Jeremaya 48:1-47

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Moab (1-47)

48  Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru banyere Moab,+ sị: “Nibo+ ga-ata ahụhụ, n’ihi na e bibiela ya. E wegharala Kiriateyim,+ menyekwa ndị bi na ya ihere. E menyela ndị bi n’ebe a rụsiri ike ihere, meekwa ka ezigbo ụjọ jide ha.+   Ndị mmadụ anaghịzi eto Moab. Ndị iro nọ na Heshbọn+ kpaa nkata otú ha ga-esi bibie ya, na-asị: ‘Bịanụ ka anyị laa ya n’iyi ka ọ gharazie ịbụ mba.’ “Gịnwa kwa, Madmen, mechie ọnụ,N’ihi na mma agha na-eso gị n’azụ.   Mkpu ákwá na-ada na Họroneyim,+N’ihi otú e si na-ebibi ya ma na-ala ya n’iyi.   E bibiela Moab. Ụmụntakịrị ndị nọ na ya na-eti mkpu ákwá.   Ndị mmadụ beere ákwá na-agbago ụzọ e si aga Luhit. Ka ha sikwa Họroneyim na-agbada, ha nụrụ ka ndị mmadụ na-ebe ákwá n’ihi mkpamkpa ahụ kparanụ.+   Gbaanụ ọsọ. Gbapụnụ maka ndụ* unu. Unu ga-adịkwa ka osisi junipa dị n’ala ịkpa.   Ndị Moab, ebe ọ bụ na unu tụkwasịrị ọrụ unu na akụ̀ unu obi,A ga-eweghara obodo unu. A ga-adọrọkwa Kimọsh+Na ndị nchụàjà ya na ndị isi ndị na-efe ya n’agha.   Onye na-ebibi ihe ga-abịa n’obodo gị niile. E nweghị obodo nke ọ ga-ahapụ.+ Ndagwurugwu ga-ala n’iyi. A ga-alakwa ala dị larịị n’iyi otú Jehova kwuru.   Meerenụ Moab ihe e ji ahụwa ụzọ ama,N’ihi na ọ ga-abụzi ebe e bibiri ebibi, ndị bi na ya agbapụchaa,Obodo ya dị iche iche abụrụ ihe na-awụ akpata oyi,N’enweghị onye bi na ha.+ 10  Ọ bụrụ na e nwee onye na-ejighị ozi ọ na-ejere Jehova kpọrọ ihe, a ga-abụ ya ọnụ. Ọ bụrụkwa na e nwee onye na-achọghị iji mma agha ya gbuo mmadụ,* a ga-abụ ya ọnụ. 11  Ndị Moab tụsaara ahụ́ kemgbe ha bụ ụmụaka. Ha nọ jii ka ikè mmanya. E sitụbeghị n’otu ite wụnye ha n’ite ọzọ. A dọrọtụbeghịkwa ha n’agha. Ọ bụ ya mere ha ka ji atọ otú ha na-atọ kemgbe. Ísìsì ha agbanwebeghịkwa. 12  “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa mgbe m ga-eziga ndị ga-awụfu ha. Ha ga-awụfu ha na ihe niile dị n’ite ha. Ha ga-akụrikwa nnukwu ite ha niile. 13  Ihere Kimọsh bụ́ chi ndị Moab ga-eme ha, otú ahụ ihere mechara mewe ndị Izrel maka na ha tụkwasịrị arụsị dị na Betel obi.+ 14  Olee ihe mere unu ji sị: “Anyị bụ ndị dike n’agha, anyị dịkwa njikere ịlụ agha”?’+ 15  Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,‘E bibiela Moab.+ A lụsola obodo ya dị iche iche agha.+ E gbuokwala ụmụ okorobịa ha ndị kacha mma.’