Job 14:1-22

  • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-22)

    • Mmadụ anaghị ebite ndụ aka, nsogbu na-ezukwa ya ahụ́ (1)

    • “Osisi nwedịrị olileanya” (7)

    • “A sị nnọọ na ị ga-ezo m n’ili” (13)

    • “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” (14)

    • Ọrụ aka Chineke ga-agụ ya agụụ (15)

14  “Mmadụ nwaanyị mụrụAnaghị ebite ndụ aka,+ nsogbu na-ezukwa ya ahụ́.+   Ọ na-apụta ka okooko osisi, mechaa kpọnwụọ.*+ Ọ na-agafe ọsọ ọsọ ka onyinyo ma pụọ n’anya.+   N’eziokwu, ị nọ na-ele ya anya,Ị na-akpọkwa ya* ka gị na ya kpee ikpe.+   È nwere onye na-adịghị ọcha ga-amụtali onye dị ọcha?+ E nweghị.   Ọ bụrụ na e kpebiela ụbọchị ole ọ ga-adị ndụ,Ọnwa ole ọ ga-adị ndụ dị gị n’aka. I kpebiela oge ọ ga-anọru ka ọ ghara ịgafe ya.+   Wepụ anya gị n’ebe ọ nọ ka o zuru ike,Ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu, otú onye ọrụ e goro ego si arụcha ọrụ ya n’ụbọchị.+   N’ihi na osisi nwedịrị olileanya. Ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epulite ọzọ,Ome ya ka ga na-etokwa.   Ọ bụrụ na mgbọrọgwụ ya emee ochie n’ime ala,Ọ bụrụkwa na úkwù ya anwụọ n’ime ájá,   Ọ ga-epulite ma mmiri metụ ya. Ọ ga-awakwa alaka ka osisi puru ọhụrụ. 10  Ma mmadụ na-anwụ, tọgbọrọ n’enweghị ike. Mmadụ kubie ume, olee ebe ọ nọ?+ 11  Mmiri na-ata n’oké osimiri,Mmiri na-asọpụcha n’osimiri, osimiri ataa. 12  Mmadụ na-edinakwa ala ma ghara ibili.+ Ọ gaghị ebili ruo mgbe eluigwe na-adịghịzi,A gaghịkwa akpọte ya n’ụra.+ 13  A sị nnọọ na ị ga-ezo m n’ili,*+Na ị ga-ezo m ruo mgbe iwe gị dajụrụ,Na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru, gị echeta m.+ 14  Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?+ M ga-echere n’oge niile a manyere m ichere,Ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m.+ 15  Ị ga-akpọ òkù, m ga-azakwa gị.+ Agụụ ọrụ aka gị ga na-agụsi gị ike. 16  Ma ka ọ dị ugbu a, ị na-agụ ije ụkwụ m niile ọnụ. Ị na-ele anya ka ị hụ naanị mmehie m. 17  I kechiela ihe ọjọọ m mere n’akpa,I jikwa mgbá nyachie ya ka mmehie m dịrị na ya. 18  Otú ahụ ugwu na-ada, kụrisịa,E bupụkwa oké nkume n’ebe ọ dị, 19  Otú ahụ mmiri na-erichasị nkume,Idei mmiri ebupụkwa ájá dị n’ala,Otú ahụ ka ị na-eme ka olileanya mmadụ efu laa n’iyi. 20  Ị na-emerigide ya ruo mgbe ọ lara n’iyi.+ Ị na-agbanwe otú ọ dị, ị na-ezipụkwa ya. 21  A na-akwanyere ụmụ ya ùgwù, ma ọ naghị ama. Ọ naghị ama mgbe a na-ejighịzi ha kpọrọ ihe.+ 22  Ọ bụ naanị mgbe ọ nọ ndụ ka ihe na-afụ ya ụfụ. Ọ bụ naanị mgbe ọ nọ ndụ ka ọ na-eru uju.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “e mechaa, e gbupụ ya.”
Na Hibru, “m.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.