Jeremaya 46:1-28

  • E buru amụma ihe ga-eme Ijipt (1-26)

    • Nebukadneza ga-emeri Ijipt (13, 26)

  • Nkwa ndị e kwere ndị Izrel (27, 28)

46  E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya onye amụma banyere mba dị iche iche.+  Ihe a ka o kwuru gbasara Ijipt,+ ya bụ, gbasara ndị agha Fero+ Niko bụ́ eze Ijipt, onye Nebukadneza* eze Babịlọn meriri na Kakemish, n’akụkụ Osimiri Yufretis, n’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda:   “Hazienụ obere ọta unu na ọta ukwu unu. Pụtakwanụ maka ịlụ agha.   Ndị na-agba ịnyịnya, kwadebenụ ịnyịnya unu, nọrọkwanụ n’elu ha. Kpurunụ okpu agha unu ma jikere ịlụ agha. Meenụ ka ube unu na-egbu maramara, yirikwanụ uwe agha.   Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere m ji ahụ ka ezigbo ụjọ ji ha? Ha na-alaghachi azụ, a na-emerikwa ndị dike ha. Ha agbaala ọsọ n’ihi ụjọ, ndị dike ha anaghịkwa ele anya n’azụ. Ụjọ jikwa mmadụ niile.   Ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị agbapụli. Ndị dike agaghịkwa erili mbọmbọ. Ike agwụla ha. Ha adaakwala n’ebe ugwu,N’akụkụ Osimiri Yufretis.’+   Ònye bụ onye a nke na-eto ka Osimiri Naịl,Na-etokwa ka osimiri ndị mmiri ha na-amali elu?   Ijipt na-eto ka Osimiri Naịl+Nakwa ka osimiri mmiri ya na-amali elu. Ọ na-asị, ‘M ga-eto kpuchie ụwa. M ga-ebibi obodo na ndị bi na ya.’   Ịnyịnya dị iche iche, gbagoonụ. Ụgbọ ịnyịnya dị iche iche, gbawanụ ara ara. Ka ndị dike n’agha pụta. Ka ndị Kush na ndị Pọt, bụ́ ndị na-eji ọta, pụtakwa.+ Ka ndị Ludim,+ bụ́ ndị na-ekwe ụta ma na-agba ya,+ pụtakwa. 10  “Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha. Ọ bụ ụbọchị ọ ga-egbu ndị iro ya n’ihi ihe ha mere. Mma agha ga-eri ha rijuo afọ, ṅụjuokwa ọbara ha afọ, n’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, weere ozu ndị a ka àjà a chụụrụ ya n’ebe ugwu, n’akụkụ Osimiri Yufretis.+ 11  Ndị Ijipt,* gaanụ Gilied nweta mmanụ balsam.+ Ọtụtụ ihe ndị unu nwetaraIji gwọọ onwe unu ọrịa abaghị uru,N’ihi na unu enweghị ngwọta.+ 12  Mba dị iche iche anụla otú e si menye unu ihere.+ A na-anụkwa mkpu unu na-eti n’obodo a niile. Otu dike na-adagide dike ọzọ. Ha abụọ na-adarukwa ala.” 13  Jehova gwara Jeremaya onye amụma gbasara mgbe Nebukadneza* eze Babịlọn ga-abịa ịlụso ndị Ijipt agha.+ Ọ gwara ya, sị: 14  “Kọọnụ ya n’Ijipt, kwusaanụ ya na Migdọl.+ Kwusaakwanụ ya na Nọf* nakwa na Tapanhis.+ Sịnụ, ‘Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, jikerekwanụ,N’ihi na a ga-eji mma agha gbuo ndị niile gbara unu gburugburu. 