Job 31:1-40

  • Job kwuru ihe gosiri na ya na-akwụwa aka ọtọ (1-40)

    • “Mụ na anya m agbaala ndụ” (1)

    • Ọ sịrị ka Chineke jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ya (6)

    • Ọ naghị agba n’èzí (9-12)

    • Ọ hụghị ego n’anya (24, 25)

    • Ọ naghị ekpere arụsị (26-28)

31  “Mụ na anya m agbaala ndụ.+ Gịnịzi mere m ga-eji lewe nwaanyị ọzọ* anya otú na-ekwesịghị ekwesị?+   Oleezi ihe m ga-enweta n’aka Chineke bi n’eluigwe? Gịnị ka m ga-eketa n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile bụ́ onye nọ n’elu?   Ọ̀ bụ na ọ bụghị mbibi ka a ga-ebibi onye na-eme ihe ọjọọ? Ọ̀ bụkwa na ọdachi agaghị adakwasị ndị arụrụala?+   Ọ̀ bụ na Chineke anaghị ahụ ụzọ m,+Na-agụkwa nzọụkwụ m niile ọnụ?   È nwetụla mgbe m sooro ndị na-anaghị ekwu eziokwu? È nwetụla mgbe m gara ije ngwa ngwa ka m ghọọ aghụghọ?+   Ka Chineke jiri ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe tụọ m.+ Ọ ga-achọpụta na m kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.+   Ọ bụrụ na m hapụrụ iso ezigbo ụzọ,+Ma ọ bụ na ihe anya m hụrụ gụwara obi m agụụ,+Ma ọ bụ na aka m adịghịzi ọcha,   Ka onye ọzọ rie mkpụrụ m kụrụ,+Ka e fopụkwa ihe m kụrụ.*   Ọ bụrụ na obi m dị n’ebe nwaanyị ọzọ nọ,+Ọ bụrụkwa na m gara zoo n’ọnụ ụzọ onye agbata obi m maka na m na-achọ nwunye ya,+ 10  Ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri,Ka ụmụ nwoke ndị ọzọ dinaa ya.*+ 11  N’ihi na m mee otú ahụ, ọ ga-abụ ihe ihere,Bụrụkwa ihe ọjọọ nke ndị ikpe ga-eji maka ya taa m ahụhụ.+ 12  Ọ ga-adị ka ọkụ nke ga-erepịa ihe niile m rụpụtara ma bibie ha,+Repịakwa mgbọrọgwụ* ha niile. 13  Ọ bụrụ na emereghị m ndị ohu m ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwaanyị ihe m kwesịrị imere haMgbe ha kwuru na e nwere ihe m mere na-adịghị ha mma,* 14  Gịnị ka m ga-eme ma Chineke kpọọ m ikpe?* Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ ga-achọ ka m zaa ya ajụjụ?+ 15  Ọ̀ bụ na ọ bụghị Onye kere m n’ime akpa nwa nne m kere ha?+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị otu Onye ahụ kere anyị tupu a mụọ anyị?*+ 16  Ọ bụrụ na ekweghị m enye ogbenye ihe ọ chọrọ+Ma ọ bụkwanụ mee ka nwaanyị di ya nwụrụ gharazie inwe olileanya,*+ 17  Ọ bụrụ na ọ bụ naanị m na-eri nri m,Ọ bụrụ na anaghị m enyetụ ụmụ na-enweghị nne na nna,+ 18  (N’ihi na malite mgbe m bụ okorobịa, m na-elekọta nwa na-enweghị nne na nna ka à ga-asị na m bụ nna ya. M na-enyekwara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ aka malite mgbe m bụ nwata.