Job 11:1-20

  • Okwu mbụ Zofa kwuru (1-20)

    • Ọ sịrị na okwu Job abaghị uru (2, 3)

    • Ọ gwara Job ka o sepụ aka n’ihe ọjọọ (14)

11  Zofa+ onye Neama kwuru, sị:   “À ga-ahapụ ịza gị ihe a niile ị na-ekwu,Ka ọtụtụ okwu ọ̀ ga-eme ka ị bụrụ onye ezi omume?   Okwu na-abaghị uru ị na-ekwu ọ̀ ga-eme ka ndị mmadụ mechie ọnụ? Ọ̀ bụ na e nweghị onye ga-abara gị mba maka okwu mkparị ị na-ekwu?+   N’ihi na ị sịrị, ‘Ihe m na-akụzi dị mma,+Adịkwa m ọcha n’anya gị.’+   Ma, ọ dị m ka ya bụrụ na Chineke ga-ekwu okwu,Megheekwa ọnụ ya gwa gị okwu.+   Ọ gaara eme ka ị mata ihe nzuzo ndị ga-eme ka ị mara ihe,N’ihi na onye ma ihe n’eziokwu na-aghọta ọtụtụ ihe. Ị gaara amata na Chineke chefuru ụfọdụ mmehie gị.   Ị̀ ga-achọpụtali amamihe Chineke nke dị omimi? Ka ị̀ ga-achọpụtali ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile?   Ọ dị elu karịa eluigwe. Gịnị ka ị ga-emeli? O miri emi karịa ili.* Gịnị ka ị ga-amatali?   O buru ibu karịa ụwa,Saakwa mbara karịa oké osimiri. 10  Ọ bụrụ na ọ gafee jichie mmadụ, kpọọkwa onye ahụ ikpe,Ònye ga-akwụsịli ya? 11  N’ihi na ọ ma mgbe ndị mmadụ na-aghọ aghụghọ. Ọ hụ ihe ọjọọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị ama? 12  Ma, ọ bụ naanị mgbe jakị ọhịa ga-amụtali mmadụKa onye na-anaghị eche echiche ga-aghọta ihe. 13  Ọ dị m ka ya bụrụ na ị ga-edozi obi gị Ma gbasapụ aka gị rịọ Chineke arịrịọ. 14  Ọ bụrụ na ị na-etinye aka n’ihe ọjọọ, sepụ aka na ya,Ekwekwala ka a na-eme ihe ọjọọ n’ụlọikwuu gị. 15  Ị ga-enwezi ike iwelite ihu gị elu n’emeghị ihere,Ị ga-akwụsili ike n’atụghị egwu. 16  Ị ga-echefuzi nsogbu gị. Ị ga-echefu ya ka mmiri sọfere asọfe. 17  Ndụ gị ga-enwu gbaa karịa etiti ehihie. Ọchịchịrị ya ga-adị ka ụtụtụ. 18  Ị ga-enwe obi ike maka na i nwere olileanya,Ị ga-elegharịkwa anya ma dinara ala, obi eruo gị ala. 19  E nweghị onye ga-emenye gị ụjọ ma i dinara ala,Ọtụtụ ndị ga-achọkwa ka gị na ha dị ná mma. 20  Ma anya ndị ajọ omume agaghị ahụ ụzọ. Ha agaghị ahụ ebe ha ga-agbaga ka e chebe ha. Naanị olileanya ha ga-enwe bụ ọnwụ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.