Job 18:1-21

  • Okwu nke abụọ Bildad kwuru (1-21)

    • O kwuru ihe na-eme ndị ajọ omume (5-20)

    • Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job amaghị Chineke (21)

18  Bildad+ onye Shua kwuru, sị:   “Olee mgbe unu* ga-akwụsị ụdị okwu a unu na-ekwu? Gositụnụ na unu na-aghọta ihe ka anyị nwee ike ikwu okwu.   Gịnị mere unu ga-eji were anyị ka anụmanụ,+Na-elekwa anyị anya ka ndị iberiibe?*   Ọ bụrụgodị na iwe ị na-ewe emee ka ị dọrie onwe gị,*À ga-agbapụrụ gị n’ụwa,Ka oké nkume ọ̀ ga-esi n’ebe ọ dị pụọ?   N’eziokwu, a ga-emenyụ ọkụ onye ajọ omume,Ire ọkụ ya agaghịkwa enwu.+   Ọkụ nke na-enwu n’ụlọikwuu ya ga-agba ọchịchịrị,A ga-afụnyụkwa ọkụ* o konyere n’ụlọikwuu ya.   A ga-eme ka otú o si azọsi ụkwụ ike n’ala belata,Atụmatụ ya ga-emekwa ka ọ daa.+   N’ihi na ụkwụ ya ga-eduba ya n’ụgbụ. Ọ ga-agara banye na ya.   Ọnyà ga-ama ya n’ikiri ụkwụ. Ọnyà ga-ejide ya.+ 10  E zoro ụdọ n’ala ka e jiri ya jide ya,E sikwara ọnyà n’ebe o si agafe. 11  Ihe niile gbara ya gburugburu na-emenye ya ụjọ,+Ụjọ na-emekwa ka ọ nọrọ n’ọsọ mgbe niile. 12  Ike na-agwụ ya, Ọdachi+ ga-emekwa ka ọ na-adagharị.* 13  Ọrịa na-eri akpụkpọ ahụ́ ya. Ọrịa kacha njọ na-erichapụ aka ya na ụkwụ ya. 14  A ga-esi n’ụlọikwuu ya, bụ́ ebe obi ruru ya ala, kpụpụta ya+Kpọgara ya eze kacha emenye mmadụ ụjọ.* 15  Ndị ọbịa* ga-ebi n’ụlọikwuu ya. A ga-eji ọkụ* bibie ụlọ ya.+ 16  Mgbọrọgwụ ya ga-akpọ nkụ n’ime ala,Alaka ya ga-akpọnwụkwa. 17  A gaghị na-echeta ya n’ụwa,A gaghịkwa ama aha ya* n’okporo ámá. 18  A ga-esi n’ìhè chụba ya n’ọchịchịrị,A ga-achụpụkwa ya n’ụwa. 19  Ọ gaghị enwe ụmụ na ụmụ ụmụ n’ebe ndị obodo ya bi,E nweghịkwa onye ga-afọrọ ya ndụ n’ebe o bi.* 20  N’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya, akpata oyi ga-awụ ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ,Egwu ga-ejidekwa ndị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. 21  Ọ bụ ihe na-eme ụlọikwuu onye na-eme ihe ọjọọ,Ọ bụkwa ihe na-eme ụlọ onye na-amaghị Chineke.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ Job, ndị dị ka ya, ma ọ bụ ndị na-emetara ya ebere.
O nwere ike ịbụ, “ndị na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “na-ete ụkwụ.”
Ya bụ, a ga-eme ka ọ nwụọ ọnwụ ike.
Na Hibru, “Ihe na-abụghị nke ya.”
Ma ọ bụ “sọlfọ na-ere ọkụ.”
Na Hibru, “Ọ gaghị enwe aha.”
Ma ọ bụ “n’ebe o bi ka mbịarambịa.”