*) 19  Ọ bụrụ na m hụrụ onye ọ bụla oyi na-atụgbu maka na o nweghị uweMa ọ bụ ogbenye na-enweghị ákwà ọ ga-eji kpuchie onwe ya,+ 20  Ọ bụrụ na mụ enyeghị ya ajị anụ a kpachapụtara n’atụrụ m ka o jiri kpuchie onwe ya,Ya agọzie m,+ 21  Ọ bụrụ na m ji iwe tụọ nwa na-enweghị nne na nna aka+Mgbe ọ nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo na-achọ ka m nyere ya aka,*+ 22  Ka aka m si n’ubu m kwokapụ,Ka aka m gbajiekwa n’ikpere aka m. 23  Ma emeghị m nke ọ bụla n’ihe ndị a maka na ụjọ tụrụ m na Chineke ga-eme ka ọdachi dakwasị m,Agaghịkwa m eguzoli n’ihu ya n’ihi otú o si dị ebube. 24  Ọ bụrụ na m tụkwasịrị ọlaedo obiMa ọ bụ na m sịrị ezigbo ọlaedo, ‘Ọ bụ gị bụ obi ike m,’+ 25  Ọ bụrụ na ihe na-eme m obi ụtọ bụ nnukwu akụnụba m,+Maka na akụ̀ m kpatara karịrị akarị,+ 26  Ọ bụrụ na m hụrụ ka anwụ na-acha*Ma ọ bụ hụ ka ọmarịcha ọnwa na-aga na mbara igwe,+ 27  Obi m wee duhie m,Mụ esusuo aka m ọnụ iji fee ha ofufe,+ 28  Ọ ga-abụ ihe ọjọọ nke ndị ikpe ga-eji maka ya taa m ahụhụ,N’ihi na ọ pụtara na mụ agọnahụla ezi Chineke bi n’elu. 29  È nwetụla mgbe m ṅụrịrị ọṅụ maka na e bibiri onye iro m+Ma ọ bụkwanụ nwee obi ụtọ maka na ihe ọjọọ mere ya? 30  E nwetụbeghị mgbe m ji ọnụ m mehieWee kpọọ onye iro m iyi, sị ya nwụọ.+ 31  Ọ̀ bụ na ndị bi n’ụlọikwuu m ajụbeghị, sị,‘Ònye ga-achọtali onye na-eribeghị nri Job, rijuo afọ?’+ 32  E nweghị onye mbịarambịa m hapụrụ ka ọ rahụ n’èzí.+ M ghewere ọnụ ụzọ m oghe maka ndị njem. 33  Èkpuchitụla m mmehie m otú ndị ọzọ si eme+Wee zooro ndị ọzọ ihe ọjọọ m mere?* 34  È nwetụla mgbe m tụrụ ụjọ ihe ìgwè mmadụ ga-eme? Ma ọ bụ, è nwetụla mgbe m tụrụ ụjọ maka otú ezinụlọ ndị ọzọ ga-esi leda m anya,Ya emee ka m gba nkịtị, ụjọ ịpụ n’èzí ana-atụkwa m? 35  A sị nnọọ na e nwere onye ga-ege m ntị,+M ga-ede aha m iji bịanye aka n’ihe m kwuru. Ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile za m.+ A sị nnọọ na onye na-ebo m ebubo dere ebubo ndị o boro m n’akwụkwọ, 36  M gaara eburu akwụkwọ ahụ n’ubu m,M gakwaara ekpuru ya n’isi m ka okpueze. 37  M gaara akọrọ Chineke ije m niile. M gaara eji obi ike gakwuru ya otú onyeisi si eme. 38  Ọ bụrụ na ala m ga-ebe ákwá maka na m zuru ya ezu,Ebe niile a kọrọ akọ na ya ebeekwa ákwá, 39  Ọ bụrụ na m riri mkpụrụ si na ya n’akwụghị ụgwọ,+Ma ọ bụ, ọ bụrụ na m mere ka ndị nwe ya* sụọ ude,+ 40  Ka ogwu puoro m kama ọka wit ga-epuru m,Ka ahịhịa na-esi ísì ọjọọ puokwara m kama ọka bali ga-epuru m.” N’ebe a ka okwu Job gwụrụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “nwaanyị na-amaghị nwoke.”
Ma ọ bụ “Ka e bibiekwa ụmụ m mụtara.”
Na Hibru, “gbaa agada n’elu ya.”
Ma ọ bụ “Fopụkwa.”
Ma ọ bụ “Mgbe mụ na ha nwere ikpe.”
Na Hibru, “bilie ọtọ?”
Na Hibru, “n’akpa nwa.”
Na Hibru, “mee ka anya nwaanyị di ya nwụrụ ghara ịhụcha ụzọ.”
Na Hibru, “malite n’afọ nne m.”
O nwere ike ịbụ, “Mgbe m hụrụ na e nwere ndị na-akwado m n’ọnụ ụzọ ámá obodo.”
Ma ọ bụ “ìhè na-enwu.”
Na Hibru, “zoo ihe ọjọọ m mere n’akpa uwe m?”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi nke ndị nwe ya.”