Job 24:1-25

  • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-25)

    • ‘Gịnị mere na Chineke ekpebibeghị oge ọ ga-ekpe ikpe?’ (1)

    • O kwuru na Chineke kwere ka ihe ọjọọ na-eme (12)

    • Ndị mmehie hụrụ ọchịchịrị n’anya (13-17)

24  “Gịnị mere na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekpebibeghị oge ọ ga-ekpe ikpe?+ Gịnị mere na ndị ma ya anaghị ahụ ụbọchị ahụ?   Ndị mmadụ na-ewela ihe e ji kpaa ókè azụ.+ Ha na-ezuru ìgwè ewu na atụrụ ma duru ha gaa n’ebe anụmanụ ha na-ata ahịhịa.   Ha na-akpụrụ jakị ụmụ na-enweghị nna,Na-anarakwa nwaanyị di ya nwụrụ oké ehi ya ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego ha binyere ya.+   Ha na-enupụ ndị ogbenye n’ụzọ. Ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka na-ezo ezo ma ha hụ ha.+   Ndị ogbenye na-achọgharị nri ka jakị ọhịa+ ndị nọ n’ala ịkpa. Ha na-aga n’ọzara achọ nri ụmụ ha ga-eri.   Ọ bụ n’ubi onye ọzọ ka ha na-aga enweta nri.* Ha na-aga n’ubi vaịn onye ajọ omume atụtụkọ ihe e wefọrọ ewefọ.   Ha na-agba ọtọ ehi ụra abalị, n’eyighị uwe.+ Ha enweghị ákwà ha ji achụ oyi.   Mmiri nke na-ezo n’ugwu na-ede ha ahụ́. Ha na-anọrọ n’akụkụ oké nkume maka na ha enweghị ebe ha ga-agbaba.   A na-esepụ nwa na-enweghị nna ọnụ n’ara.+ A na-achịrị uwe ndị ogbenye ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego e binyere ha,+ 10  Nke na-eme ka ha gbara ọtọ na-ejegharị, n’eyighị uwe,Agụụ ana-agụkwa ha ka ha na-ebu ùkwù ọka. 11  Ha na-anọ n’anwụ arụgbu onwe ha n’ọrụ n’agbata obere mgbidi ndị a rụrụ n’ubi ndị dị ná mkpọda ugwu.* Ha na-azọchapụta mmanya, ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.+ 12  Ndị na-anwụ anwụ na-asụ ude n’obodo. Ndị* merụrụ ezigbo ahụ́ na-ebe ákwá ka e nyere ha aka.+ Ma Chineke anaghị ewere ihe a ka ihe na-ekwesịghị ekwesị.* 13  E nwere ndị kpọrọ ìhè asị.+ Ha amaghị ụzọ ya,Ha anaghịkwa aga n’ụzọ ya. 14  Onye na-egbu mmadụ na-ebili n’isi ụtụtụ. Ọ na-egbu ogbenye nakwa onye na-enweghị onye na-enyere ya aka.+ Ma n’abalị, ọ na-aga ohi. 15  Onye na-akwa iko na-eche ka mgbede ruo,+ Na-asị, ‘E nweghị onye ga-ahụ m.’+ Ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16  Ha na-akụka* ụlọ mgbe ọchịchịrị gbara ma banye na ha. N’ehihie, ha na-akpọchibido onwe ha ụzọ. Ha anaghị apụta mgbe ìhè dị.+ 17  N’ihi na ụtụtụ na oké ọchịchịrị bụụrụ ha otu ihe. Ụjọ oké ọchịchịrị anaghị atụ ha. 18  Ma mmiri na-ebufu ha ngwa ngwa. A ga-abụ ala ha ketara ọnụ.+ Ha agaghị alọghachi n’ubi vaịn ha. 19  Otú oké ọkọchị na okpomọkụ si amịkọrọ mmiri snoo nke gbazere agbaze Ka ili* si eri ndị mere mmehie.+ 20  Nne ya* ga-echefu ya. Ikpuru ga-eri ya. A gakwaghị echeta ya.+ A ga-egbutukwa ndị ajọ omume otú e si egbutu osisi. 21  Ha na-erigbu nwaanyị aga,Na-emesikwa nwaanyị di ya nwụrụ ike. 22  Chineke* ga-eji ike ya bibie ndị ukwu. Ọ bụ eziokwu na ha nwere ike ịgbago n’ọkwá, ha ejighị ndụ ha n’aka. 23  Chineke* na-ahapụ ha ka obi sie ha ike, obi eruokwa ha ala,+Ma anya ya dị n’ihe niile ha na-eme.*+ 24  A na-ebuli ha elu obere oge. E mechaa, ha anaghịzi anọ.+ A na-eweda ha ala,+ ha anwụọ otú onye ọ bụla ọzọ si anwụ. A na-egbupụ ha otú e si egbupụ ụyọkọ ọka.* 25  Ugbu a, ònye ga-egosili na m bụ onye ụghaMa ọ bụ gbaghaa ihe m kwuru?”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “Ọ bụ n’ubi ka ha na-aga eweta nri anụ.”
O nwere ike ịbụ, “Ha na-azọchapụta mmanụ n’agbata obere mgbidi ndị a rụrụ n’ubi ndị dị ná mkpọda ugwu.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi dị iche iche.”
O nwere ike ịbụ, “Ma Chineke anaghị ekwu na e nwere onye mehiere.”
Na Hibru, “na-egwupu.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Akpa nwa.”
Na Hibru, “Ọ.”
Na Hibru, “Ọ.”
Na Hibru, “n’ụzọ ha.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.