Job 41:1-34

  • Chineke kwuru otú Agụ Iyi si dị egwu (1-34)

41  “Ị̀ ga-ejili nko azụ̀ jide Agụ Iyi*+Ma ọ bụ jiri eriri kegide ire ya?   Ị̀ ga-aganyeli eriri n’oghere imi yaMa ọ bụ jiri nko* dụpuo agba ya?   Ọ̀ ga-arịọ gị arịrịọ ọtụtụ ugboro,Ka ọ̀ ga-eji nwayọọ gwa gị okwu?   Ọ̀ ga-ekwe ka gị na ya gbaa ndụ Ka i jiri ya mere ohu ná ndụ gị niile?   Ị̀ ga-egwusa ya egwu otú e si egwusa nnụnụMa ọ bụ kenye ya eriri ka ụmụaka gị ndị nwaanyị jiri ya gwurie egwu?   Ndị ahịa hà ga na-ekwe ya ọnụ? Hà ga-ekere ya ndị na-azụ ahịa?   Ì nwere ike ịmanyeju ya ube n’ahụ́+Ma ọ bụ manyejuo ya ube e ji egbu azụ̀ n’isi?   Tụkwasị ya aka gị. Ị ga-echetazi ọgụ gị na ya lụrụ, ị gaghịkwa anwa anwa tụkwasị ya aka ọzọ.   Olileanya ọ bụla mmadụ nwere na ọ ga-emeri ya bụ n’efu. Anya nkịtị ị hụrụ ya ga-eme ka egwu jide gị.* 10  E nweghị onye ga-anwa anwa kpasuo ya. Ònyezi nwere ike iguzo n’ihu m?+ 11  È nwere onye bu ụzọ nye m ihe ọ bụla nke mere m ga-eji kwụghachi ya ihe o nyere m?+ Ihe niile dị n’ụwa* bụ nke m.+ 12  M ga-ekwukwa banyere ụkwụ ya na aka ya,Banyere otú o si sie ike nakwa otú ahụ́ ya si dị egwu. 13  Ònye gbatụrụla ya akpụkpọ? Ònye ga-abanyeli ya n’ọnụ ma o meghee agba ya? 14  Ònye ga-amanyeli ya ka o meghee ọnụ* ya? Ezé ya niile na-emenye ụjọ. 15  Azụ ya niile bụ akpịrịkpa akpịrịkpa* Ndị rapagidesiri ike n’ibe ha. 16  Nke ọ bụla rapagidesiri ike n’ibe yaNke na ikuku enweghị ike isi n’etiti ha gafere. 17  Ha tapaara n’ahụ́ ibe ha. Ha nyakọtara ọnụ, e nweghịkwa ike ikewa ha. 18  Ìhè na-enwupụta ma o zee ume,Anya ya na-enwukwa ka ìhè na-enwu ma chi bọwa. 19  Ihe yiri àmụ̀mà na-esi ya n’ọnụ apụta. Ikerike ọkụ na-esi ya n’ọnụ apụta. 20  Anwụrụ ọkụ na-esi n’oghere imi ya apụta Otú anwụrụ ọkụ si esi n’ekwú a wụnyere ahịhịa amị apụta. 21  Ume ọ na-ekupụta na-eme ka icheku ọkụ nwuru ọkụ,Ire ọkụ na-esikwa ya n’ọnụ apụta. 22  Olu ya siri ezigbo ike. Ezigbo ụjọ na-ejide onye ọ bụla zutere ya. 23  Akpụkpọ ahụ́ ya fụkọtara afụkọta. Ha siri ezigbo ike ka à ga-asị na e ji ígwè kpụọ ha nke na ha enweghị ike ikpekapụ ekpekapụ. 24  Obi ya siri ike ka nkume. N’eziokwu, o siri ike ka nnukwu nkume e ji egwe nri. 25  O bilie ọtọ, ụjọ na-ejidedị ndị dike. Mkpọtụ ọ na-eme n’ime mmiri na-eyi egwu. 26  E nweghị mma agha nwere ike imerụ ya ahụ́,Ma ube ma akụ́ ma ngwá agha ọzọ.+ 27  Ọ na-ewere ígwè ka okporo ahịhịa ọka,Were ọla kọpa ka osisi rere ure. 28  Akụ́ anaghị eme ka ọ gbaa ọsọ. E jiri èbè* gbaa ya nkume, ọ na-adị ya ka à tụrụ ya ahịhịa ọka. 29  Ọ na-ewere okpiri ka ahịhịa ọka,Mkpọtụ árọ̀ na-eme na-atọkwa ya ọchị. 30  Okpuru afọ ya dị ka mpekere ite ụrọ ndị ọnụ ha pịrị apị. Ọ na-agbasa onwe ya n’apịtị ka ihe e ji azọcha ọka.+ 31  Ọ na-eme ka ala ala osimiri na-agbọ agbọ ka mmiri e sinyere n’ite. Ọ na-eme ka oké osimiri na-agbọ ụfụfụ ka ite mmanụ otite e sinyere n’ọkụ. 32  Ọ na-eme ka mmiri na-agbọ ụfụfụ mgbe ọ na-egwugharị na mmiri. Mmadụ ga-eche na oké osimiri gbara isi awọ́. 33  E nweghị ihe yiri ya n’ụwa. E kere ya ka ọ ghara ịna-atụ ihe ọ bụla ụjọ. 34  Ọ na-ele anụ ọ bụla dị mpako anya n’atụghị egwu. Ọ bụ eze anụ ọhịa niile siri ike.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ogwu.”
Ma ọ bụ “ga-akwada gị n’ala.”
Ma ọ bụ “n’okpuru eluigwe.”
Na Hibru, “ihu.”
O nwere ike ịbụ, “Ihe na-ebu ya isi bụ na ahụ́ ya bụ akpịrịkpa akpịrịkpa.”
Èbè bụ ihe yiri katapọt.