Job 26:1-14

  • Job sara ihe a gwara ya (1-14)

    • “Legodị ụdị aka i nyeere onye ike na-adịghị” (1-4)

    • ‘E nweghị ihe Chineke kokwasịrị ụwa na ya’ (7)

    • ‘Naanị obere ihe n’ihe ndị Chineke na-eme’ (14)

26  Job wee sị:   “Legodị ụdị aka i nyeere onye ike na-adịghị. Legodị otú i si zọpụta onye na-enweghị ume.+   Legodị ọmarịcha ndụmọdụ i nyere onye na-amaghị ihe.+ Legodị otú i si gosi na ị ma nnọọ ihe.   Ònye ka ị na-agbalị ịgwa okwu? Ọ̀ bụkwa onye mere ka i kwuo ihe ndị a?   Ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ọ bụla, ha na-amakwa jijiji. Ha nọdị n’ebe dị ala karịa osimiri na ihe ndị bi n’ime ya.   Ili* ghe oghe n’anya Chineke,*+Ọ na-ahụkwa ihe niile dị n’ebe mmadụ na-anọ erekasị.*   Ọ na-agbasa mbara igwe nke dị n’ebe ugwu n’elu ebe tọgbọ chakoo,+E nweghịkwa ihe o kokwasịrị ụwa na ya.   Ọ na-eji ígwé ojii ya afụchi mmiri+Otú ígwé ojii na-agaghị agbawa n’agbanyeghị otú mmiri si dị arọ.   Ọ na-ekpuchi ocheeze ya ka a ghara ịhụ ya,Jiri ígwé ojii ya sachie ya.+ 10  Ọ na-akpara mbara igwe na osimiri ókè.+ Ọ na-akpara ìhè na ọchịchịrị ókè. 11  Ogidi ndị ji eluigwe na-ama jijiji. Mba ọ na-aba na-eme ka egwu jide ha. 12  Ọ na-eji ike ya eme ka oké osimiri mee mkpọtụ.+ Ọ na-akụri nnukwu anụ mmiri* n’ihi nghọta o nwere.+ 13  Ọ na-eji ume ọ na-ekupụ* eme ka mbara igwe gbachapụ agbachapụ. Aka ya na-egwepịa agwọ siri ike njide.* 14  Lee, ihe ndị a bụ nnọọ obere ihe n’ihe ndị ọ na-eme.+ Naanị obere ihe nke yiri ihe a takwunyere atakwunye ka a nụrụla banyere ya. Ònyezi ga-aghọtali otú o si eme ka égbè eluigwe ya dị egwu gbaa?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu
Na Hibru, “ya.”
Ma ọ bụ “dị n’Abadọn.”
Na Hibru, “Rehab.”
Ma ọ bụ “na-eji ifufe ya.”
Ma ọ bụ “agwọ na-amịgharị amịgharị.”