Job 10:1-22
10 “Ndụ m agwụla m ike.+
M ga-ekwupụta ihe na-enye m nsogbu n’obi.
M ga-ekwu okwu n’ihi otú ahụhụ m na-ata si ewute m.
2 M ga-asị Chineke, ‘Ekwula na ikpe mara m.
Gwa m ihe mere i ji na-esesa m okwu.
3 Ọ̀ baara gị uru na ị na-emesi m ike,Na ị kpọrọ ọrụ aka gị asị,+Ma na-anabata ndụmọdụ ndị ajọ omume?
4 Ọ̀ bụ anya mmadụ ka i nwere,Ka ị̀ na-ahụ ihe otú mmadụ efu si ahụ?
5 Ụbọchị ole ị na-adị ndụ ọ̀ bụ ụbọchị ole mmadụ efu na-adị ndụ,Ka afọ ole ị na-adị ndụ ọ̀ bụ afọ ole mmadụ na-adị ndụ,+
6 Nke mere ị ga-eji na-enyopụta ihe ọjọọ m mereMa na-achọgharị ka ị hụ mmehie m?+
7 Ị ma na aka m dị ọcha.+
E nweghịkwa onye nwere ike ịnapụta m n’aka gị.+
8 Ọ bụ aka gị ka i ji kpụọ m ma kee m.+
Ma ugbu a, ị na-achọ ibibi m kpamkpam.
9 Biko, cheta na ọ bụ ájá ka i ji kpụọ m.+
Ma ugbu a, ị na-eme ka m laghachi n’ájá.+
10 Ọ̀ bụ na i tinyeghị m n’afọ nne m,Ma kpụọ m n’ebe ahụ?*
11 I yiwere m anụ ahụ́ na akpụkpọ ahụ́ ka uwe,Jirikwa ọkpụkpụ na akwara jikọta m.+
12 I nyela m ndụ, gosikwa m na ị hụrụ m n’anya.
Nlekọta ị na-elekọta m echebela ndụ* m.+
13 Ma i bu n’obi ime m ihe ndị a na nzuzo.
Ama m na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a.
14 Ọ bụrụ na mụ emee mmehie, ị ga na-ele m anya,+Ị gaghịkwa ahapụ ịta m ahụhụ mmehie m.
15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, nke m agwụla.
Ọ bụrụgodị na aka m dị ọcha, m ga-ekpudo ihu n’ala,+N’ihi na ihere emegbuola m, ahụhụ zukwara m ahụ́.+
16 Ọ bụrụ na m welite isi m elu, ị na-achụgharị m otú ọdụm si achụ nta anụ,+Ị na-ejikwa ike gị emekpa m ahụ́.
17 Ị na-akpọta ndị ọhụrụ ga-agbagide m akaebe.
Ị na-ewesakwu m iwe,Ihe ana-esikwuru m ike.
18 Gịnịzi mere i ji si n’akpa nwa nne m kupụta m?+
Ọ gaara akara m mma na m nwụrụ tupu onye ọ bụla ahụ m anya.
19 Ọ gaara adị ka e nweghị mgbe m dịtụrụla ndụ.
A gaara esi n’akpa nwa kuru m kuba n’ili.’
20 Ọ̀ bụ na ụbọchị ndụ m adịghị ole na ole?+ Ya hapụ m aka.
Ya wepụ anya ya n’ebe m nọ, ka m kurutụ ume*+
21 Tupu mụ agawa n’ebe ọ ga-abụ m gaa, agaghịzi m alọta,+N’ala kacha gbaa ọchịchịrị,+
22 N’ala gbara itiri,N’ala oké ọchịchịrị na ọgba aghara,N’ebe ìhè ya dị ka itiri.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ọ̀ bụ na ị wụpụghị m ka mmiri ara ehi, meekwa ka m kpụkọta ọnụ ka chiiz?”
^ Na Hibru, “mmụọ.”
^ Ma ọ bụ “m gbasapụtụ ihu.”