Jeremaya 7:1-34

  • Ndị Izrel na-eme ihe ọjọọ ma chee na ụlọ Jehova ga-echebe ha (1-11)

  • Ụlọ nsọ ga-adị ka Shaịlo (12-15)

  • Chineke gwara ndị Juda na ya anaghị anabata onye na-efe arụsị (16-34)

    • Ndị Izrel na-efe chi a na-akpọ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe” (18)

    • Ndị Izrel na-akpọ ụmụ ha ọkụ iji chụọ àjà na Ndagwurugwu Nwa Hinọm (31)

7  Jehova gwara Jeremaya okwu, sị:  “Gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ Jehova, nọrọkwa ebe ahụ kwuo, sị, ‘Unu ndị Juda niile, ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá a abanye ịga kpọọrọ Jehova isiala, nụrụnụ ihe Jehova kwuru.  Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu emee ka àgwà unu na omume unu dị mma, m ga-ahapụ unu ka unu biri ebe a.+  Unu etinyela obi n’okwu ga-eduhie unu, na-asị: ‘Ihe a bụ ụlọ nsọ Jehova. Ọ bụ ụlọ nsọ Jehova. Ọ bụ ụlọ nsọ Jehova!’+  Ọ bụrụ na unu akpawa ezigbo àgwà, mewekwa omume dị mma, ọ bụrụ na unu ana-ekpe ikpe ziri ezi ma mmadụ na ibe ya nwee okwu,+  ọ bụrụ na unu anaghị emegbu onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nne na nna* na nwaanyị isi mkpe,+ ọ bụrụ na unu anaghị egbu ndị aka ha dị ọcha n’ala a, ọ bụrụkwa na unu agaghị fewe chi ọzọ dị iche iche ma kpatara onwe unu nsogbu,+  m ga-ahapụ unu ka unu biri n’ala a, bụ́ ala m nyere nna nna unu hà ka ha biri ruo mgbe ebighị ebi.”’”*  “Ma, unu tinyere obi unu n’okwu ụgha+ na-enweghị otu mkpụrụ uru ọ ga-abara unu.  Ùnu ga na-ezu ohi,+ na-egbu mmadụ,* na-akwa iko, na-aṅụ iyi ụgha,+ na-achụrụ Bel àjà,+ na-efekwa chi dị iche iche unu na-amaghị, 10  n’agbanyeghị arụ a niile unu na-akpa, unu abịakwa guzoro n’ihu m n’ụlọ a a na-anọ eto aha m, sị, ‘A ga-anapụta anyị?’ 11  Ụlọ a a na-anọ eto aha m ọ̀ ghọọlara unu ọgba ndị ohi?+ Ahụla m ihe unu na-eme.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 12  “‘Ma ugbu a, gaanụ n’ụlọ m dị na Shaịlo,+ bụ́ ebe m họọrọ na mbụ ka a nọrọ na-eto aha m,+ ka unu hụ ihe m mere ya n’ihi ihe ọjọọ ndị Izrel bụ́ ndị m mere.+ 13  Jehova kwuru, sị, ‘Unu nọ na-eme ihe ọjọọ ndị a niile, unu egeghịkwa mụ ntị n’agbanyeghị na m gwara unu okwu ugboro ugboro.+ M nọkwa na-akpọ unu, ma unu azaghị.+ 14  N’ihi ya, ihe m mere Shaịlo+ ka m ga-eme ụlọ a kara unu obi+ a na-anọ eto aha m,+ bụ́ ebe m nyere unu na nna nna unu hà. 15  M ga-achụpụ unu n’ihu m, otú ahụ m chụpụrụ ụmụnne unu niile, ya bụ, ụmụ Ifrem niile.’+ 16  “Ma gịnwa bụ́ Jeremaya, ekpekwala ekpere maka ndị a. Ebesarala m ákwá n’ihi ha ma ọ bụ kpeere ha ekpere. Arịọkwala m arịrịọ maka ha,+ n’ihi na agaghị m ege gị ntị.+ 17  Ọ̀ bụ na ị naghị ahụ ihe ha na-eme n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem? 18  Ụmụ na-akpata nkụ, ndị nna ana-emenwu ọkụ, ndị nwunye ana-agwọ ntụ ọka ha ga-eji mee achịcha e ji achụrụ chi ha na-akpọ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà.+ Ha na-achụkwara chi ọzọ dị iche iche àjà mmanya iji kpasuo m iwe.+ 19  Jehova kwuru, sị, ‘Ọ̀ bụ m ka ha na-emebiri ihe? Ọ́ bụghị onwe ha ka ha na-emebiri ihe, na-emenyekwa ihere?’