Job 21:1-34

  • Job sara ihe a gwara ya (1-34)

    • ‘Gịnị mere ihe ji agaziri ndị ajọ omume?’ (7-13)

    • O kwuru na ndị na-akasi ya obi ebughị ezigbo ihe n’obi (27-34)

21  Job wee sị:   “Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu,Ka ọ bụrụ otú unu ga-esi kasie m obi.   Nweerenụ m ndidi ka m kwuo okwu. M kwuchaa, unu nweziri ike ịkwa m emo.+   Ọ̀ bụ mmadụ ka m na-ekpesara? Ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ, ọ̀ bụ na ike inwe ndidi agaghị agwụ m?   Lewenụ m anya, ka akpata oyi wụọkwa unu n’ahụ́. Kpuchienụ aka n’ọnụ.   M chewe banyere ya, obi anaghị ezu m ike,Ahụ́ m niile na-amakwa jijiji.   Gịnị mere ndị ajọ omume ji adị ndụ,+Kaa nká, baakwa ọgaranya?*+   Ha na-ahụ ka ụmụ ha na-eto ghọọ mmadụ,Ha na-ahụkwa ụmụ ụmụ ha.   Udo na-adị n’ụlọ ha. Ụjọ anaghị atụ ha,+Chineke anaghịkwa ata ha ahụhụ. 10  Oké ehi ha na-agba nne ehi n’enweghị nsogbu ọ bụla. Nne ehi ha na-amụ ụmụ, ime anaghịkwa apụ ha. 11  Ụmụaka ha ndị nwoke na-agbagharị n’èzí otú ewu na atụrụ si agbagharị,Ụmụ ha na-awụgharịkwa. 12  Ha na-eji obere ịgbà na ụbọ akwara agụ egwú,Na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe ha na-anụ ụda ọjà.+ 13  Ha na-enwe obi ụtọ n’oge niile ha dị ndụ,Ha na-anwụkwa n’udo,* e lie ha n’ili.* 14  Ma ha na-asị ezi Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Anyị achọghị ịma ihe i nyere n’iwu.*+ 15  Ònye bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke mere anyị ga-eji fee ya?*+ Olee uru anyị ga-erite ma anyị na ya dịrị ná mma?’+ 16  Ma ama m na ọ bụghị ha na-eme ka ihe na-agaziri ha.+ Anaghị m eche echiche otú ndị ajọ omume si eche.+ 17  Ugboro ole ka e menyụrụla ọkụ* ndị ajọ omume?+ Ugboro ole ka ọdachi na-abịara ha? Ugboro ole ka Chineke jitụrụla iwe bibie ha? 18  È nwere mgbe ha na-adị ka ahịhịa ọka* ifufe na-ebugharị,Ma ọ̀ bụ ka mkpo ọka oké ifufe na-ebupụ? 19  Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe ọjọọ, Chineke ga-ata ụmụ ya ahụhụ ihe o mere. Ma ka Chineke kwụọ ya ụgwọ ihe o mere ka ọ hụ ya.+ 20  Ka o jiri anya ya hụ otú a ga-esi laa ya n’iyi,Ka ọ bụrụkwa ya ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-ewesa iwe ya.*+ 21  N’ihi na ọ bụrụ na ọ nwụchuo ọnwụ,È nwere ihe na-eme n’ụlọ ya ka gbasara ya?+ 22  È nwere onye ga-akụziri Chineke ihe,+Ebe ọ bụ Chineke na-ekpe ndị kacha elu ikpe?+ 23  Otu onye na-anwụ mgbe ike ndụ ka juru ya ahụ́,+Mgbe ọ na-enweghị ihe ọ bụla na-echegbu ya nakwa mgbe obi ruru ya ala,+ 24  Mgbe apata ụkwụ ya bụ abụba abụba,Mgbe ọkpụkpụ ya ka gbasikwara ike.* 25  Ma onye ọzọ na-atagide ahụhụ nwụọ,N’enweghị mgbe o kporiri ndụ. 26  Ha abụọ ga-alaghachi n’ájá,+Ikpuru ga-ekpuchikwa ha abụọ.+ 27  Lee, ama m ihe unu na-eche,Marakwa atụmatụ unu chọrọ iji mesie m ike.+ 28  N’ihi na unu na-asị, ‘Oleezi ụlọ onye ahụ a ma ama? Oleekwa ụlọikwuu onye ajọ omume bibu?’+ 29  Ọ̀ bụ na unu ajụbeghị ndị na-aga ebe dị iche iche ase? Ọ̀ bụ na unu anaghị echebara ihe ndị ha chọpụtara echiche nke ọma, 30  Na a na-ahapụ onye ọjọọ ndụ n’ụbọchị ọdachi, Napụtakwa ya n’ụbọchị oké iwe? 31  Ònye ga-ajụ ya ajụjụ maka ihe ọ na-eme? Ònyekwa ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere? 32  Mgbe a na-ebuga ya n’ebe a ga-eli ya,A ga-eche ili ya nche. 33  Ájá ndị e ji kpochie ya ga-atọ ya ụtọ,+Mmadụ niile na-esorokwa ya n’azụ*+ Ka imirikitiimi ndị bu ya ụzọ. 34  Gịnịzi mere unu ji jiri okwu na-enweghị isi na-akasi m obi?+ Ihe niile unu na-aza m bụ ụgha.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “bụrụkwa ndị ukwu.”
Ma ọ bụ “n’otu ntabi anya,” ya bụ, ha na-anwụ n’ataghị ahụhụ.
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ịmata ụzọ gị.”
Na Hibru, “jeere ya ozi.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “ga-aṅụ ọnụma Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”
Na Hibru, “Mgbe ụmị ọkpụkpụ ya ka dị mmiri mmiri.”
Na Hibru, “Ọ ga-adọkpụrụkwa mmadụ niile ka ha soro ya.”