Jeremaya 52:1-34

  • Zedekaya nupụụrụ ndị Babịlọn isi (1-3)

  • Nebukadneza nọchibidoro Jeruselem (4-11)

  • E bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ dị na ya (12-23)

  • A dọọrọ ndị mmadụ n’agha laa Babịlọn (24-30)

  • E si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta Jehoyakin (31-34)

52  Zedekaya+ dị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Hamutal+ nwa Jeremaya onye Libna.  Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova otú Jehoyakim mere.+  Ihe mere ihe ndị a ji mee ndị bi na Jeruselem na ndị Juda bụ maka na ha nọ na-akpasu Jehova iwe ruo mgbe ọ chụpụrụ ha n’ihu ya.+ Zedekaya mechakwara nupụrụ eze Babịlọn isi.+  N’abalị iri n’ọnwa iri, n’afọ nke itoolu n’ọchịchị Zedekaya, Nebukadneza* eze Babịlọn na ndị agha ya niile bịara ịlụso Jeruselem agha. Ha mara ụlọikwuu ha ga-anọ lụso ya agha, rụọkwa mgbidi gburugburu ya ka ha nwee ike nọchibido ya.+  Ha nọchibidokwara Jeruselem ruo n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya.  N’abalị itoolu n’ọnwa anọ n’afọ ahụ,+ ụnwụ bịara ka njọ na Jeruselem. Ndị mmadụ ahụghịkwa nri ha ga-eri.+  Ndị Kaldia mechara kwatuo mgbidi Jeruselem. Ka ha gbakwara obodo ahụ gburugburu ịlụso ya agha, ndị agha niile nọ na ya ji abalị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’agbata mgbidi abụọ gbaa ọsọ. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dị n’akụkụ ubi eze. Ha gbakwaara tinye isi n’ụzọ gara Araba.+  Ma ndị agha Kaldia chụwara Zedekaya, chụkwute ya+ n’ọzara Jeriko. Ndị agha ya niile hapụkwara ya rie mbọmbọ.  Ndị Kaldia jidere ya, kpụrụ ya kpụgara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla nke dị na Hemat. Ọ makwara ya ikpe. 10  Eze Babịlọn nọ na Ribla gbuo ụmụ Zedekaya ndị nwoke n’ihu ya, gbuokwa ndị niile bụ́ ndị isi ndị Juda. 11  Ọ rụkpọsịkwara Zedekaya anya,+ tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee, kpụrụkwa ya laa Babịlọn ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọkwa mkpọrọ ruo ụbọchị ọ nwụrụ. 12  N’abalị iri n’ọnwa ise, n’afọ nke iri na itoolu n’ọchịchị Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn, Nebuzaradan onyeisi ndị nche, onye na-ejere eze Babịlọn ozi, bịara Jeruselem.+ 13  Ọ gbara ụlọ niile dị na Jeruselem ọkụ,+ ma ụlọ Jehova ma ụlọ* eze ma ụlọ onye ọ bụla a ma ama. 14  Ndị agha Kaldia niile ha na onyeisi ndị nche ahụ so bịa kwaturu mgbidi gbara Jeruselem gburugburu.+ 15  Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ụfọdụ n’ime ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’agha, dọrọkwa ndị ọzọ fọdụrụ na Jeruselem nakwa ndị chịliiri ndị agha eze Babịlọn aka elu ma na-akwadozi ya. Ndị ọzọ ọ dọọrọ n’agha bụ ndị bụ́ ọkaibe n’ime nkà.+ 16  Ma, Nebuzaradan hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ ka ha na-arụ ọrụ n’ubi vaịn nakwa n’ubi ọ bụla ọzọ a manyere ha ịrụ ọrụ.+ 17  Ndị Kaldia kụrisịrị ogidi ọla kọpa+ ndị dị n’ụlọ Jehova, gbukasịakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ dị n’ụlọ Jehova nakwa otu nnukwu ite e ji ọla kọpa rụọ+ a na-akpọ Oké Osimiri. Ha bukwaara ọla kọpa niile e ji rụọ ihe ndị a laa Babịlọn.