Job 23:1-17

  • Job sara ihe a gwara ya (1-17)

    • Ọ chọrọ ịnọ n’ihu Chineke kwuo otú o si bụrụ na aka ya dị ọcha (1-7)

    • O kwuru na ya ahụghị Chineke (8, 9)

    • ‘Ahapụghị m ụzọ ya gawa ebe ọzọ’ (11)

23  Job wee sị:   “Taa, m ka ga-esi ọnwụ gwa unu otú obi dị m.+ Ike agwụla m n’ihi ude m na-asụ.   A sị nnọọ na m ma ebe m ga-ahụ Chineke,+M ga-aga n’ebe o bi.+   M ga-anọ n’ihu ya kwuo otú o si bụrụ na aka m dị ọcha,M ga-ekwukwa ọtụtụ ihe iji zara ọnụ m.   M ga-anụ ihe ọ ga-asa m,Marakwa ihe ọ ga-agwa m.   Ọ̀ ga-ekwuchi m ọnụ maka na ike ya dị ukwuu? Mbanụ! N’eziokwu, ọ ga-ege m ntị.+   N’ebe ahụ ka ya na onye ezi omume ga-edozi okwu,Onyeikpe m ga-ekwukwa na ikpe amaghị m.   Ma ọ bụrụ na m gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ, ọ gaghị anọ n’ebe ahụ. M lọghachikwa, agaghị m ahụ ya.   Ọ nọrọ n’aka ekpe na-arụ ọrụ, enweghị m ike ịhụ ya. Ọ tụgharịa gaa n’aka nri, anaghịkwa m ahụ ya. 10  Ma ọ ma na m na-aga n’ụzọ dị mma.+ Ọ nwalechaa m, m ga-adịzi ka ezigbo ọlaedo.+ 11  Ụkwụ m na-esochi nzọụkwụ ya anya. Ahapụghịkwa m ụzọ ya gawa ebe ọzọ.+ 12  Akwụsịghị m idebe iwu si ya n’ọnụ. Eji m ihe ndị o kwuru kpọrọ ihe+ karịadị otú a chọrọ ka m mee. 13  O kpebie ime ihe, ònye ga-egbochili ya?+ * chọọ ime ihe, ọ na-eme ya.+ 14  N’ihi na ọ ga-emecha m ihe niile o kpebiri ime m,E nwekwara ọtụtụ ihe yiri ihe ndị a bụ́ ndị ọ chọrọ ime m. 15  Ọ bụ ya mere m ji echegbu onwe m ma m cheta Chineke. M chewe banyere ya, egwu na-atụkwu m. 16  Chineke emeela ka obi na-amapụ m,Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emeekwala ka ụjọ na-atụ m. 17  Ma ọchịchịrị emebeghị ka m gba nkịtị,Itiri gbachiri m ihu emebeghịkwa ka m gba nkịtị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya.”