa ka ọ gakwuru ndị Amọn.+ 11  Mgbe Johenan+ nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ya na ha nọ nụrụ arụ niile Ishmel nwa Netanaya kpara, 12  ha kpọọrọ ụmụ nwoke niile nọ ebe ahụ gawa ịlụso Ishmel nwa Netanaya agha. Ha hụkwara ya n’ebe e nwere nnukwu mmiri* na Gibiọn. 13  Mgbe ndị ahụ niile Ishmel dọọrọ n’agha hụrụ Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ya na ha so, ha ṅụrịwara ọṅụ. 14  Ndị niile ahụ Ishmel dọọrọ n’agha na Mizpa+ hapụkwara ya ma gakwuru Johenan nwa Kariya. 15  Ma Ishmel nwa Netanaya na ụmụ nwoke asatọ n’ime ndị ya na ha so gbanahụrụ Johenan, gbakwuru ndị Amọn. 16  Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ ya na ha nọ kpọọrọ ndị ọzọ niile si Mizpa, bụ́ ndị ha napụtara n’aka Ishmel nwa Netanaya mgbe o gbuchara Gedalaya+ nwa Ahaịkam. Ha kpọghachiri ha Gibiọn, ma ndị dimkpa ma ndị agha ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị ma ndị na-eje ozi n’obí eze. 17  Ha gakwara nọrọ n’ụlọ Kimham nke dị n’akụkụ Betlehem.+ Ha bu n’obi isi ebe ahụ banye Ijipt,+ 18  n’ihi na egwu tụwara ha maka ndị Kaldia, ebe ọ bụ na Ishmel nwa Netanaya gburu Gedalaya nwa Ahaịkam, onye eze Babịlọn mere onyeisi ala ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “nnukwu ọdọ mmiri.”