Jeremaya 47:1-7

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Filistia (1-7)

47  Jehova gwara Jeremaya onye amụma okwu gbasara ndị Filistia+ tupu Fero emerie Gaza.  Jehova kwuru, sị: “Mmiri si n’ebe ugwu sọrọ na-abịa. Ọ ga-aghọ iyi tofere ókè. Ọ ga-erikpukwa ala a na ihe niile dị na ya,Rikpuokwa obodo a na ndị bi na ya. Ndị nwoke ga-ebe ákwá. Ndị niile bi n’ala a ga-ebekwa ákwá arịrị.   Mgbe ha ga-anụ ụda ụkwụ oké ịnyịnya onye iro,Nụkwa mkpọtụ ụgbọ ịnyịnya agha ya,Nakwa oké ụzụ nke ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ya na-eme,Ndị nna ga-agba ọsọ n’eleghị anya n’azụMaka na obi agaghị aka ha ịnapụta ụmụ ha.   Ụbọchị a ga-ebibi ndị Filistia niile eruwela.+ N’ụbọchị ahụ, a ga-ebibi onye ọ bụla fọdụrụ nke na-enyere Taya+ na Saịdọn+ aka. Jehova ga-ebibi ndị Filistia,Ya bụ, ndị fọdụrụ n’ime ndị si n’agwaetiti Kaftọ.*+   Isi ga-akwọcha* Gaza. E bibiela Ashkelọn.+ Ndị fọdụrụ na ndagwurugwu ha,Olee mgbe unu ga-akwụsị ịna-ebekasị onwe unu ahụ́?+   Ehee, mma agha Jehova,+Olee mgbe ị ga-anọ jii? Banye n’ọbọ gị. Zuru ike, nọrọkwa jii.   Olee otú ọ ga-esi nọrọ jiiEbe ọ bụ na Jehova agwala ya ihe ọ ga-eme? Ọ gwara ya ka ọ lụso Ashkelọn na ụsọ oké osimiri agha.+ Ebe ndị a ka ọ gwara ya gaa.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Krit.
Ya bụ, ha ga-akpụchasị isi ha n’ihi uju ha na-eru na ihere na-eme ha.