Jeremaya 43:1-13

  • Ndị Juu nupụrụ isi gawa Ijipt (1-7)

  • Jehova gwara Jeremaya okwu n’Ijipt (8-13)

43  Jeremayagwara mmadụ niile ahụ ihe Jehova bụ́ Chineke ha gwara ya ka ọ gwa ha. O nweghị nke ọ na-agwaghị ha. Mgbe ọ gwachara ha ihe Jehova bụ́ Chineke ha kwuru,  Azaraya nwa Hoshaya, Johenan+ nwa Kariya, na ụmụ nwoke niile onwe ha na-ebu isi sịrị Jeremaya: “Ọ bụ ụgha ka ị na-agha. Jehova bụ́ Chineke anyị agwaghị gị ka ị gwa anyị ka anyị ghara ịga biri n’Ijipt.  Kama, ọ bụ Barọk+ nwa Neraya na-aranye gị ikwu ihe ị na-ekwu n’ihi na ọ chọrọ ka ndị Kaldia kpara anyị aka, ka ha wee gbuo anyị ma ọ bụkwanụ dọrọ anyị n’agha laa Babịlọn.”+  Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile nakwa ndị ahụ niile erubereghị Jehova isi. Ha jụrụ ịnọrọ na Juda.  Kama ịnọrọ na Juda, Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ kpọọrọ ndị Juda niile fọdụrụ gbapụ. Ndị a ha kpọọrọ bụ ndị si ná mba niile a chụsasịrị ha lọta ka ha biri na Juda.+  Ha kpọọrọ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, ụmụntakịrị, ụmụ nwaanyị eze mụrụ, nakwa onye* ọ bụla Nebuzaradan+ bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ ka ya na Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan+ nọrọ. Ha kpọkwaara ma Jeremaya onye amụma ma Barọk nwa Neraya.  Ha kpọ ha bata Ijipt, si otú a nupụrụ Jehova isi. Ha gagidere ruo Tapanhis.+  Ka ha ruru Tapanhis, Jehova gwara Jeremaya, sị:  “Buru nkume ndị buru ibu, nọrọ n’ihu ndị Juu zoo ha n’ụrọ dị n’ebe e doro brik, n’ebe e si abanye n’ụlọ Fero dị na Tapanhis. 10  I zochaa ya, gwazie ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-akpọ Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ ohu m.+ M ga-adọsa ocheeze ya n’elu nkume ndị a m zoro. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya n’elu ha.+ 11  Ọ ga-abịakwa lụso ndị Ijipt agha.+ Ọrịa ga-egbu ụfọdụ n’ime unu. A ga-adọrọ ụfọdụ n’ime unu n’agha. A ga-ejikwa mma agha gbuo ụfọdụ n’ime unu.+ 12  M ga-amụnye ụlọ dị iche iche a na-anọ efe chi ndị Ijipt ọkụ.+ Eze ahụ ga-agbakwa ụlọ ndị ahụ ọkụ ma buru chi ndị ahụ laa. Otú ahụ ọ na-adịrị onye ọzụzụ atụrụ mfe iyiri uwe mwụda ya, ka ọ ga-adịrị ya mfe imeri ndị Ijipt niile. Ọ ga-esikwa n’Ijipt laa n’udo.* 13  Ọ ga-akụrisị ogidi niile dị na Bet-shimesh,* nke dị n’Ijipt. Ọ ga-agbakwa ụlọ dị iche iche a na-anọ efe chi ndị Ijipt ọkụ.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “Ọkọ agaghị akọ ya ya esi n’Ijipt laa.”
Ma ọ bụ “Ụlọ Chi Anyanwụ,” ya bụ, Heliopolis.