Jeremaya 6:1-30
6 Ụmụ Benjamin, sinụ na Jeruselem gbapụ ka ihe ọ bụla ghara ime unu.
Fụọkwanụ opi+ na Tekoa.+
Mụnyenụ ọkụ na Bet-hakirem ka ọ bụrụ ihe ga-agba àmà,N’ihi na ọdachi si n’ebe ugwu na-abịa. Ọ ga-abụ nnukwu ọdachi.+
2 Zayọn* yiri nwaanyị mara mma nke a zụtọrọ azụtọ.+
3 Ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha ga-abịa.
Ha ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ya.+
Atụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha na-ata ahịhịa dị n’ebe onye na-azụ ya nọ.+
4 “Jikerenụ* ịlụso ya agha.
Bilienụ ka anyị lụso ya agha n’etiti ehihie.”
“Anyị efuola, n’ihi na chi ejiwela.
Chi na-ejikwu n’ike n’ike.”*
5 “Bilienụ ka anyị lụso ya agha n’abalịMa kụrie ụlọ elu ya niile a rụsiri ike.”+
6 N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“Gbutuonụ osisi dị iche iche, jirikwanụ ájá rụọ mgbidi gburugburu mgbidi Jeruselem iji lụso ya agha.+
Ọ bụ obodo nke ga-azarịrị ajụjụ ihe o metara.
Naanị ihe a na-eme n’ime ya bụ imegbu ndị mmadụ.+
7 Otú ahụ e si ahụ mmiri jụrụ oyi n’olulu mmiri,Ka e si ahụ ihe ọjọọ na Jeruselem.
A na-anụ mkpọtụ ndị tigbuo zọgbuo na mkpọtụ ndị na-ebibisị ihe n’ime ya.+
M na-ahụ ọrịa na ọdachi mgbe niile.
8 Jeruselem, nabata aka ná ntị m na-adọ gị, ma ọ́ bụghị ya, m* ga-agbakụta gị azụ ka ihe a na-asọ oyi.+
M ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị, a gharakwa inwe mmadụ ọ bụla ga-ebi na gị.”+
9 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“Ndị iro ga-akpụrụ ndị Izrel fọdụrụ, ka à ga-asị na ha bụ mkpụrụ vaịn ndị ikpeazụ a na-atụtụkọrọ.
Ndị iro ha ga-akpụrụ ha niile laa, otú ahụ onye na-aghọ mkpụrụ vaịn ndị dị n’alaka osisi vaịn si ekpokọrọ ha niile.”
10 “Ole ndị ka m ga-agwa okwu, dọọkwa aka ná ntị?
Ònye ga-ege m ntị?
Ntị ha akpọchiela.* Ọ bụ ya mere na ha enweghị ike ịṅa ntị.+
Ha ji okwu Jehova eme ihe ọchị.+
Okwu ya anaghị atọ ha ụtọ.
11 Iwe juru m obi otú o juru Jehova.
Ike agwụkwala m ịgbachi nkịtị.”+
“Gwa nwatakịrị nọ n’okporo ámá na ezigbo iwe ji m.+
Gwakwa ya ụmụ okorobịa ndị gbakọrọ otu ebe.
A ga-ejide ha niile, ma nwoke ma nwunye ya,Ma onye mere agadi ma onye kara ezigbo nká.+
12 A ga-enyefe ndị ọzọ ụlọ ha,Ubi ha, na ndị nwunye ha.+
M ga-amatị aka mee ndị bi n’ala a ihe.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
13 “Onye ọ bụla n’ime ha, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, na-eji aghụghọ achọ ihe ga-abara naanị ya uru.+
Onye ọ bụla n’ime ha na-egwu wayo, ma onye amụma ma onye nchụàjà.+
14 Ha na-achọ ịgba ndị m ọkpụkpụ, ma ha ejighị ya kpọrọ ihe. Ha na-asị,‘Udo dị! Udo dị!’
Mgbe udo na-adịghị.+
15 Ihere ọ̀ na-eme ha na ọ bụ arụ ka ha mere?
Ihere anaghị eme ha ma otu.
Ha amaghịdị ihe bụ́ ihere ime mmadụ.+
N’ihi ya, ha ga-eso ndị dara ada daa.
Ha ga-ada mgbe m ga-ata ha ahụhụ.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
16 Jehova kwukwara, sị:
“Guzoronụ ebe ụzọ gbara mkpị lee anya,Jụọnụ ajụjụ okporo ụzọ ndị dịwara kemgbe oge ochie.
