Job 17:1-16

  • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-16)

    • “Ndị na-akwa mmadụ emo gbara m gburugburu” (2)

    • “O meela ka m bụrụ onye ndị mmadụ ji eme ihe ọchị” (6)

    • “M ga-agazi biri n’ili” (13)

17  “Obi agbawaala m. Anwụọla m anwụọ. Ili na-echere m.+   Ndị na-akwa mmadụ emo gbara m gburugburu,+Anya m na-elekwa otú ha si enupụ isi.   Biko, kwe m nkwa na ị ga-akwado m. È nwere onye ọzọ ga-enyere m aka?+   N’ihi na i meela ka ha ghara ịna-aghọta ihe.+ Ọ bụ ya mere na ị naghị ebuli ha elu.   Ha nwere ike ịgwa ndị enyi ha ka ha na ha kee ihe ndị ha nwere,Ma agụụ ana-eme ka ụmụ ha ghara ịhụcha ụzọ.   O meela ka m bụrụ onye ndị mmadụ ji eme ihe ọchị,*+Mụ abụrụzie onye ha na-agbụ asọ mmiri n’ihu.+   Uju m na-eru emeela ka anya m na-ahụzi inyoghi inyoghi.+ Aka m abụọ na ụkwụ m abụọ adịghịzi otú ha dịbu.   Ndị ezi omume kporopụrụ anya na-ele ihe a na-emenụ,Obi na-ajọkwa onye aka ya dị ọcha njọ n’ihi ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke.*   Onye ezi omume anaghị akwụsị ime ezi omume.+ Onye aka ya dị ọcha na-esikwu ike.+ 10  Ma, unu niile nwere ike ịbịa malitekwa ịrụ ụka,N’ihi na ahụbeghị m onye ma ihe n’ime unu.+ 11  Ndụ m agwụla agwụ.+ A kụghasịala ihe ndị dị m n’obi m chọrọ ime.+ 12  Ha na-agbanwe abalị ka ọ bụrụ ehihie,Na-asị, ‘Ebe ọ bụ na ọchịchịrị agbaala, chi abọwala.’ 13  Ọ bụrụ na mụ echere, m ga-agazi biri n’ili.*+ M ga-agbasa ihe ndina m* n’ọchịchịrị.+ 14  M ga-eji oké olu gwa olulu,*+ sị, ‘Ị bụ nna m!’ Gwakwa ikpuru, sị, ‘Ị bụ nne m na nwanne m nwaanyị!’ 15  Oleezi ebe olileanya m dị?+ Ònye chere na m nwere olileanya? 16  Ọ* ga-agbada banye n’ọnụ ụzọ ili,* bụ́ nke e mechiri emechi,Mgbe anyị niile ga-agbadakọta n’ájá.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ji atụ ilu.”
Ma ọ bụ “ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “àkwà m.”
Ma ọ bụ “ili.”
Ya bụ, olileanya m.
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.