+ 16  Ọdachi ga-adakwasị ndị Moab n’oge na-adịghị anya. Oge a ga-ebibi ha dị ezigbo nso.+ 17  Ndị niile gbara ha gburugburuNa ndị niile ma ụdị ndị ha bụ* ga-emetara ha ebere. Gwanụ ha, sị: ‘A gbajiela mkpanaka siri ike, ya bụ, mkpara mara mma.’ 18  Ndị bi na Daịbọn, hapụnụ ọkwá unu dị ebube. Nọdụnụ ala ka akpịrị kpọọ unu nkụ,*+N’ihi na onye bibiri Moab abịala ịlụso unu agha. Ọ ga-alakwa ebe unu niile a rụsiri ike n’iyi.+ 19  Ndị bi n’Aroa,+ guzoronụ n’akụkụ ụzọ lewe ihe na-eme. Jụọnụ nwoke na-agba ọsọ na nwaanyị na-agbapụ agbapụ ihe na-eme. 20  E menyere ndị Moab ihere, meekwa ka ezigbo ụjọ jide ha. Beenụ ákwá, tiekwanụ mkpu ákwá. Kọọnụ n’Anọn+ na e bibiela Moab. 21  “Chineke ekpeela ndị bi n’ala dị larịị ikpe,+ ya bụ, Holọn, Jehaz,+ Mefat,+ 22  Daịbọn,+ Nibo,+ Bet-diblateyim, 23  Kiriateyim,+ Bet-gemọl, Bet-mion+ 24  Kiriọt,+ Bọzra, na obodo niile dị na Moab, ma ndị dị nso ma ndị dị anya. 25  Jehova kwuru, sị, ‘A napụla Moab ike ya.* A gbajiekwala aka ya dị ike. 26  Meenụ ka ọ ṅụọ mmanya ṅụrọọ anya,+ n’ihi na o buliela onwe ya elu, si otú ahụ mehie Jehova.+ Moab atụrụọla onwe ya n’agbọ ọ gbọrọ. A na-achịzi ya ọchị. 27  Ọ̀ kwa ị nọ na-akwa Izrel emo?+ Ị̀ hụrụ ya ebe ya na ndị ohi nọ,Nke mere i ji na-efufe isi ma na-ekwu okwu ọjọọ gbasara ya? 28  Ndị bi na Moab, hapụnụ obodo unu gaa biri ná nnukwu nkume,Dịrịkwanụ ka nduru nke na-akpa akwụ́ n’akụkụ ndagwurugwu.’” 29  “Anyị anụla banyere nganga Moab, na ọ dị ezigbo mpako. Anyị anụla na ọ na-ebuli onwe ya elu, na-akpa nganga, na-aka anya, onwe ya na-ebukwa ya isi.”+ 30  “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m na ọ na-ewe oké iwe. Ma, ọnụ ọ na-etu abaghị uru ọ bụla. E nweghị ihe ndị Moab ga-emeli. 31  Ọ bụ ya mere m ga-eji beere Moab ákwá arịrị. M ga-ebekwara Moab niile ákwá,Beekwara ndị Kia-hires ákwá.+ 32  Osisi vaịn Sibma,+ m ga-ebere gị ákwáKarịrị nke e beere Jeza.+ Alaka gị ndị na-awasa nke ọma awasaala gafee oké osimiri. Ha awasaala ruo n’oké osimiri, ruokwa Jeza. Onye na-ebibi ihe abịalaIbibi mkpụrụ mịịrị gị n’ọkọchị nakwa mkpụrụ vaịn ị ghọtara.+ 33  E meela ka a gharazie ịna-enwe obi ụtọ na ọṅụ n’ebe a kụrụ mkpụrụ osisi dị iche icheNakwa n’ala Moab.+ Emeela m ka mmanya kwụsị ịna-agbapụta n’ebe a na-azọchapụta mmanya. O nweghị onye ga na-eti mkpu ọṅụ ka ọ na-azọcha mkpụrụ. Mkpu a ga na-eti agaghị abụ mkpu ọṅụ.’”+ 34  “‘Ha na-eti mkpu ákwá na Heshbọn,+ a na-anụ ya n’Iliele.+ Ha na-etikwa ya, a na-anụ ya na Jehaz.