Job 39:1-30

  • Chineke ji anụmanụ ndị o kere gosi na e nweghị ihe mmadụ ma (1-30)

    • Ewu ọhịa na ele (1-4)

    • Jakị ọhịa (5-8)

    • Atụ́ (9-12)

    • Enyí nnụnụ (13-18)

    • Ịnyịnya (19-25)

    • Agụ nkwọ na ugo (26-30)

39  “Ị̀ ma oge ewu ọhịa* ji amụ nwa?+ Ị̀ hụtụla mgbe mgbada na-amụ nwa?+   Ị̀ na-agụkọ ọnwa ole ha na-ebu afọ ime? Ị̀ ma mgbe ha ji amụ nwa?   Ha na-ehulata mụọ nwa mgbe ime na-eme ha,Ahụ́ mgbu ha akwụsị.   Ụmụ ha na-agbasi ike ma too n’ime ọhịa. Ha na-apụ, ha anaghịkwa alọghachikwute nne ha.   Ònye hapụrụ jakị ọhịa ka ọ gawara onwe ya?+ Ọ̀ bụkwa onye tọpụrụ eriri e kere jakị ọhịa?*   M meela ka ọzara bụrụ ụlọ ya,Meekwa ka ala nnu bụrụ ebe ọ na-ebi.   Ọ na-achị ọgba aghara e nwere n’obodo ọchị. Ọ naghị anụ mkpu onye na-achị anụmanụ na-eti.   Ọ na-akpagharị n’ugwu na-achọ ahịhịa ọ ga-ata,Na-achọ ụdị ahịhịa ndụ ọ bụla.   Atụ́ ọ̀ ga-achọ ijere gị ozi?+ Ọ̀ ga-anọbọ chi n’ụlọ anụmanụ gị?* 10  Ì nwere ike iji ụdọ kegide atụ́ ka ọ kọọrọ gị ihe n’ubi,Ka ọ̀ ga-eso gị gaa kọọrọ gị ihe na ndagwurugwu? 11  Ị̀ ga-atụkwasị ya obi maka na ọ dị ezigbo ike,Ma hapụ ya ka ọ rụọrọ gị nnukwu ọrụ i nwere ịrụ? 12  Ị̀ ga-atụkwasị ya obi ka o bulatara gị ihe ubi gị mepụtara?* Ọ̀ ga-ekpokọta ha n’ebe ị na-azọcha ọka?* 13  Obi na-atọ enyí nnụnụ ụtọ mgbe ọ na-efe nku ya. Ma à ga-eji nku ya na ábụ́bà* ya tụnyere nke ụgbala ọcha?*+ 14  N’ihi na ọ na-ahapụ àkwá ya n’ala. Ọ na-ahapụ ha n’ájá ka ájá na-ekpo ha ọkụ. 15  Ọ na-echefu na mmadụ nwere ike ịzọpịa haMa ọ bụ na anụmanụ nwere ike ịzọ ha ụkwụ. 16  Ọ na-emesi ụmụ ya ike ka à ga-asị na ọ bụghị ya mụrụ ha.+ Ọ chọghịdị ịma na mbọ niile ọ gbara nwere ike ịla n’iyi. 17  N’ihi na Chineke emeela ka ọ ghara ịma ihe,*Meekwa ka ọ ghara ịna-aghọta ihe. 18  Ma mgbe o biliri fee nku ya,Ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ya ọchị. 19  Ọ̀ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya?+ Ọ̀ bụ gị na-eme ka o nwee ọzà n’olu ya? 20  Ì nwere ike ime ka ọ malie ka igurube? Otú o si eze ume n’ike n’ike na-emenye ụjọ.+ 21  Ọ na-akụ ụkwụ n’ala n’ike n’ike na ndagwurugwu, na-amalikwa elu.+ Ọ na-azọrọ kwem kwem pụta n’ọgbọ agha.+ 22  Ọ na-achị ihe na-emenye ụjọ ọchị, e nweghịkwa ihe ọ na-atụ egwu.+ Mma agha anaghị eme ka ọ gbaghachi azụ. 23  Akpa akụ́ na-eme mkpọtụ n’akụkụ ya,Ube na árọ̀ ana-egbukwa maramara. 24  Ebe ọ bụ na ọ na-enu ya enu, ọ na-awụrụ ọsọ gawa. O nweghị ike ịkwụrụ otu ebe ma ọ nụ ụda opi.* 25  A fụọ opi, ọ na-asị, ‘Ehee!’ Ọ na-anọ n’ebe dị anya anụ ísì agha,Na-anụkwa mkpu ndị ọchịagha na-eti nakwa mkpu agha.+ 26  Ọ̀ bụ gị kụziiri agụ nkwọ otú ọ ga-esi na-efe? Ị̀ kụziiri ya otú ọ ga-esi na-efega n’ebe ndịda? 27  Ka ọ̀ bụ gị na-enye ugo iwu ka o felie elu+Ma kpaa akwụ́ ya n’ebe dị elu?+ 28  Ọ na-anọ n’ọnụ ọnụ nkume dị elu chi abọọ. Ọ na-ebi n’ebe ọ rụsiri ike ná nnukwu nkume pịrị ọnụ. 29  Ọ na-esi n’ebe ahụ achọ nri.+ Anya ya na-eru n’ebe dị ezigbo anya. 30  Ụmụ ya na-aṅụ ọbara. Ọ na-anọkwa n’ebe ọ bụla ozu dị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ewu na-ebi n’ugwu.”
N’asụsụ Hibru, aha a kpọrọ jakị ọhịa nke mbụ dị iche n’aha a kpọrọ nke abụọ. O gosiri na ha bụ ụdị jakị ọhịa abụọ.
Ma ọ bụ “n’ebe ị na-etinyere anụ ụlọ nri.”
Na Hibru, “bulatara gị mkpụrụ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ugbene.”
Ma ọ bụ “shekeleke.”
Na Hibru, “ka o chefuo amamihe.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ naghị ekwe na ọ bụ ụda opi ka ọ na-anụ.”