15  Gịnị mere e ji kpochapụ ndị agha unu dị ike? Ha enweghị ike ịkwụrụ n’ụkwụ ha,N’ihi na Jehova akwatuola ha. 16  Ha na-akpọ ụkwụ n’ihe, na-adakwa n’ìgwè n’ìgwè. Ha na-agwakwa ibe ha, sị: “Bilienụ, ka anyị laghachikwuru ndị obodo anyị na ndị ikwu anyịN’ihi mma agha e ji na-egbu anyị n’eleghị anya n’azụ.”’ 17  Ndị agha unu ahụ dị ike kwusara ebe ahụ, sị,‘Ọ bụ naanị mkpọtụ ka Fero eze Ijipt na-eme. Ọ hapụla ohere* ọ gaara eji mee ihe, ya agafee.’+ 18  Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, ọ* ga-abata, dịrị otú ugwu Tebọ+ dị n’etiti ugwu ndị ọzọ,Dịrịkwa otú ugwu Kamel+ dị n’akụkụ oké osimiri. 19  Ndị bi n’Ijipt,Kwakọtanụ ngwongwo unu ga-ebu mgbe a ga-adọrọ unu n’agha. N’ihi na Nọf* ga-aghọ ihe na-awụ akpata oyi. A ga-agba ya ọkụ.* E nweghịkwa onye ga-ebi na ya.+ 20  Ijipt yiri nwa ehi ahụ́ dị mma. Ma, anwụnta ga-esi n’ebe ugwu bịa taa ya. 21  Ndị agha o goro ọrụ, bụ́ ndị nọ n’ime ya, yikwara ụmụ ehi gbara agba. Ma ha niile atụgharịala gbaa ọsọ. Ha enwelighị ike ịkwụrụ n’ụkwụ ha,+N’ihi na ọdachi adakwasịla haN’oge m na-ekpe ha ikpe.’ 22  ‘Ọ na-eti mkpu, olu ya ana-ada ka agwọ na-agba ọsọ,N’ihi na ha ji anyụike bịakwute ya n’ike,Dị ka ndị na-egbutu osisi.’* 23  Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga-asụ oké ọhịa ya, n’agbanyeghị na o yiri ebe a na-agaghị abanyeli abanye. Ha dị ọtụtụ karịa igurube. E nweghịkwa ike ịgụta ha ọnụ. 24  A ga-emenye ndị bi n’Ijipt* ihere. A ga-enyefe ha n’aka ndị si n’ebe ugwu.’+ 25  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị: ‘Ugbu a, m ga-ata Emọn+ bụ́ chi ndị Noo* ahụhụ,+ taakwa Fero, ndị Ijipt, chi ha dị iche iche,+ na ndị eze ha. M ga-ata Fero na ndị niile tụkwasịrị ya obi ahụhụ.’+ 26  “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enyefe ha n’aka ndị na-achọ igbu ha,* ya bụ, n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn+ na ndị na-ejere ya ozi. Ma, ndị mmadụ ga-emecha biri n’Ijipt otú ha bi ya n’oge gara aga.’+ 27  ‘Ma gịnwa bụ́ Jekọb ohu m, atụla egwu. Izrel, atụkwala ụjọ.+ N’ihi na m ga-esi ebe dị anya zọpụta gị,Zọpụtakwa ụmụ* gị n’ala a dọọrọ ha n’agha laa.+ Jekọb ga-alọta. Ahụ́ ga-erukwa ya ala. E nweghị ihe ga-enye ya nsogbu. E nweghịkwa onye ga-emenye ya ụjọ.’+ 28  Jehova kwuru, sị, ‘Jekọb ohu m, atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. M ga-ebibi mba niile m chụgara gị n’ala ha.+ Ma agaghị m ebibi gị.+ Kama, m ga-adọ gị aka ná ntị* otú kwesịrị ekwesị.+ M ga-atarịrị gị ahụhụ.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Ijipt.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “Memfis.”
Na Hibru, “oge a kara aka.”
Ya bụ, onye ga-emeri Ijipt.
Ma ọ bụ “Memfis.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ ga-abụ ala na-abaghị uru.”
Ma ọ bụ “ndị na-akpa nkụ.”
Na Hibru, “ada bụ́ Ijipt.”
Ya bụ, Tibs.
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “m ga-agbazi gị.”