Job 20:1-29

  • Okwu nke abụọ Zofa kwuru (1-29)

    • O kwuru na Job kparịrị ya (2, 3)

    • Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job bụ onye ajọ omume (5)

    • O kwuru na ihe ọjọọ na-atọ Job ụtọ (12, 13)

20  Zofa+ onye Neama kwuru, sị:   “Obi ezughị m ike, obi erughịkwa m ala. Ọ bụ ya mere m ji chọọ ikwu okwu.   Anụla m mba a baara m, nke e ji kparịa m. Ihe m ghọtara na-emekwa ka m saa gị okwu.   O doro anya na ị ma ihe a kemgbe,N’ihi na ọ dị otú a kemgbe e kere mmadụ,*+   Na mkpu ọṅụ ndị ajọ omume na-eti anaghị adịte aka,Nakwa na ọ bụ naanị obere oge ka onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-aṅụrị ọṅụ.+   Ọ bụrụgodị na mpako ya ruru n’eluigwe,Isi ya ana-emetụkwa n’ígwé ojii,   Ọ ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi otú nsị ya si ala n’iyi. Ndị na-ahụbu ya ga-asị, ‘Olee ebe ọ nọ?’   A ga-echefu ya otú e si echefu nrọ. A ga-echefu ya otú e si echefu ọhụụ a hụrụ n’abalị.   Anya hụburu ya agaghị ahụ ya ọzọ,A gaghịkwa ahụ ya ọzọ n’ụlọ ya.+ 10  Ụmụ ya ga-arịọ ndị ogbenye ka ha meere ha amara,Ọ ga-ejikwa aka ya nyeghachi ndị ọzọ akụ̀ ọ naara ha.+ 11  Ike okorobịa juru ya ahụ́,Ma ike ka ga-eju ya n’ahụ́ ya anwụọ. 12  Ọ bụrụ na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ n’ọnụ,Ọ bụrụ na o zoo ya n’okpuru ire ya, 13  Ọ bụrụ na ọ kpụrụ ya n’ọnụ ya,Ya ana-atọ ya ụtọ, ọ chọghịkwa ilo ya ngwa ngwa, 14  Nri ahụ ga-agba ụka n’ime afọ ya. Ọ ga-adị ka elò agwọ ubí n’ime ahụ́ ya. 15  O loola akụnụba, ma ọ ga-agbọpụta ya. Chineke ga-eme ka o si n’afọ ya pụta. 16  Ọ ga-amịrị elò agwọ ubí. Ajụala ga-eji ezé ya tagbuo ya.* 17  Ọ gaghị ahụ mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi,Bụ́ ndị na-asọ ka iyi. 18  Ọ ga-eweghachi akụ̀ ọ kpatara, n’erighị ya eri. Ọ gaghị eri akụ̀ ọ na-akpata n’ahịa ọ na-azụ.+ 19  N’ihi na o chiela ndị ogbenye ọnụ n’ala, gbahapụkwa ha. O werela ụlọ ọ na-abụghị ya rụrụ. 20  Ma obi agaghị ezu ya ike. Akụnụba ya agaghị azọpụta ya. 21  E nweghị ihe ọ ga-anapụ mmadụ. Ọ bụ ya mere na ihe agaghị anọ na-agara ya nke ọma. 22  Mgbe akụnụba ya ga-eju ebe niile, ọ ga-echegbuwe onwe ya. Ihe ọjọọ niile ga-abịara ya. 23  Mgbe ọ na-eri ihe ka o rijuo afọ,Chineke* ga-ewesa ya ezigbo iwe,Mee ka iwe ya zuo ya ahụ́ ka ebe mmiri mazuru mmadụ ahụ́. 24  Mgbe ọ na-agbapụ ka ngwá agha ndị e ji ígwè rụọ ghara imerụ ya ahụ́,Ụta e ji ọla kọpa rụọ ga-agbapu ya ahụ́. 25  Ọ na-efopụ ụta a gbara ya n’azụ,Ụta na-egbu maramara a gbara ya n’elo* ya. Ụjọ na-ejide ya.+ 26  A ga-awụfu akụnụba ya niile n’ebe gbara oké ọchịchịrị. Ọkụ a na-enweghị onye fụnwuru ya ga-eregbu ya. Ọdachi ga-abịara onye ọ bụla fọrọ ndụ n’ụlọikwuu ya. 27  Eluigwe ga-ekpughe mmehie ya. Ụwa ga-emegide ya. 28  Idei mmiri ga-ebupụ ụlọ ya. Mmiri ga-ezosi ike n’ụbọchị iwe Chineke.* 29  Ọ bụ ihe a ka onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke. Ọ bụ ihe Chineke kwuru na a ga-ekenye ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ụmụ mmadụ; Adam.”
Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”
Na Hibru, “ire ya gbuo ya.”
Na Hibru, “Ọ.”
Ma ọ bụ “n’akpa ilu.”
Na Hibru, “ya.”