Job 13:1-28

  • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-28)

    • ‘Ọ ga-akara m mma ka m gwa Chineke okwu’ (3)

    • “Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru” (4)

    • “Ama m na aka m dị ọcha” (18)

    • Ọ jụrụ ihe mere Chineke ji were ya ka onye iro (24)

13  “N’eziokwu, anya m ahụla ihe a niile. Ntị m anụla ya ma ghọta ya.   Ama m ihe unu ma. Unu akaghị m.   Ma, ọ ga-akara m mma ka m gwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile okwu. M chọrọ ịzara ọnụ m n’ihu Chineke.+   Ma unu na-aghagide m ụgha. Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru.+   A sị nnọọ na unu ga-agbachi nkịtị,Ọ ga-egosi na unu ma ihe.+   Biko, geenụ ntị n’ihe m na-ekwu,Ṅaakwanụ ntị n’arịrịọ m na-arịọ.   Ùnu ga-ekwu ihe na-ezighị ezi ka unu wee gbachitere Chineke? Ùnu ga-ekwukwa okwu aghụghọ ka unu wee kwuchitere ya?   Ùnu ga-adụnyere ya úkwù?* Ùnu ga-ekpechitere ezi Chineke ọnụ ya?   Ọ bụrụ na o leruo unu anya, ihe ọ ga-ahụ ọ̀ ga-adị ya mma?+ Ùnu ga-aghọ ya aghụghọ otú unu ga-aghọ mmadụ efu aghụghọ? 10  E nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịbara unu mbaMa ọ bụrụ na unu na-eme ka à ga-asị na unu na-adụnyere ya úkwù.+ 11  Ọ̀ bụ na ebube ya agaghị emenye unu ụjọ,Ụjọ ya ejidekwa unu? 12  Okwu amamihe unu na-ekwu enweghị isi na ọdụ.* Ihe ndị unu na-ekwu abaghị uru otú ọta e ji ájá kpụọ na-abaghị uru. 13  Gbachienụ nkịtị ka m kwuo okwu. Ka ihe ọ bụla ga-eme m mee m. 14  Gịnị mere m ji etinye onwe m ná nsogbu,* Na-emekwa ihe nwere ike ịta isi m? 15  M ga-echere n’agbanyeghị na o nwere ike igbu m.+ M ga-azara ọnụ m n’ihu ya. 16  Ọ ga-azọpụtazi m,+N’ihi na onye ọ bụla na-anaghị asọpụrụ ya* agaghị abata n’ihu ya.+ 17  Geenụ ntị nke ọma n’okwu m. Tinyekwanụ uche n’ihe m na-ekwu. 18  Lee, akwadebela m ihe m ga-ekwu iji zara ọnụ m. Ama m na aka m dị ọcha. 19  Ònye ga-agbagha ihe m na-ekwu? M ga-anwụ ma m gbachi nkịtị.* 20  Chineke, biko, meere m ihe abụọ a*Ka m ghara izoro gị onwe m: 21  Wepụ aka gị nke na-anyị arọ n’ahụ́ m ma mee ka ọ dị anya n’ebe m nọ,Ekwekwala ka ụjọ gị jide m.+ 22  Kpọọ m ka m zaMa ọ bụkwanụ ka m kwuo okwu ka ị za m. 23  Olee ihe ọjọọ m mere, oleekwa mmehie m mere? Mee ka m mara iwu m dara na mmehie m mere. 24  Gịnị mere i ji na-ezoro m ihu gị+Ma na-ewere m ka onye iro gị?+ 25  Ị̀ ga-agbalị ka i menye ahịhịa ifufe na-ebugharị ụjọ,Ka ị̀ ga na-achụ ahịhịa ọka kpọrọ nkụ ọsọ? 26  N’ihi na ị nọ na-ede ihe ndị i ji ebo m ebubo dị iche iche,Ị na-emekwa ka m taa ahụhụ maka mmehie ndị m mere mgbe m bụ okorobịa. 27  I tinyela ụkwụ m n’ọtọsị. Ị na-enyocha ụzọ m niile,Ị na-enyochakwa ebe ọ bụla m zọnyere ụkwụ. 28  N’ihi ya, mmadụ* na-ere ure ka ihe mebiri emebi,Ka uwe nke egu* na-atakasị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ùnu ga-asọ ya anya?”
Na Hibru, “bụ ilu ntụ.”
Na Hibru, “Gịnị mere m ji atagide anụ ahụ́ m ezé?”
Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife ya fewe chi ọzọ.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mmadụ omume, m ga-agbachi nkịtị nwụọ.”
Na Hibru, “Naanị ihe abụọ ka ị na-agaghị eme m.”
Na Hibru, “ọ.” O nwere ike ịbụ Job ka a na-ekwu.
N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.