+ Ha na-etikwa mkpu ákwá na Zoa, a na-anụ ya na Họroneyim,+ na-anụkwa ya n’Eglat-shelaịshiya. Mmiri Nimrim ga-atakwa kpamkpam.+ 35  M ga-eme ka a gharazie inwe onye na-eweta onyinye n’ebe dị eluNakwa onye na-achụrụ chi ya àjà na Moab.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 36  ‘Ọ bụ ya mere obi m ga-eji na-eme mkpọtụ ka ọjà* n’ihi Moab.+ Obi m ga na-adakwa ka ọjà* n’ihi ndị Kia-hires. Ọ bụ ya mere akụnụba ya ga-eji laa n’iyi. 37  N’ihi na isi ha niile akwọchaala.+ A kpụkwara afụ ọnụ ha niile akpụ. Aka ha niile bucha ọnyá.+ Ha kekwara ákwà iru uju n’úkwù.’”+ 38  “Jehova kwuru, sị, ‘A nọ n’elu ụlọ niile dị na MoabNakwa n’ámá ya niile Na-eti sọ mkpu ákwá. N’ihi na akụọla m Moab righirighiKa ite na-abaghị uru. 39  Ụjọ ejidela ya. Tienụ mkpu ákwá. Moab agbaala ọsọ. Ihere na-emezi ya. A na-achịzi ya ọchị. Otú ọ dịzi na-emenyekwa ndị niile gbara ya gburugburu ụjọ.’” 40  “Jehova kwuru, sị: ‘Otú ahụ ugo si efedata ka o buru ihe,+Ka onye iro ga-agbasa nku ya ka o buru Moab.+ 41  A ga-eweghara obodo niile dị na Moab,Wegharakwa ebe ndị a rụsiri ike na ya. N’ụbọchị ahụ, obi ga na-akụ ndị agha Moab kpum kpumOtú o si akụ nwaanyị ime na-eme.’” 42  “‘A ga-ebibikwa Moab ka ọ gharazie ịbụ mba,+N’ihi na o buliri onwe ya elu, si otú ahụ mehie Jehova.+ 43  Onye bi na Moab, ụjọ ga-atụ gị. Ị ga-adaba n’olulu, ọnyà ga-amakwa gị.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 44  ‘Onye ọ bụla nke na-agba ọsọ n’ihi ụjọ ga-adaba n’olulu. Ọnyà ga-amakwa onye ọ bụla nke si n’olulu ahụ na-apụta.’ ‘N’ihi na a ga-enwe afọ m ga-ata ndị Moab ahụhụ.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 45  ‘Ndị na-agba ọsọ guzo na ndò Heshbọn. Ike gwụrukwara ha n’ọkpụkpụ. N’ihi na ọkụ ga-esi na Heshbọn rere pụta. Ire ọkụ ga-esikwa na Saịhọn pụta.+ Ọ ga-erepịa egedege ihu Moab,Repịakwa isi ụmụ na-akpa aghara.’+ 46  ‘Moab, ị ga-ata ahụhụ. Ndị na-efe Kimọsh+ alaala n’iyi. N’ihi na a kpụrụla ụmụ nwoke ndị Moab laa obodo ọzọ,Dọrọkwa ụmụ nwaanyị ha n’agha.+ 47  Ma n’oge ikpeazụ, m ga-akpọkọta ndị e si na Moab dọrọ n’agha. Ebe a ka ikpe e kpere Moab gwụrụ.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “wụfuo ọbara.”
Na Hibru, “ndị niile ma aha ha.”
O nwere ike ịbụ, “Nọdụnụ ala n’ala kpọrọ nkụ.”
Na Hibru, “A gbajiela mpi Moab.”
Ya bụ, ọjà a na-afụ n’oge a na-ebe ákwá ma e liwe mmadụ.
Ya bụ, ọjà a na-afụ n’oge a na-ebe ákwá ma e liwe mmadụ.