Job 19:1-29

  • Job sara ihe a gwara ya (1-29)

    • Job weere mba ndị enyi ya baara ya ka ihe na-enweghị isi (1-6)

    • Ọ sịrị na a hapụla ya (13-19)

    • “Onye mgbapụta m dị ndụ” (25)

19  Job wee sị:   “Olee mgbe unu ga-akwụsị ịkpasu m* iwe,+Kwụsịkwa ikwu ihe na-agbawa m obi?+   Unu abaarala m mba* ugboro iri ugbu a. Ihere anaghị eme unu na unu na-emesi m ike.+   Ọ bụrụgodị na m mere mmehie,Ọ bụ n’isi m ka mmehie m dị.   Ọ bụrụ na unu ana-ebuli onwe unu elu,Na-ekwu na ihere nsogbu m nọ na ya na-ebutere m kwesịrị m,   Marazienụ na ọ bụ Chineke duhiere m,O jirikwala ụgbụ o ji achụ nta jide m.   M na-eti mkpu n’ihi ahụhụ m na-ata, ma e nweghị onye na-aza m.+ M na-arịọ ka e nyere m aka, ma e nweghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi.+   O ji nkume rụchie mgbidi n’ebe m si agafe, enweghịkwa m ike ịgafe. O meekwala ka ọchịchịrị gbachie okporo ụzọ m.+   O meela ka m gharazie inwe ùgwù,Kpupụkwa m okpueze n’isi. 10  O si n’akụkụ niile na-akụrisị m ruo mgbe ọ lara m n’iyi. Ọ na-eme ka m ghara inwe olileanya otú osisi e fopụrụ efopụ na-enweghị olileanya. 11  Ọ na-ewesa m iwe dị ọkụ,Ọ na-ewerekwa m ka onye iro ya.+ 12  Ndị agha ya abịakọtala ka ha lụso m agha,Ha gbakwara ụlọikwuu m gburugburu. 13  Ọ chụpụla ụmụnne m ka ha nọrọ m n’ebe dị anya,Ndị ma m esila n’ebe m nọ pụọ.+ 14  Ezigbo ndị enyi* m ahapụla m,Ndị m ma nke ọma echefuokwala m,+ 15  Ndị bịara n’ụlọ m+ na ndị ohu m nwaanyị weere m ka onye mbịarambịa. Abụ m onye mba ọzọ n’anya ha. 16  M na-akpọ onye na-ejere m ozi òkù, ma ọ naghị aza m. Eji m ọnụ m na-arịọ ya ka o metere m ebere.* 17  Ume m na-ekupụta na-asọzi nwunye m oyi,+M na-esikwa ụmụnne m* ísì ọjọọ. 18  Ụmụaka kpọdịrị m asị. M bilie ọtọ, ha na-amalite iji m eme ihe ọchị. 19  Ezigbo ndị enyi m niile kpọrọ m asị,+Ndị m hụrụ n’anya bụzi ndị iro m.+ 20  Abụzi m ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+ Ejisiri m ike gbanahụ ọnwụ.* 21  Ndị enyi m, meerenụ m ebere, meerenụ m ebere,N’ihi na Chineke ebiela m aka.+ 22  Gịnị mere unu ji na-akpagbu m otú Chineke si akpagbu m,+Na-emesi m ike n’akwụsịghị akwụsị?+ 23  Ọ gaara amasị m ma a sị na e dere okwu m ede,Ma a sị na e dere ya n’akwụkwọ. 24  Ọ gaara amasị m ma a sị na e ji mkpịsị ígwè na nkume led*Denye ya n’oké nkume ruo mgbe ebighị ebi. 25  N’ihi na o doro m anya na onye mgbapụta m+ dị ndụ. Ọ ga-emecha bịa guzoro n’elu ụwa.* 26  Mgbe e si otú a mebichaa akpụkpọ ahụ́ mN’oge m ka nọ ndụ, m ga-ahụ Chineke, 27  Bụ́ onye m ga-ahụ,Onye anya m ga-ahụ, ọ bụghị anya onye ọzọ.+ Ma, adaala m mbà n’obi.* 28  N’ihi na unu na-asị, ‘Olee otú anyị si na-akpagbu ya?’+ Ebe ọ bụ na nsogbu m si m n’aka. 29  Tụọnụ egwu mma agha,+N’ihi na mma agha na-ata onye mere mmehie ahụhụ. Unu kwesịrị ịma na e nwere onyeikpe.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “mkpụrụ obi m.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “akparịala m.”
Ma ọ bụ “Ndị ikwu.”
Ma ọ bụ “ka o nweere m ọmịiko.”
Na Hibru, “ụmụ afọ m,” ya bụ, ụmụ si n’afọ nne m.
Na Hibru, “Eji m akpụkpọ ezé m gbalaga.”
Ma ọ bụ “opu.”
Na Hibru, “guzoro n’elu ájá.”
Ma ọ bụ “Akụrụ m akwụsịla ịrụ ọrụ n’ime ahụ́ m.”