Jụọnụ ebe ezigbo ụzọ dị. Jeekwanụ ije na ya+Ka ahụ́ ruo unu* ala.”
Ma unu na-asị: “Anyị agaghị eje ije na ya.”+
17 “Ahọpụtara m ndị nche+ ndị nọ na-asị unu,‘Ṅaanụ ntị n’ụda opi!’”+
Ma unu nọ na-asị: “Anyị agaghị aṅa ntị.”+
18 “N’ihi ya, mba dị iche iche, nụrụnụ.
Ununwa ndị gbakọrọnụ, marakwanụIhe ga-eme ndị bi na Jeruselem.
19 Ndị bi n’ụwa, geenụ ntị!
M na-eme ka ọdachi dakwasị ndị a+N’ihi echiche ọjọọ ha na-eche.
Ha aṅaghị ntị n’okwu m.
Ha anabataghịkwa iwu m.”*
20 “Olee nke gbasara m na unu na-eweta frankinsens si Shiba,Na-ewetakwa okpete na-esi ísì ọma nke si n’obodo dị anya?
Àjà a na-esucha ọkụ unu na-achụ adịghị mụ mma,Àjà ndị ọzọ unu na-achụ adịghịkwa mụ mma.”+
21 N’ihi ihe a, Jehova kwuru, sị:
“M na-edowere ndị a ihe ga-eme ka ha daa.
Ọ ga-akwadakwa ha,Ma ndị nna ma ụmụ ha,Mmadụ na ibe ya.
Ha niile ga-ala n’iyi.”+
22 Jehova kwuru, sị:
“E nwere ndị si n’ala dị n’ebe ugwu na-abịa.
E nwekwara nnukwu mba a ga-esi n’ime ime ụwa kpọtee.+
23 Ha ga-eji ụta na árọ̀ abịa.
Obi tara ha mmiri. Ha agaghịkwa eme ebere.
Ha ga-ebigbọ ka oké osimiri.
Ha ga-agbarakwa ịnyịnya bịa.+
Ha na-ahazi onwe ha n’usoro ịlụso Zayọn* agha ka à ga-asị na ha bụ otu onye.”
24 Anyị anụla akụkọ gbasara ya.
Ike agwụla anyị.+
Anyị nọ n’ezigbo ahụhụ.
Ahụ́ na-egbu anyị mgbu ka nwaanyị na-amụ nwa.+
25 Abanyela n’ọhịa,Agakwala n’ụzọ,N’ihi na onye iro ji mma agha.
Ụjọ jikwa ndị mmadụ n’ebe niile.
26 Ndị m, yirinụ ákwà iru uju.+
Tụrụọkwanụ onwe unu ná ntụ.
Ruonụ ụdị uju a na-eru ma nwa a mụrụ naanị ya nwụọ. Na-etikwanụ mkpu ka ndị obi gbawara,+N’ihi na e nwere onye ga-abịa na mberede bibie anyị.+
27 “Ahọpụtala m gị* ka ị dị ka onye na-anụcha ọla, n’ihi na ị ga-anụcha ndị m.
Ị ga-eleru ha anya,Chọpụta nnọọ ihe ha na-eme.
28 Ha niile dị isi ike karịa mmadụ niile.+
Ha na-agagharị na-ekwutọsị ibe ha.+
Ha dị ka ọla kọpa na ígwè.
Ha niile emebiela.
29 Mmadụ ejirila ihe e ji afụnwu ọkụ fụnwuo ọkụ ka ọ nụchaa ọla.
Ka ọ nọ na-afụnwu ya, ihe ahụ o ji afụnwu ọkụ eree ọkụ. Mbọ niile ọ gbara alaa n’iyi.+
Naanị nkume led ka o nwetara n’ọkụ ahụ.
E kewabeghị ndị ọjọọ ka ha nọrọ iche n’ebe ndị ọzọ nọ.+
30 Ndị mmadụ ga na-akpọ ha ọlaọcha a jụrụ ajụ,N’ihi na Jehova ajụla ha.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”
^ Ma ọ bụ “Doonụ onwe unu nsọ maka.”
^ Na Hibru, “Onyinyo mgbede na-adịkwu ogologo.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Na Hibru, “E bighị ntị ha úgwù.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
^ Ma ọ bụ “ntụziaka m.”
^ Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
^ Ya bụ, Jeremaya.