Job 16:1-22

  • Job sara ihe a gwara ya (1-22)

    • “Kama unu ga-akasi m obi, unu na-akpatakwuru m nsogbu” (2)

    • O kwuru na Chineke lekwasịrị ya anya ka ọ taa ya ahụhụ (12)

16  Job kwuru, sị:   “Anụbuola m ọtụtụ ihe yiri ihe ndị a. Kama unu ga-akasi m obi, unu na-akpatakwuru m nsogbu.+   Okwu na-enweghị isi ọ̀ na-agwụkwa agwụ? Gịnị mere i ji ekwu okwu otú a?   A sị na ọ bụ unu ka ihe a mere m mere,M nwere ike ikwu okwu otú unu si ekwu,M nwekwara ike ịkatọ unu,Fufeekwara unu isi.+   Ma kama ime otú ahụ, m ga-eji okwu ọnụ m gbaa unu ume. M ga-agwa unu okwu ga-akasi unu obi ka unu nwetatụ ume.+   Ọ bụrụ na m kwuo okwu, ọ naghị eme ka ahụ́ kwụsịtụ igbu m mgbu,+Ọ bụrụkwa na mụ akwụsị ikwu okwu, ọ̀ na-eme ka ahụ́ kwụsịtụ igbu m mgbu?   Ma ugbu a, Chineke emeela ka ike gwụ m.+ O bibiela ezinụlọ m niile.*   I jichikwara m, o wee bụrụ ihe akaebe,Nke mere na ahụ́ m tara na-agbagide m akaebe.   O ji iwe ya dọrisie m, ọ na-ebukwara m iwe n’obi.+ Ọ na-ata ikikere ezé n’ihi iwe ọ na-ewesa m. Onye iro m na-ele m anya ọjọọ.+ 10  Ha emegheela ọnụ ha ka ha loo m.+ Ha amaala m ụra na ntì ma jiri m mee ihe ọchị. Ha agbakọtala n’ìgwè ka ha mesie m ike.+ 11  Chineke enyefeela m n’aka ụmụ okorobịa,Ọ tụbakwala m n’aka ndị ajọ omume.+ 12  M tụsaara ahụ́, ma ọ kụriri m.+ O jidere m n’azụ olu m gwerie m. O lekwasịrị m anya ka ọ taa m ahụhụ. 13  Ndị na-agbara ya ụta gbara m gburugburu.+ Ọ gbapuola akụrụ m,+ o meteghịkwara m ebere. Ọ wụpụla elo* m n’ala. 14  Ọ na-etipusị m ahụ́ otú e si etipu mgbidi. Ọ na-eji ọsọ abịa alụso m ọgụ ka onye agha. 15  Adụkọtala m ákwà iru uju ka m jiri ya kpuchie ahụ́ m.+ Ùgwù* m alaala nke na m na-anọzi n’ájá.*+ 16  Ihu m na-achazi ọbara ọbara n’ihi ákwá m na-ebe,+Oké ọchịchịrị agbachiekwala mbubere anya m, 17  N’agbanyeghị na e nweghị ihe ọjọọ m mere,M jikwa obi ọcha ekpe ekpere. 18  Ala, biko, ekpuchila ọbara m.+ Ka a gharakwa inwe ihe ga-eme ka ákwá m na-ebe kwụsị. 19  Ma ugbu a, onye na-agbara m akaebe nọ n’eluigwe. Onye nwere ike ịgbara m akaebe nọ n’ebe dị n’elu. 20  Ndị enyi m na-achị m ọchị+Mgbe m na-ebesara Chineke ákwá.*+ 21  Ka mmadụ kpeere mụ na Chineke ikpe,Otú mmadụ si ekpere mmadụ na ibe ya ikpe.+ 22  N’ihi na ọ bụ afọ ole na ole fọrọ,M ga-agakwa ebe ọ ga-abụ m gaa, agaghịzi m alọghachi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị mụ na ha na-ezukọta.”
Ma ọ bụ “ihe dị n’akpa ilu.”
Ma ọ bụ “Ike.”
Na Hibru, “Eliela m mpi m n’ájá.”
O nwere ike ịbụ, “Mgbe m na-ele Chineke anya n’ehighị ụra.”