Job 22:1-30

  • Okwu nke atọ Elifaz kwuru (1-30)

    • “È nwere uru mmadụ ga-abara Chineke?” (2, 3)

    • O kwuru na Job dị anyaukwu nakwa na o mesiri ndị ọzọ ike (6-9)

    • ‘Lọghachikwuru Chineke ka ihe dịrị gị ná mma’ (23)

22  Elifaz+ onye Timan kwuru, sị:   “È nwere uru mmadụ ga-abara Chineke? È nwere uru onye nwere nghọta ga-abara ya?+   Ọ̀ gbasara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile* na ị bụ onye ezi omume? Ka è nwere uru ọ na-erite na ị bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta?*+   Ọ̀ ga-ata gị ahụhụMa kpọọ gị ikpe maka na ị na-asọpụrụ ya?   Ọ̀ bụ na ọ bụghị maka na ihe ọjọọ ị na-eme karịrị akarị,Mmehie gị anaghịkwa akwụsị akwụsị?+   N’ihi na ị na-anara ụmụnne gị ihe ibé n’ihe ị na-ekwesịghị ịnara ihe ibé,Ị na-eyipụkwa ndị mmadụ ákwà ha ka ha gbara ọtọ.*+   Ị naghị enye onye ike gwụrụ mmiri ka ọ ṅụọ,Ị naghịkwa enye onye agụụ na-agụ nri.+   Ọ bụ onye ukwu nwe ala,+Ọ bụkwa onye a hụrụ n’anya na-ebi na ya.   Ma ị gbawara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ aka sị ha lawa,I mesikwara ụmụ na-enweghị nna* ike. 10  Ọ bụ ya mere e ji siere gị ọnyà* gburugburu,+Ụjọ na-atụkwa gị na mberede. 11  Ọ bụ ya mere ọchịchịrị ji gbachie nke na ị naghị ahụ ụzọ,Idei mmiri ekpuchiekwa gị. 12  Ọ̀ bụ na Chineke anọghị n’ebe kacha elu n’eluigwe? Lee, kpakpando niile dịkwa ezigbo elu. 13  Ma ị sịrị: ‘Gịnịdị ka Chineke ma? Urukpuru ọ̀ ga-ekwe ya hụ ụzọ kpee ikpe? 14  Ígwé ojii na-anọchi ya nke mere na ọ naghị ahụ ụzọKa ọ na-agagharị gburugburu eluigwe.’ 15  Ị̀ ga-esoro ụzọ ochieNke ndị ajọ omume jere ije na ya, 16  Ndị ọnwụ gburu tupu oge ha eruo Otú idei mmiri* si ebupụ ntọala ụlọ?+ 17  Ha nọ na-asị ezi Chineke: ‘Hapụ anyị aka!’ Na-asịkwa, ‘Gịnị ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-eme anyị?’ 18  Ma, ọ bụ ya mere ka ihe ndị dị mma ju n’ụlọ ha. (Anaghị m eche ụdị ihe ọjọọ a n’obi m.) 19  Onye ezi omume ga-ahụ ihe a ṅụrịa ọṅụ. Onye aka ya dị ọcha ga-akwa ha emo, sị: 20  ‘E bibiela ndị iro anyị,Ọkụ ga-erechapụkwa ihe fọrọ na ha.’ 21  Mata onye Chineke bụ, gị na ya ga-adị ná mma. Ihe ọma ga-eruzi gị aka. 22  Nabata iwu si n’ọnụ ya,Ka ihe o kwuru dịrịkwa n’obi gị.+ 23  Ọ bụrụ na ị lọghachikwuru Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ihe ga-adịghachiri gị ná mma.+ Ọ bụrụ na i wepụ ajọ omume n’ụlọikwuu gị, 24  Ọ bụrụ na ị ga-atụnye ọlaedo gị n’ájá,Tụbakwa ọlaedo kacha mma*+ ná nnukwu nkume ndị dị na ndagwurugwu, 25  Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-abụziri gị ọlaedo,Ọ ga-abụkwara gị ọlaọcha kacha mma. 26  Ị ga na-enwezi obi ụtọ maka na gị na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị ná mma,Ị ga-ewelikwa ihu gị lee Chineke. 27  Ị ga-arịọsi ya arịrịọ ike. Ọ ga-anụ olu gị. Ị ga-emezukwa nkwa i kwere. 28  Ihe ọ bụla i kpebiri ime ga-aga nke ọma,Ìhè ga na-enwukwa n’ụzọ gị. 29  N’ihi na a ga-eweda gị ala ma i kwuo okwu na-egosi na ị dị mpako. Ma ọ ga-azọpụta onye dị umeala n’obi. 30  Ọ ga-anapụta ndị na-enweghị ihe ha mere. N’ihi ya, ọ bụrụ na aka gị dị ọcha, ọ ga-anapụta gị.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ na-enwe obi ụtọ.”
Ma ọ bụ “ị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.”
Na Hibru, “Ị na-eyipụ ndị gba ọtọ ákwà ha.”
Ma ọ bụ “ụmụ na-enweghị nne na nna.”
Okwu Hibru a sụgharịrị ebe a pụtara ọnyà ma ọ bụ ụgbụ e ji ejide nnụnụ.
Na Hibru, “osimiri.”
Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”