Jeremaya 8:1-22

  • Ndị Izrel na-eso ndị ọzọ eme ihe ha na-eme (1-7)

  • Onye na-amaghị okwu Jehova amaghị ihe (8-17)

  • Ahụ́ ndị Juda merụrụ na-agbawa Jeremaya obi (18-22)

    • “Ọ̀ bụ na mmanụ balsam adịghị na Gilied?” (22)

8  Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-aga ebe e liri ndị eze Juda, ndị isi ya, ndị nchụàjà, ndị amụma, na ndị bi na Jeruselem, chịpụta ọkpụkpụ ha.  Ha ga-agbasa ọkpụkpụ ndị ahụ n’okpuru anyanwụ na ọnwa nakwa n’okpuru kpakpando niile dị n’eluigwe.* Ha ji ihe ndị a kpọrọ ihe, na-efe ha, na-achọ ka ha na-edu ha, na-akpọkwara ha isiala.+ A gaghị achịkọta ha. A gaghịkwa eli ha eli. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.”+  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “N’ebe ọ bụla m ga-achụga ndị fọrọ n’ezinụlọ ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ịnwụ kama ịdị ndụ.”  “Ị ga-asịkwa ha na Jehova kwuru, sị: ‘Hà ga-ada ghara ibili ọzọ? Ọ bụrụ na otu onye alọghachi, onye nke ọzọ ọ́ gaghị alọghachi?   Gịnị mere ndị a bi na Jeruselem ji kpọọ ekwo nkụ na-enupụrụ m isi? Ha achọghị ịkwụsị ịghọ aghụghọ. Ha ajụla ịlọghachi.+   Anọ m na-aṅa ntị, na-egekwa ntị n’ihe ha na-ekwu. Ma, ihe ha nọ na-ekwu adịghị mma. E nweghị onye n’ime ha chegharịrị, hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme, ma ọ bụ jụọ, sị, ‘Gịnị ka m mere ihe a?’+ Onye ọ bụla n’ime ha anaghị egbu oge iso ndị ọzọ na-eme ihe ha na-eme, otú ahụ ịnyịnya na-anaghị egbu oge agbaga n’ọgbọ agha.   Ụgbala ọcha* ma oge o kwesịrị iji fega ebe ọzọ. Nduru, elekentịọba, na nza* na-efelata n’oge ha kwesịrị ifelata. Ma, ndị m amaghị mgbe mụnwa bụ́ Jehova ga-ekpe ha ikpe.”+   ‘Gịnị mere unu ga-eji sị: “Anyị ma ihe, anyị makwa iwu* Jehova”? N’eziokwu, naanị ihe ndị odeakwụkwọ na-eji mkpịsị akwụkwọ+ ha ede bụ ihe na-abụghị eziokwu.   Ihere emeela ndị ma ihe.+ Ụjọ atụwala ha. A ga-ejidekwa ha. Ha ajụla okwu Jehova. Olee ụdị amamihe ha nwere? 10  N’ihi ya, m ga-akpọnye ndị nwoke ọzọ ndị nwunye ha,Nyekwa ndị ọzọ ubi ha.+ N’ihi na onye ọ bụla n’ime ha na-eji aghụghọ achọ ihe ga-abara naanị ya uru, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu.+ Onye ọ bụla n’ime ha na-egwu wayo, ma onye amụma ma onye nchụàjà.+ 11  Ha na-achọ ịgba ndị m ọkpụkpụ, ma ha ejighị ya kpọrọ ihe. Ha na-asị,“Udo dị! Udo dị!” Mgbe udo na-adịghị.+ 12  Ihere ọ̀ na-eme ha na ọ bụ arụ ka ha mere? Ihere anaghị eme ha ma otu. Ha amaghịdị ihe bụ́ ihere ime mmadụ.+ N’ihi ya, ha ga-eso ndị dara ada daa. Ha ga-ada mgbe m ga-ata ha ahụhụ.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 13  Jehova kwukwara, sị, ‘Mgbe m ga-achịkọta ha, m ga-ebibi ha. Mkpụrụ ọ bụla agaghị afọ n’osisi vaịn na n’osisi fig. Akwụkwọ ha ga-akpọnwụkwa. Ha ga-agbara aka ihe m nyere ha.’” 14  “Gịnị ka anyị nọ ọdụ ebe a na-eme? Ka anyị zukọta banye n’obodo a rụsiri ike,+ ma nwụọ ebe ahụ. N’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ebibi anyị. Ọ na-enye anyị mmiri e tinyere nsí ka anyị ṅụọ,+N’ihi na anyị emehiela Jehova. 15  Anyị nọ na-atụ anya udo, ma e nweghị ihe ọma merenụ. Anyị nọ na-atụ anya ka a gwọọ anyị, ma ezigbo ụjọ jidere anyị.+ 16  A na-anụ ka ịnyịnya ndị iro na-eku ume ọkụ ọkụ na Dan. Ubé oké ịnyịnya ndị iro na-ebeNa-eme ka ala a niile na-ama jijiji. Ndị iro abatala ibibi ala a na ihe niile dị na ya. Ha abatala ibibi obodo a na ndị bi na ya.” 17  “M na-ezitere unu agwọ,Ya bụ, agwọ ọjọọ ndị a na-agaghị aratali. Ha ga-atakwa unu.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 18  A gaghị akwụsịli uju m na-eru. Obi agbawaala m. 19  Ndị m nọ n’ala dị anyaNa-eti mkpu ka e nyere ha aka, sị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị na Zayọn? Ka ọ̀ bụ na eze Zayọn anọghị n’ime ya?” “Gịnị mere ha ji na-akpasu m iwe, na-efe arụsị ha a pịrị apịNa chi na-abaghị uru ndị mba ọzọ na-efe?” 20  “Oge e ji ewe ihe ubi agafeela, oge ọkọchị agafeekwala,Ma a zọpụtabeghị anyị.” 21  Ahụ́ ndị m merụrụ na-agbawa m obi.+ Ike ụwa agwụla m. Ezigbo ụjọ ejidela m. 22  Ọ̀ bụ na mmanụ balsam* adịghị na Gilied?+ Ka ọ̀ bụ na e nweghị onye na-agwọ ọrịa na ya?+ Gịnị mere ndị m agbakebeghị?+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ihe ndị dị n’eluigwe.”
Ma ọ bụ “Shekeleke.”
O nwere ike ịbụ, “okwolo.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “mmanụ na-agwọ ọrịa.”