Job 5:1-27

  • Elifaz ka na-ekwu okwu mbụ ya (1-27)

    • ‘Chineke na-eme ka ọnyà ndị ma ihe siri ma ha’ (13)

    • ‘Ajụla aka ná ntị Chineke na-adọ gị’ (17)

5  “Biko, kpọọ òkù. È nwere onye na-aza gị? Ònye n’ime ndị nsọ* ka ị ga-akpọ ka o nyere gị aka?   N’ihi na iwe ga-egbu onye nzuzu,Anyaụfụ ga-egbukwa onye na-amaghị ihe.   Ahụla m ka ihe na-agaziri onye nzuzu. Ma na mberede, a na-abụ ụlọ ya ọnụ.   Ụmụ ya ejighị ndụ ha n’aka. A na-emegbu ha n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+ e nweghịkwa onye na-anapụta ha.   Onye agụụ na-agụ na-eri ihe onye ahụ wetara n’ubi. Ọ na-eweredị ihe ndị dị n’ebe e nwere ogwu,A na-eburukwa ihe ha n’ike.   Ma, ihe ọjọọ anaghị esi n’ájá epupụta,Nsogbu anaghịkwa esi n’ala epulite.   O doro anya na ikerike ọkụ ga-esirịrị n’ọkụ gbalie elu. Otú ahụkwa ka o doro anya na mmadụ ga-enwerịrị nsogbu ná ndụ ya.   Ma, m ga-arịọ Chineke arịrịọ,Ọ bụkwa Chineke ka m ga-ewegara okwu m,   Onye na-eme oké ihe na ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta achọpụta,Ihe ndị dị ebube a na-enweghị ike ịgụta ọnụ. 10  Ọ na-eme ka mmiri zoo n’ụwa,Na-emekwa ka mmiri zoo n’ubi. 11  Ọ na-ebuli onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya elu,Na-azọpụtakwa onye ike ụwa gwụrụ. 12  Ọ na-akụghasị atụmatụ ndị aghụghọ,Ka ihe ha na-eme ghara inwe isi. 13  Ọ na-eme ka ọnyà ndị ma ihe siri ma ha,+Ka atụmatụ ha wee kụsasịa. 14  Ọchịchịrị na-agbachi ha n’ehihie,Ha na-asọgharịkwa ìsì n’etiti ehihie ka à ga-asị na ọ bụ abalị. 15  Ọ na-anapụta mmadụ n’okwu si ha n’ọnụ apụta nke dị ka mma agha,Na-anapụta ogbenye n’aka onye siri ike, 16  Ka onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nwee olileanya,Ma a na-emechi ọnụ onye ajọ omume. 17  Lee, onye Chineke dọrọ aka ná ntị na-enwe obi ụtọ;N’ihi ya, ajụla aka ná ntị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-adọ gị. 18  Ọ na-eme mmadụ ihe ga-egbu ya mgbu, ma ọ na-ekechi ọnyá onye ahụ. Ọ na-emerụ mmadụ ahụ́, ma ọ na-eji aka ya agwọ onye ahụ. 19  Ọ ga-anapụta gị ná nsogbu ọ bụla bịaara gị,Ọ bụrụgodị nsogbu isii ma ọ bụ asaa. 20  N’oge ụnwụ, ọ ga-anapụta gị ka ọnwụ ghara igbu gị,Napụtakwa gị n’oge agha, ka mma agha ghara igbu gị. 21  A ga-echebe gị ka a ghara ịgwa gị okwu ọjọọ,+Ị gaghịkwa atụ egwu mgbe a na-ebibi ndị mmadụ. 22  Ị gaghị atụ egwu na a ga-ebibi gị ma ọ bụ na agụụ ga-agụgbu gị,Ị gaghịkwa atụ anụ ọhịa egwu. 23  N’ihi na nkume ndị dị n’ọhịa agaghị emerụ gị ahụ́,*Gị na anụ ọhịa ga-adịkwa n’udo. 24  Obi ga-eru gị ala n’ụlọikwuu gị,E nweghịkwa anụ ị ga-achọ achọ mgbe ị ga-eleru ebe ụmụ anụmanụ gị na-ata ahịhịa anya. 25  Ị ga-enwe ọtụtụ ụmụ,Ụmụ ụmụ gị ga-adịkwa ọtụtụ ka ahịhịa dị n’ala. 26  Ike ka ga-adị gị n’ahụ́ mgbe ị ga-anwụ,Ka ùkwù ọka e gbutere n’oge ya. 27  Lee, anyị elebala ihe a anya. Ọ bụ otú ọ dị. Gee ntị ma nabata ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ ndị mmụọ ozi ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “gị na nkume ndị dị n’ọhịa ga-agba ndụ.”