Job 28:1-28

  • Job kwuru ihe dị iche n’amamihe na akụ̀ ndị dị n’ala (1-28)

    • Mbọ mmadụ na-agba ka o gwupụta akụ̀ ndị dị n’ala (1-11)

    • Amamihe bara uru karịa nkume pel (18)

    • Ọ bụ ịtụ egwu Jehova bụ amamihe (28)

28  “E nwere ebe a na-egwute ọlaọchaNakwa ebe a na-egwute ọlaedo a ga-anụcha anụcha.+   A na-egwute ígwè n’ala,A na-esikwa na nkume agbazeta ọla kọpa.+   Mmadụ na-abanye n’ebe gbara ọchịchịrị. Ọ na-abanye n’ime ime itiri na ọchịchịrị, Na-achọ nkume ndị a dị oké ọnụ.   Ọ na-egwunye ígwè n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ bi,N’ebe e chefuru echefu, n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ na-agaru. Ụfọdụ ndị na-eke onwe ha ụdọ rịba n’ime ala, ụdọ ejide ha ha ana-arụ ọrụ.   Elu ala na-emepụta nri;Ma n’okpuru ala, a na-emebisị ihe niile ka ebe e ji ọkụ na-emebisị ihe.*   N’ebe ahụ ka nkume safaya dị,Ọlaedo dịkwa n’ájá dị n’ebe ahụ.   E nweghị nnụnụ na-eri anụ ma ụzọ e si aga na ya. Anya égbé ojii ahụbeghị ebe ahụ.   E nweghị anụ ọhịa na-akpa ike zọtụrụla ụkwụ na ya. Ọdụm agatụbeghị na ya.   Mmadụ na-akụrisị nkume siri ike. Ọ na-esi na ntọala ugwu akwatu ugwu. 10  Ọ na-awara mmiri ụzọ+ n’oké nkume. Anya ya na-ahụ ihe ọ bụla dị oké ọnụ. 11  Ọ na-eji ihe arụbichi ebe mmiri si asọpụta,Ọ na-agbakwa ihe e zoro ezo n’anwụ. 12  Ma olee ebe a ga-achọta amamihe?+ Oleekwa ebe e si enweta nghọta?+ 13  E nweghị mmadụ ma uru ọ bara,+A naghịkwa ahụ ya n’ụwa.* 14  Mmiri miri emi na-asị, ‘Ọ dịghị n’ime m.’ Oké osimiri na-asịkwa, ‘Ọ bụghị m ji ya.’+ 15  E nweghị ike iji ezigbo ọlaedo zụta ya,E nweghịkwa otú a ga-atụru ọlaọcha jiri gbanweta ya.+ 16  E nweghị ike iji ọlaedo kacha mma* zụta ya,+Ma ọ bụkwanụ jiri nkume ọnịks na nkume safaya dị oké ọnụ zụta ya. 17  A gaghị ejili ọlaedo na enyo tụnyere ya. E nweghịkwa ike iji arịa e ji ezigbo ọlaedo* mee gbanweta ya.+ 18  A gaghịdị eji nkume kọral na nkume kristal tụnyere ya,+N’ihi na akpa nke amamihe juru bara uru karịa nke nkume pel juru. 19  E nweghị ike iji nkume topaz+ si Kush tụnyere ya. E nweghịdị ike iji ezigbo ọlaedo zụta ya. 20  Ma olee ebe amamihe si abịa? Oleekwa ebe e si enweta nghọta?+ 21  E zoro ya ezo ka anya ihe ọ bụla dị ndụ ghara ịhụ ya,+Zookwa ya ka nnụnụ ghara ịhụ ya. 22  Mbibi na ọnwụ na-asị,‘Naanị n’akụkọ ka ntị anyị nụrụ gbasara ya.’ 23  Ọ bụ Chineke ghọtara otú a ga-esi chọta ya. Naanị ya ma ebe o bi,+ 24  N’ihi na anya ya na-eru na nsọtụ ụwa,Ọ na-ahụkwa ihe niile dị n’ụwa.*+ 25  Mgbe o nyere ifufe ikike ọ ga-eji na-efe*+Ma tụọ otú mmiri dị iche iche ga-aha,+ 26  Mgbe o mere iwu ga na-achị mmiri ozuzo,+Waakwara oké mmiri ozuzo na égbè eluigwe ụzọ,+ 27  Mgbe ahụ, ọ hụrụ amamihe ma kọwaa ya. O mere ka amamihe dịrị, nwaleekwa ya. 28  O wee sị mmadụ: ‘Lee, ọ bụ ịtụ egwu Jehova bụ amamihe.+ Mmadụ iwepụ aka n’ihe ọjọọ bụkwa nghọta.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ otú e si egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala.
Na Hibru, “n’ala ndị dị ndụ.”
Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”
Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”
Ma ọ bụ “n’okpuru eluigwe.”
Na Hibru, “Mgbe ọ tụrụ otú ifufe ga-adịru n’arọ.”