Job 15:1-35

  • Okwu nke abụọ Elifaz kwuru (1-35)

    • O kwuru na Job anaghị atụ egwu Chineke (4)

    • O kwuru na Job dị mpako (7-9)

    • ‘Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi’ (15)

    • ‘Ọ bụ onye ajọ omume na-ata ahụhụ’ (20-24)

15  Elifaz+ onye Timan kwuru, sị:   “Onye ma ihe ọ̀ ga-ekwu ihe na-enweghị isi ma ọ sawa okwu,Ka ọ̀ ga-eme ka echiche ọjọọ* ju n’obi ya?   Ọ baghị uru iji okwu na-enweghị isi adọ mmadụ aka ná ntị,Ikwu naanị okwu abaghịkwa uru ọ bụla.   N’ihi na ị na-eme ka a ghara ịna-atụ egwu Chineke,Ị na-emekwa ka ndị ọzọ ghara ịna-atụgharị uche n’ihe gbasara Chineke.   N’ihi na ọ bụ mmehie gị mere i ji ekwu ihe ndị a,Ọ bụkwa okwu e ji aghọgbu mmadụ ka ị họọrọ ikwu.   Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị m. Okwu ọnụ* gị na-agbagide gị akaebe.+   Ọ̀ bụ gị bụ mmadụ mbụ a mụrụ,Ka è bu ụzọ mụọ gị tupu e kee ugwu?   Ị̀ na-anụ okwu Chineke na-ekwu na nzuzo,Ka ì chere na ọ bụ naanị gị ma ihe?   Gịnị ka ị ma anyị na-amaghị?+ Gịnị ka ị ghọtara anyị na-aghọtaghị? 10  E nwere ma ndị isi awọ́ ma ndị agadi n’ime anyị,+Bụ́ ndị tọkasịrị nna gị ahụ́. 11  Obi Chineke na-akasi gịMa ọ bụ okwu e ji nwayọọ gwa gị ó zughịrị gị? 12  Gịnị mere obi gị ji arafu gị? Gịnịkwa mere i ji na-achakasị anya n’iwe? 13  N’ihi na ọ bụ Chineke ka ị na-ewesa iwe,I kwekwara ka okwu ndị a si n’ọnụ gị na-apụta. 14  Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere aka ya ga-eji dị ọcha? Oleekwa otú onye ọ bụla nwaanyị mụrụ ga-esi bụrụ onye ezi omume?+ 15  Lee, ọ tụkwasịghị ndị nsọ ya obi,Eluigwe adịghịdị ọcha n’anya ya,+ 16  Ma ya fọdụzie mmadụ nke na-eme ihe rụrụ arụ, onye ọ kpọkwara asị,+Onye na-aṅụ ajọ omume ka mmiri. 17  M ga-agwa gị ya. Gee m ntị. M ga-akọ ihe m hụrụ, 18  Ihe ndị ma ihe kọrọ,+Ihe ndị nna ha kọọrọ ha, nke ha na-ezochighị ezochi. 19  Ọ bụ naanị ha ka e nyere ala,E nweghịkwa onye mbịarambịa batara n’ala ha. 20  Onye ajọ omume nke dị aka ike na-ata ahụhụ n’ụbọchị ndụ ya niile. Ọ na-ata ahụhụ n’afọ niile ọ nọ ndụ. 21  Ntị ya na-anụ ụda na-emenye ụjọ.+ N’oge udo, ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ na-abịa na nke ya. 22  O kwetaghị na ya ga-esi n’ọchịchịrị pụta.+ Mma agha na-echere ya. 23  Ọ na-agagharị na-achọ nri,* na-asị: “Olee ebe ọ dị?” Ọ ma nke ọma na ụbọchị ọchịchịrị ga-agbachibido ya dị nso. 24  Ụjọ ga na-atụ ya n’ihi ahụhụ ọ na-ata na nsogbu ọ nọ na ya. Ahụhụ na nsogbu na-emesi ya ike otú eze nke jikeere ịlụ agha si emesi ndị iro ya ike. 25  N’ihi na ọ na-eweli aka ya ka ọ maa Chineke aka,Ọ na-achọkwa igosi na ọ ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ike. 26  O buuru nnukwu ọta ya siri ike,Mere isi ike gawa ka ọ maa ya aka. 27  Abụba juru ya ihu,Úkwù ya makwara abụba. 28  O bi n’obodo dị iche iche a ga-ebibi ebibi,N’ụlọ ndị a na-enweghị onye ga-ebi na ha,Bụ́ ndị ga-aghọ ikpo nkume. 29  Ọ gaghị aba ọgaranya. Akụ̀ ya agaghị ebukwu ibu,Ihe ndị o nwere agaghịkwa adịrị gawa. 30  Ọ gaghị esi n’ọchịchịrị pụta. Ire ọkụ ga-eme ka ome ya* kpọnwụọ,Ikuku nke si n’ọnụ Chineke* ga-eburu ya bufuo.+ 31  Ka ọ ghara iduhie onwe ya ma tụkwasị ihe na-abaghị uru obi,N’ihi na ihe ọ ga-enweta na ya agaghị aba uru. 32  Ihe a ga-eme ya n’oge na-adịghị anya. Alaka ya agaghịkwa ama pokopoko.+ 33  Ọ ga-adị ka osisi vaịn nke na-enwopụsị mkpụrụ ya na-achaghị acha,Dịkwa ka osisi oliv nke ifuru ya na-adapụsị. 34  N’ihi na ebe ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-ezukọ tọgbọ chakoo,+Ọkụ ga-erepịakwa ụlọikwuu ndị na-anara aka azụ.* 35  Ha na-akpa nkata ọjọọ n’obi ha nke na-eme ka ha na-eme ihe ọjọọ. Ihe ha na-eche mgbe niile bụ otú ha ga-esi aghọ aghụghọ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ.” Ifufe a na-ekpo ọkụ. Ọ na-esi n’ala ịkpa.
Na Hibru, “Egbugbere ọnụ.”
Na Hibru, “achịcha.”
Ya bụ, olileanya ọ bụla o nwere na ihe ga-adịghachiri ya mma.
Na Hibru, “n’ọnụ ya.”
Ma ọ bụ “ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”
Ma ọ bụ “na-eri ngarị.”