Jeremaya 42:1-22

  • Ndị Juu gwara Jeremaya ka ọ rịọ Chineke ka ọ gwa ha ihe ha ga-eme (1-6)

  • Jehova gwara ha, sị: “Unu agala Ijipt” (7-22)

42  Ndị ọchịagha niile ahụ na Johenan+ nwa Kariya na Jezanaya nwa Hoshaya na ndị ọzọ niile, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, bịara  gwa Jeremaya onye amụma, sị: “Biko, nụrụ arịrịọ anyị na-arịọ ka i kpee ekpere gwa Jehova bụ́ Chineke gị ka o nyere anyị niile fọrọnụ aka. N’ihi na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime anyị fọrọ,+ otú i ji anya gị na-ahụ.  Ka Jehova bụ́ Chineke gị gwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà na ihe anyị kwesịrị ịna-eme.”  Jeremaya onye amụma wee sị ha: “Anụla m ihe unu kwuru. M ga-arịọ Jehova bụ́ Chineke unu ihe niile unu gwara m rịọ ya. M ga-agwakwa unu ihe ọ bụla Jehova sị m gwa unu. E nweghị nke ọ bụla n’ihe niile ọ ga-ekwu m ga-ahapụ ịgwa unu.”  Ha wee sị Jeremaya: “Ọ bụrụ na anyị emeghị kpọmkwem ihe Jehova bụ́ Chineke gị ziri gị ka i zie anyị, ka Jehova bụrụ onye akaebe e kwesịrị ịtụkwasị obi, ka ọ taakwa anyị ahụhụ.  Ma, ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru ọ̀ dị anyị mma ma ọ́ dịghị anyị mma, anyị ga-eme ya, ka ihe wee gaziere anyị n’ihi na anyị mere ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru, onye anyị na-ezi gị ka ị gakwuru.”  Mgbe ụbọchị iri gachara, Jehova gwara Jeremaya okwu.  N’ihi ya, ọ kpọkọrọ mmadụ niile, ma Johenan nwa Kariya ma ndị ọchịagha niile ya na ha nọ, ma onye ukwu ma onye nta.+  Ọ gwara ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye unu ziri m ka m gwa arịrịọ unu na-arịọ ka o meere unu amara, kwuru, sị: 10  ‘Ọ bụrụ na unu ebiri n’ala a, m ga-arụlite unu ka ụlọ. Agaghị m etida unu. M ga-akụkwa unu ka mkpụrụ. Agaghị m efopụ unu, n’ihi na m ga-agbanwe obi m gbasara ọdachi m mere ka ọ dakwasị unu.+ 11  Unu atụla egwu n’ihi eze Babịlọn, bụ́ onye unu na-atụ egwu.’+ “Jehova kwuru, sị, ‘Unu atụla eze Babịlọn egwu, n’ihi na m nọnyeere unu. M ga-azọpụta unu, napụtakwa unu n’aka ya. 12  M ga-emere unu ebere.+ Ọ ga-emekwara unu ebere, meekwa ka unu laghachi n’ala unu. 13  “‘Ma ọ bụrụ na unu asị: “Mba, anyị agaghị ebi n’ala a,” ọ bụrụkwa na unu aghara ime ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru, 14  ma na-asị: “Mba, kama anyị ga-aga Ijipt biri,+ ebe anyị na-agaghị ahụ agha, ebe anyị na-agaghịkwa anụ ụda opi e ji akpọkọta ndị agha, ebe agụụ na-agaghịkwa agụ anyị, ebe ahụ ka anyị ga-ebi,” 15  ununwa bụ́ ndị Juda fọrọnụ, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu esie ọnwụ na unu ga-aga Ijipt, ọ bụrụkwa na unu agaa biri na ya,* 16  ndị iro unu ga-eji mma agha unu na-atụ ụjọ ya bịa lụso unu agha n’Ijipt. Ụnwụ unu na-atụ ụjọ ya ga-eso unu n’azụ banye Ijipt. Unu ga-anwụkwa ebe ahụ.+ 17  Mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị niile siri ọnwụ na ha ga-aga biri n’Ijipt. E nweghị onye n’ime ha ga-agbanahụ ọdachi m ga-eme ka ọ dakwasị ha. E nweghịkwa onye nke ọ na-agaghị egbu.”’ 18  “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu agaa Ijipt, m ga-eji iwe na ọnụma mee unu ihe otú m mere ndị bi na Jeruselem.+ Ihe m ga-eme unu ga-eme ka ụjọ tụwa ndị ọzọ. A ga-ejizi unu na-abụ mmadụ ọnụ. A ga na-eleda unu anya, na-akwakwa unu emo.+ Unu agaghịkwa ahụ ebe a anya ọzọ.’ 19  “Ndị fọrọ na Juda, Jehova agwala unu okwu. Unu agala Ijipt. Unu mara taa na mụ adọọla unu aka ná ntị 20  na mmehie unu ga-akpatara unu* ọnwụ. N’ihi na unu ziri m ka m gakwuru Jehova bụ́ Chineke unu. Unu sịrị, ‘Gwara anyị Jehova bụ́ Chineke anyị okwu n’ekpere, gwakwa anyị ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru. Anyị ga-eme ya.’+ 21  M na-agwakwa unu ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru taa, ma unu agaghị ege ya ntị. Unu agaghịkwa eme ihe ọ bụla o ziri m ka m zie unu.+ 22  N’ihi ya, maranụ na mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu unu ebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “unu agaa bitụ ebe ahụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”