Jeremaya 5:1-31

  • dị bi na Jeruselem anabataghị aka ná ntị Jehova dọrọ ha (1-13)

  • A ga-ebibi ndị Izrel, ma, a gaghị ebibi ha kpamkpam (14-19)

  • Jehova ga-eme ka ndị ya zaa ajụjụ maka ihe ha mere (20-31)

5  Gagharịanụ n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. Legharịakwanụ anya nke ọma. Chọọkwanụ n’ámá ya dị iche icheMa è nwere onye na-eme ihe dị mma+Nakwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. E nwee, m ga-agbaghara obodo a.   Ọ bụrụgodị na ha asị: “Anyị ji Jehova bụ́ Chineke dị ndụ na-aṅụ iyi!” Ha ka ga na-aṅụ iyi ụgha.+   Jehova, ọ́ bụghị ndị na-erubere gị isi ka anya gị na-achọ ịhụ?+ I tiri ha ihe, ma o metụghị ha n’ahụ́.* I bibiri ọtụtụ n’ime ha, ma ha anabataghị aka ná ntị ị dọrọ ha.+ Ha mere ka ihu ha sie ike karịa oké nkume.+ Ha jụrụ ịlọghachikwute gị.+   Ma m gwara onwe m, sị: “N’eziokwu, ndị a amaghị nke a na-akọ. Ha zuzuru nzuzu, n’ihi na ha amaghị uche* Jehova,Ya bụ, ihe Chineke ha chọrọ ka ha mee.   M ga-agakwuru ndị a ma ama ma gwa ha okwu,N’ihi na hanwa amarala uche Jehova,Ya bụ, ihe Chineke ha chọrọ ka ha mee.+ Ma, ha niile agbajiela yok ha,*Dọbichaakwa agbụ e kere ha.”   Ọ bụ ya mere ọdụm ji esi n’oké ọhịa apụta na-adọri ha. Anụ ọhịa wolf esikwa n’ọzara na-emebisị ihe ha nwere. Agụ owuru mụkwa anya makpuru n’obodo ha dị iche iche. Ọ na-adọgbu onye ọ bụla si n’ime ha na-apụta. N’ihi na mmehie ha dị ọtụtụ. Ha enupụkwala isi ọtụtụ ugboro.+   Olee otú m ga-esi gbaghara gị ihe a? Ụmụ gị ahapụla m. Ha na-ejikwa chi ndị na-abụghị Chineke aṅụ iyi.+ M na-enye ha ihe ọ bụla dị ha mkpa,Ma ha nọ na-akwa iko. N’ụlọ nwaanyị akwụna ka ha na-ekworo aga.   Ha dị ka oké ịnyịnya ọ dị ọkụ n’ahụ́ ịgba nne ịnyịnya. Onye nke ọ bụla na-ebe ubé ka ịnyịnya wee na-achụ nwunye onye ọzọ.+   Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a? Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme?”+ 10  “Gaanụ Jeruselem bibie osisi vaịn ndị dị na ya,Ma unu alala ihe niile n’iyi.+ Gbupụnụ alaka ya ndị pulitere ọhụrụ,N’ihi na ọ bụghị Jehova nwe ha. 11  N’ihi na ndị Izrel na ndị JudaEgosila m na ha na-aghọ ncha n’aghụghọ.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.+ 12  “Ha agọnahụla Jehova, na-asịkwa: ‘O nweghị ihe ọ ga-eme.*+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị. Anyị agaghị ahụ agha ma ọ bụ ụnwụ.’+ 13  Ndị amụma ha dị ka ifufe. Okwu Chineke adịghịkwa n’obi ha. Ka ha laakwa n’iyi.” 14  Ọ bụ ya mere Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, ji kwuo, sị: “Ebe ọ bụ na ndị a na-ekwu ihe a,M ga-eme ka okwu m ghọọ ọkụ n’ọnụ gị.+ Ndị a ga-abụkwa nkụ. Ọkụ ahụ ga-eregbukwa ha.”+ 15  Jehova kwuru, sị, “Ndị Izrel, m ga-eme ka mba si ebe dị anya bịa lụso unu agha.+ Ọ bụ mba dịterela aka,Mba dịwara kemgbe oge ochie,Mba unu na-amaghị asụsụ ha,Mba unu na-enweghịkwa ike ịghọta ihe ha na-ekwu.+ 16  Akpa akụ́ ha dị ka ili ghere oghe. Ha niile bụ ndị dike n’agha. 17  Ha ga-erichapụ ihe unu wetara n’ubi na ihe oriri unu.