Job 12:1-25

  • Job sara ihe a gwara ya (1-25)

    • “Unu akaghị m” (3)

    • “Abụrụla m onye ndị enyi ya ji eme ihe ọchị” (4)

    • ‘Chineke nwere amamihe’ (13)

    • Chineke karịrị ndị ikpe na ndị eze (17, 18)

12  Job wee sị:   “N’eziokwu, ọ bụ ununwa ma ihe,Amamihe ga-esokwa unu nwụọ.   Ma m na-aghọtakwa ihe. Unu akaghị m. Olee onye na-amaghị ihe ndị a?   Abụrụla m onye ndị enyi ya ji eme ihe ọchị,+Onye na-akpọ Chineke ka ọ za ya.+ Onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta bụzi onye e ji eme ihe ọchị.   Onye ihe na-agaziri na-achị ndị nsogbu bịaara ọchị,Na-eche na ọ bụ naanị ndị nọ ná nsogbu* ka ọdachi na-adakwasị.   Obi ruru ndị ohi ala n’ụlọikwuu ha,+E nweghịkwa onye na-enye ndị na-akpasu Chineke iwe nsogbu,+Bụ́ ndị na-ebu chi ha n’aka.   Ma, biko jụgodị ụmụ anụmanụ. Ha ga-akụziri gị ihe. Jụọkwa ụmụ nnụnụ, ha ga-akọrọ gị.   Ma ọ bụ, leruo ihe ndị dị n’ụwa anya.* Ha ga-akụziri gị ihe. Azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-akọkwara gị ya.   N’ime ihe ndị a niile, olee nke na-amaghịNa ọ bụ aka Jehova mere ihe a? 10  Ndụ ihe ọ bụla dị ndụNakwa ndụ* mmadụ ọ bụla dị ya n’aka.+ 11  Ọ̀ bụ na ntị anaghị atụle okwuOtú ire* si amata otú nri na-atọ?+ 12  Ọ̀ bụ na ndị agadi amaghị ihe?+ Ọ̀ bụ na ịdịte ndụ aka anaghị eme ka mmadụ na-aghọta ihe? 13  O nwere amamihe ma dị ike.+ Ọ na-aghọta ihe, na-emekwa ka uche ya mezuo.+ 14  Ọ kwatuo ihe, e nweghị ike ịrụghachi ya.+ O mechie ihe, e nweghị mmadụ nwere ike imeghe ya. 15  O jichie mmiri, ihe niile akpọọ nkụ.+ O mee ka mmiri zowe, mmiri eju n’ụwa.+ 16  O nwere ike, nweekwa ezigbo amamihe.+ Ọ bụ ya nwe onye na-eme mmehie nakwa onye na-eme ka mmadụ mehie. 17  Ọ na-eme ka ndị na-adụ ndị mmadụ ọdụ gbara ụkwụ ọtọ,*Ọ na-emekwa ka ndị ikpe zuzuwe nzuzu.+ 18  Ọ na-atọpụ agbụ ndị eze kere ndị ọzọ,+Ọ na-ekekwa hanwa ájị̀ ndị ohu n’úkwù. 19  Ọ na-eme ka ndị nchụàjà gbara ụkwụ ọtọ,+Ọ na-akwatukwa ndị ọnụ na-eru n’okwu.+ 20  Ọ na-eme ka ndị a tụkwasịrị obi na ha ga-adụ ndị mmadụ ọdụ ghara ịma ihe ha ga-ekwu. Ọ na-eme ka ndị agadi gharazie inwe ezi uche. 21  Ọ na-eme ka a na-eleda ndị a ma ama anya,+Ọ na-emekwa ka ike gwụ ndị dị ike.* 22  Ọ na-eme ka a mata ihe ndị e zoro n’ọchịchịrị,+Ọ na-emekwa ka ìhè nwuo n’ebe gbara oké ọchịchịrị. 23  Ọ na-eme ka mba dị iche iche dị ike, ka o wee bibie ha. Ọ na-eme ka ala mba dị iche iche saa mbara, ka o wee mee ka a dọrọ ha n’agha. 24  Ọ na-eme ka ndị na-achị ndị mmadụ ghara ịghọta ihe,Na-emekwa ka ha na-agagharị n’ọzara ụzọ na-adịghị.+ 25  Ha na-asọ ìsì n’ọchịchịrị,+ n’ebe ìhè na-adịghị. Ọ na-eme ka ha na-adagharị ka ndị mmanya na-egbu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ndị ụkwụ ha na-ama jijiji.”
O nwere ike ịbụ, “gwa ụwa okwu.”
Na Hibru, “mmụọ.”
Na Hibru, “okpo ọnụ.”
Ma ọ bụ “gbara aka ihe niile.”
Na Hibru, “na-atọpụ ájị̀ ndị dị ike kere.”