+ 20  N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eji iwe na ọnụma mee obodo a ihe,+ ma mmadụ ma anụ ọhịa ma osisi dị n’ọhịa ma ihe ala mepụtara. Iwe m ga-ewesa ha ga-adị ka ọkụ. A gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’+ 21  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Tawanụ anụ unu chọrọ iji achụ àjà a na-esucha ọkụ na anụ unu chọrọ iji achụ àjà ndị ọzọ.+ 22  N’ihi na agwaghị m nna nna unu hà ihe ọ bụla gbasara àjà a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ ụbọchị ahụ m si n’Ijipt kpọpụta ha.+ Enyeghịkwa m ha iwu ọ bụla gbasara ha. 23  Kama, m gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu erubere m isi, m ga-abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.+ Ọ bụrụkwa na unu edebe iwu niile m nyere unu, ihe ga-agaziri unu.”’+ 24  Ma ha egeghị ntị. Ha atọghịkwa ntị n’ala.+ Kama, ha nọ na-eme ihe masịrị ha. Ha kpọchiri ntị na-eme ihe ọjọọ dị ha n’obi,+ na-emekwu ihe ọjọọ, kama ime ihe dị mma. 25  Otú a ka ha si na-eme malite n’ụbọchị nna nna unu hà si n’Ijipt pụta ruo taa.+ Kwa ụbọchị, m nọ na-ezigara ha ndị ohu m niile bụ́ ndị amụma ugboro ugboro.+ 26  Ma ha egeghị m ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama ha kpọchiri obi ha. Ha nọkwa na-eme ihe ọjọọ karịa ndị nna nna ha. 27  “Ị gwagodị ha ihe a niile,+ ha agaghị ege gị ntị. Ị kpọgodị ha òkù, ha agaghị aza gị. 28  N’ihi ya, gwa ha, sị, ‘Mba a bụ mba na-erubereghị Jehova bụ́ Chineke ha isi. Ha anabataghịkwa aka ná ntị ọ dọrọ ha. E nweghịzi onye na-erubere Chineke isi. E nweghịdị onye na-ekwute okwu irubere ya isi.+ 29  “Kpụọ isi gị, chịfuokwa ntutu gị. Nọrọ n’elu ugwu ọhịa na-adịghị bụọ abụ iru uju, n’ihi na Jehova ajụla ọgbọ a kpasuru ya iwe. Ọ gbahapụkwala ha. 30  Jehova kwuru, sị, ‘Ndị Juda emeela ihe dị njọ n’anya m. Ha emerụọla ụlọ a na-anọ eto aha m n’ihi na ha dowere arụsị ha ndị na-asọ oyi na ya.+ 31  Ha arụọla ebe ndị dị elu na Tofet nke dị na Ndagwurugwu Nwa Hinọm.*+ Ha na-anọ ebe ahụ akpọ ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ.+ Ihe a ha na-eme abatatụbeghị m n’obi.* Ọ bụghịkwa mụnwa gwara ha mewe ya.’+ 32  “Jehova kwuru, sị, ‘N’ihi ya, oge na-abịa mgbe a na-agaghịzi na-akpọ ya Tofet ma ọ bụ Ndagwurugwu Nwa Hinọm,* kama, a ga na-akpọzi ya Ndagwurugwu Igbu Mmadụ. A ga na-eli ozu na Tofet ruo mgbe ebe a ga-eli ozu na-adịghịzi.+ 33  Ozu ha ga-aghọrọ nnụnụ na anụ ọhịa ihe oriri. E nweghịkwa onye ga-achụpụ ha.+ 34  M ga-eme ka ha kwụsị iti mkpu ọṅụ na mkpu ndị obi dị ụtọ ha na-eti n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. M ga-emekwa ka a ghara ịnụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ.+ Ala a ga-abụzi ala e bibiri ebibi.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nna.”
Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “na-egbu ọchụ.”
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Gehena.”
Ma ọ bụ “agbatatụbeghị m n’uche.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Gehena.”