+ Ha ga-egbu ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị. Ha ga-erichapụ ìgwè ewu na atụrụ unu na ìgwè ehi unu. Ha ga-erichapụ osisi vaịn unu na osisi fig unu. Ha ga-eji mma agha bibie obodo unu dị iche iche a rụsiri ike, bụ́ ndị kara unu obi.” 18  Jehova kwukwara, sị, “N’agbanyeghị ihe ndị a niile ga-eme unu n’oge ahụ, agaghị m ebibi unu kpamkpam.+ 19  Ọ bụrụkwa na ha ajụọ, sị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji mee anyị ihe a niile?’ ị ga-asị ha, ‘Otú ahụ unu hapụrụ m gaa na-efe chi ndị mba ọzọ n’ala unu, otú ahụ ka unu ga na-ejere ndị mba ọzọ ozi ná mba na-abụghị nke unu.’”+ 20  Kọọnụ ihe a n’ezinụlọ Jekọb,Kọsaakwanụ na Juda, sị: 21  “Ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, nụrụnụ ihe a:+ Unu nwere anya ma unu anaghị ahụ ụzọ.+ Unu nwere ntị ma unu anaghị anụ ihe.+ 22  Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere na unu anaghị asọpụrụ m? Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma jijiji n’ihi m? Ọ bụ mụnwa ji ájá kpaara oké osimiri ókè. Ọ ga-adịgidekwa otú ahụ. Ọ gaghị asọfeli ókè ya. Ọ bụ eziokwu na mmiri ya ga na-amali elu, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya. Ọ bụ eziokwu na ọ na-eme mkpọtụ, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya.+ 23  Ma obi ndị a kpọchiri akpọchi. Ha na-enupụkwa isi. Ha ahapụla m, na-eme ihe ọ bụla masịrị ha.+ 24  Ha anaghịkwa ekwu n’obi ha, sị: “Ka anyị tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị,Onye na-eme ka mmiri zoo n’oge ya,Ma n’ụbịa mmiri ma n’ụla mmiri. Ọ bụkwa ya na-ahụ na anyị nwere izu a kapịrị ọnụ anyị ga-eji wee ihe ubi anyị.”+ 25  Omume ọjọọ unu emeela ka unu ghara inweta ezigbo ihe ndị a. Mmehie unu emeela ka ihe ọma ghara iru unu aka.+ 26  N’ihi na e nwere ụfọdụ n’ime ndị m bụ́ ndị ajọ omume. Ha na-enyogharị anya, dị ka mgbe ndị na-achụ nta nnụnụ hulatara ala. Ha na-esi ọnyà nwere ike igbu mmadụ. Ọ bụ ndị mmadụ ka ha na-amata n’ọnyà. 27  Dị ka nnụnụ si eju ná ngịga,Otú ahụ ka ihe ndị ha gwutere na wayo si eju n’ụlọ ha.+ Ọ bụ ya mere ha ji bụrụ ndị ukwu ma baa ọgaranya. 28  Ha ebuola ibu, ahụ́ ha ana-akwọkwa mụrụmụrụ. Ihe ọjọọ ha na-eme karịrị akarị. Ha anaghị ekpechite ọnụ nwa na-enweghị nna,+Maka na ha na-achọ ka ihe na-agaziri hanwa. Ha na-ekpekwa ndị ogbenye ikpe mkpegbu.’”+ 29  Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a? Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme? 30  A kpaala arụ n’ala a, meekwa ihe jọgburu onwe ya na ya: 31  Ndị amụma na-ebu amụma ụgha.+ Ndị nchụàjà na-ejikwa ikike ha nwere emegbu ndị mmadụ. Ọ dịkwa ndị m mma otú ahụ.+ Ma, gịnị ka unu ga-eme mgbe ihe ndị a niile ga-ebi?”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ike agwụghị ha.”
Na Hibru, “ụzọ.”
Yok a pụtara ịnọ n’okpuru Chineke.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ dịghị adị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”