+ 18  Ha bukọkwaara ite,+ shọvel,+ ihe ndị e ji emenyụ ọkụ, ọkwá, iko, na arịa niile e ji ọla kọpa rụọ, ndị e ji arụ ọrụ n’ụlọ nsọ. 19  Onyeisi ndị nche ahụ bukọkwaara efere,+ ihe ndị e ji agụrụ ọkụ, ọkwá dị iche iche, ite, ihe e ji adọsa ọkụ,*+ iko, na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo na ezigbo ọlaọcha rụọ.+ 20  A bịa n’ihe gbasara arịa niile Eze Solomọn rụrụ n’ụlọ Jehova, ma ogidi abụọ ma nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri ma oké ehi iri na abụọ+ dị n’okpuru ya, bụ́ ndị e ji ọla kọpa kpụọ, ma ihe ndị e ji ebu ihe, a gaghị atụli ọla kọpa o ji rụọ ha atụ̀, n’ihi na ha karịrị akarị. 21  Ogo nke ọ bụla n’ime ogidi abụọ ahụ dị kubit* iri na asatọ. E jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe tụọ nke ọ bụla n’ime ha gburugburu, ọ dị kubit iri na abụọ.+ Igbidi ya dị uhiè mkpịsị aka anọ.* Ime ya ghekwa oghe. 22  E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ. Ogo otu n’ime ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ dị kubit ise.+ E ji naanị ọla kọpa kpụọ ihe a kpara akpa nakwa ihe yiri mkpụrụ pomigranet ndị e ji gbaa ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ gburugburu. Otú ogidi nke mbụ dị ka nke abụọ dịkwa. Otú ahụ ihe ndị ahụ yiri mkpụrụ pomigranet dị n’ogidi nke mbụ ka ha dịkwa n’ogidi nke abụọ. 23  Ihe ahụ niile yiri mkpụrụ pomigranet ndị dị gburugburu ihe ahụ a kpara akpa dị otu narị (100).+ Ma, ndị nke a na-ahụ anya dị iri itoolu na isii. 24  Onyeisi ndị nche kpụkwaara Seraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà na Zefanaya+ onye nchụàjà na-esote ya nakwa mmadụ atọ na-eche ọnụ ụzọ nche.+ 25  Ndị ọzọ ọ kpụụrụ n’obodo ahụ bụ otu onye na-eje ozi n’obí eze, bụrụkwa onyeisi ndị agha, mmadụ asaa nọ n’obodo ahụ, bụ́ ndị ndụmọdụ eze, odeakwụkwọ onyeisi ndị agha, bụ́ onye na-akpọkọta ndị obodo ma a chọọ ịga agha, nakwa ụmụ nwoke iri isii ndị obodo ahụ, bụ́ ndị nkịtị fọrọ n’obodo. 26  Nebuzaradan onyeisi ndị nche kpụụrụ ha kpụtara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla. 27  Eze Babịlọn wee gbuo ha na Ribla+ nke dị na Hemat. Otú a ka e si dọrọ ndị Juda n’agha pụọ n’obodo ha.+ 28  N’afọ nke asaa n’ọchịchị Nebukadneza,* ndị Juu ọ dọọrọ n’agha dị puku atọ na iri abụọ na atọ (3,023).+ 29  N’afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Nebukadneza,*+ ndị* o si na Jeruselem dọrọ n’agha dị narị asatọ na iri atọ na abụọ (832). 30  N’afọ nke iri abụọ na atọ n’ọchịchị Nebukadneza,* Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ndị Juu dị narị mmadụ* asaa na iri anọ na ise (745) n’agha.+ Ndị* niile a dọọrọ n’agha dị puku anọ na narị isii (4,600). 31  N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa nke iri na abụọ, n’afọ nke iri atọ na asaa a dọọrọ Jehoyakin+ eze Juda n’agha, Ivil-merodak eze Babịlọn si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta Jehoyakin eze Juda. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Ivil-merodak malitere ịchị.+ 32  O medara obi gwa Jehoyakin okwu, buliekwa ya n’ọkwá, ya akara ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babịlọn. 33  Jehoyakin wee yipụ uwe ndị mkpọrọ o yi. Ya na eze rikọwara nri na tebụl oge niile ọ dị ndụ. 34  Eze Babịlọn na-enyekwa ya nri ọ na-eri kwa ụbọchị oge niile ọ dị ndụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Uhiè otu mkpịsị aka bụ ihe dị ka sentimita 2 (ihe dị ka otu inch). Gụọ B14.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”