Job 7:1-21

  • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-21)

    • Ndụ mmadụ dị ka ebe a manyere ya ịrụ ọrụ ike (1, 2)

    • “Gịnị mere o ji bụrụ m ka i lekwasịrị anya?” (20)

7  “Ọ̀ bụ na ndụ mmadụ efu bi n’ụwa adịghị ka ebe a manyere mmadụ ịrụ ọrụ ike? Ọ̀ bụ na ọ naghị ebi ndụ kwa ụbọchị ka onye ọrụ e goro ego?+   Ọ na-agụ ya agụụ ka ọ nọrọ na ndò otú ọ na-agụ ohu,Ọ na-atụkwa anya ka a kwụọ ya ụgwọ ọrụ ya otú onye ọrụ e goro ego na-atụ anya ụgwọ ọrụ ya.+   Otú ahụ ka ndụ m si bụrụ ihe na-abaghị uru kemgbe ọtụtụ ọnwa,M nọkwa na-ahụsi anya kemgbe ọtụtụ abalị.+   M dinara ala, m na-ajụ, sị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’+ Ma ebe chi na-ekweghị abọ ngwa ngwa, m na-atụgharịgide ruo n’isi ụtụtụ.   Ikpuru na ọkpụrụkpụ ájá kpuchiri m ahụ́.+ Ọnyá na abụ juru m n’ahụ́.+   Ndụ m na-agbada n’ike n’ike.*+ Ọ na-agwụ ngwa ngwa, enweghịkwa m olileanya.+   Cheta na ndụ m dị ka ifufe,+Na agaghị m enwe obi ụtọ* ọzọ.   Onye na-ahụ m ugbu a agaghị ahụ m ọzọ. Ị ga-eji anya na-achọ m, ma agakwaghị m anọ ya.+   Otú ahụ ígwé ojii si ekusa pụọ n’anyaKa onye na-agbada n’ili* na-anaghị esi na ya apụta.+ 10  Ọ gaghị alaghachi ọzọ n’ụlọ ya,A gakwaghị ahụ ya ọzọ n’ebe o bibu.+ 11  N’ihi ya, agaghị m emechi ọnụ m. M ga-ekwu okwu n’ihi otú obi si afụ m ụfụ. M ga-ekwu okwu n’ihi otú ahụhụ m na-ata si ewute m.+ 12  Àbụ m oké osimiri, ka m̀ bụ nnukwu anụ mmiri,Nke mere ị ga-eji mee ka a na-eche m nche? 13  Mgbe m sịrị, ‘Àkwà m* ga-akasi m obi. Ọ ga-eme ka ahụhụ m na-ata belata,’ 14  I meziri ka m rọwa nrọ na-atụ ụjọ,Meekwa ka m hụwa ọhụụ na-atụ egwu. 15  N’ihi ya, ọ kaara m* mma ka m kubie ume. N’eziokwu, ọ kaara m mma na m nwụrụ anwụ karịa ahụ́ m* ịdị otú a ọ dị.+ 16  Ndụ m agwụla m ike.+ Achọghịzi m ịdị ndụ. Hapụ m, n’ihi na ndụ m dị ka ume e kupụrụ ekupụ.+ 17  Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere ị ga-eji na-eche banyere ya,Anya gị adịrịkwa* n’ebe ọ nọ?+ 18  Gịnị mere i ji enyocha ya kwa ụtụtụ,Na-anwalekwa ya mgbe niile?+ 19  Ọ̀ bụ na ị gaghị ewepụ anya gị n’ebe m nọMa hapụtụ m ka m loo asọ mmiri?+ 20  Ọ bụrụ na m mehiere, gịnị ka m ga-emeli gị, gị Onye na-ahụ ihe niile mmadụ na-eme?+ Gịnị mere o ji bụrụ m ka i lekwasịrị anya? M̀ bụziiri gị ibu arọ? 21  Gịnị mere na ị naghị agbaghara m mmehie mMa leghara ihe ọjọọ m mere anya? N’ihi na m ga-edinara n’ájá n’oge na-adịghị anya,+Ị ga-achọkwa m, ma agaghị m anọ ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ụbọchị m na-agafe ọsọ ọsọ karịa osisi a gbanyere eri nke onye na-ekwe ákwà ji ekwe ákwà.”
Na Hibru, “Na anya m agaghị ahụ ihe ọma.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Ihe ndina m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “ọkpụkpụ m.”
Na Hibru, “Gị etinyekwa obi gị.”