Job 29:1-25

  • Job chetara oge ihe dịịrị ya ná mma (1-25)

    • A na-akwanyere ya ùgwù n’ọnụ ụzọ ámá obodo (7-10)

    • Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi (11-17)

    • Onye ọ bụla na-ege ntị na ndụmọdụ ya (21-23)

29  Job kwukwara, sị:   “Ọ dị m ka ya bụrụ na ihe a bụ ọnwa ndị garala aga,N’oge Chineke na-eche m nche,   Mgbe o mere ka ọkụ* ya na-acha m n’isi,Mgbe m na-eji ìhè ya agafe n’ọchịchịrị,+   Mgbe m ka bụ okorobịa,Mgbe mụ na Chineke dị n’ezigbo mma,+   Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka nọnyeere m,Mgbe ụmụ m* gbara m gburugburu,   Mgbe mmiri ara ehi juru n’ebe m na-azọ ụkwụ,Oké nkume ana-agbapụtara m mmanụ ka mmiri.+   Mgbe m na-agabu n’ọnụ ụzọ ámá obodo+Ma nọrọ ọdụ n’ámá,+   Ụmụ okorobịa na-ahụ m nye ohere.* Ndị agadi na-ebilidị guzoro ọtọ.+   Ndị isi anaghị ekwu okwu. Ha na-ekpuchi aka n’ọnụ ha. 10  Ndị a ma ama gbachiri nkịtị. Ire ha tapaara n’okpo ọnụ ha. 11  Onye ọ bụla nụrụ ihe m kwuru ga-ekwu okwu ọma banyere m,Ndị hụkwara m ga-agbara m akaebe. 12  N’ihi na m na-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka,+Na-anapụtakwa nwa na-enweghị nna na onye ọ bụla nke na-enweghị onye na-enyere ya aka.+ 13  Onye m napụtara n’ọnụ ọnwụ ga-agọzi m,+M mekwara ka obi dị nwaanyị di ya nwụrụ ụtọ.+ 14  M yi ezi omume ka uwe. Ikpe ziri ezi bụụrụ m uwe elu* na ákwà m na-eke n’isi. 15  Abụ m anya ndị ìsì ji ahụ ụzọ,Bụrụkwa ụkwụ ndị ngwọrọ ji aga ije. 16  Abụụrụ m ndị ogbenye nna.+ M na-eleba anya n’ikpe gbasara ndị m na-amaghị.+ 17  M na-akụwa onye na-eme ihe ọjọọ agba, onye dị ka anụ ọhịa nke jidere anụ ọ ga-eri.+ M na-anapụtakwa ndị o ji eji. 18  M na-asịbu, ‘M ga-anọ n’ụlọ m* nwụọ,+Ụbọchị m ga-adịkwa ọtụtụ ka ájá dị n’ala. 19  M ga-adị ka osisi mgbọrọgwụ ya ga-agbasa banye na mmiri,Nke igirigi ga-adịkwa n’alaka ya chi abọọ. 20  E nweghị mgbe a ga-akwụsị ịkwanyere m ùgwù,M ga na-agbakwa ụta m ji n’aka n’akwụsịghị akwụsị.’ 21  Ndị mmadụ ga-ege ntị ka ha nụ ihe m ga-ekwu. Ha ga-anọ jụụ na-eche ka m dụọ ha ọdụ.+ 22  M kwuchaa okwu, e nweghị ihe ọzọ ha na-ekwu. Okwu m na-eru ha n’ahụ́. 23  Ha na-atụ anya m otú e si atụ anya mmiri ozuzo. Ha na-atụsi anya ike ịnụ ihe m ga-ekwu otú mmadụ si atụsi anya ụla mmiri ike.+ 24  M mụmụọrọ ha ọnụ ọchị, ọ na-eju ha anya. Otú m si agbasapụ ihu m na-eme ka obi sie ha ike. 25  M na-enye ha ntụziaka ka onyeisi ha. M bi ka eze ndị agha ya gbara gburugburu,+Ka onye na-akasi ndị na-eru uju obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ndị na-ejere m ozi.”
Na Hibru, “gaa zoo.”
Ma ọ bụ “uwe na-enweghị aka.”
Na Hibru, “n’akwụ́ m.”