Job 25:1-6

  • Okwu nke atọ Bildad kwuru (1-6)

    • ‘Olee otú mmadụ ga-esi bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke?’ (4)

    • O kwuru na mmadụ ịkwụwa aka ọtọ abaghị uru (5, 6)

25  Bildad+ onye Shua kwuru, sị:   “Ọ bụ ya nwe ọchịchị, ọ dịkwa egwu. Ọ na-eme ka udo dịrị n’eluigwe.*   À na-agụtali ndị agha ya ọnụ? È nwere onye ìhè ya na-anaghị enwuru?   Oleezi otú mmadụ efu ga-esi bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke,+Ma ọ bụ, olee otú onye nwaanyị mụrụ ga-esi bụrụ onye aka ya dị ọcha?+   Ọnwa anaghịdị etisi ike n’anya ya,Kpakpando adịghịkwa ọcha n’anya ya,   Ma ya fọdụzie mmadụ efu bụ́ ikpuru Nakwa nwa nke mmadụ bụ́ idide.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’ebe ya dị elu.”