Job 9:1-35

  • Job sara ihe a gwara ya (1-35)

    • Mmadụ efu enweghị ike ịrụ Chineke ụka (2-4)

    • ‘Chineke na-eme ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta’ (10)

    • Mmadụ enweghị ike ịsa Chineke okwu (32)

9  Job kwuru, sị:   “N’eziokwu, ama m na ọ bụ otú a ka ọ dị. Ma, olee otú ọ ga-esi bụrụ mmadụ efu ka aka ya dị ọcha n’okwu ya na Chineke?+   Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka ya na Chineke rụọ ụka,*+Onye ahụ agaghị azali otu ajụjụ n’ime otu puku ajụjụ Chineke ga-ajụ.   Ọ ma ihe, ike ya dịkwa ukwuu.+ Ònye ga-ama ya aka, a ghara imerụ onye ahụ ahụ́?+   Ọ na-ebupụ* ugwu, ma mmadụ anaghị ama. Ọ na-eji iwe ya akwatu ha.   Ọ na-eme ka ụwa maa jijiji n’ebe ọ dị,Nke na-eme ka ogidi ndị ji ya maa jijiji.+   Ọ na-enye anyanwụ iwu ka ọ ghara ịcha,Na-ekpuchikwa ìhè kpakpando dị iche iche.+   Ọ bụ yanwa na-agbasa eluigwe ka ákwà,+Na-agakwa ije n’elu ebili mmiri nke oké osimiri.+   O kere ìgwè kpakpando Ash,* ìgwè kpakpando Kisịl,* na ìgwè kpakpando Kaịma,*+Keekwa ìgwè kpakpando ndị dị na mbara igwe ebe ndịda.* 10  Ọ na-eme nnukwu ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta achọpụta,+Ihe ndị dị ebube a na-enweghị ike ịgụ ọnụ.+ 11  Ọ na-agafe n’akụkụ m, ma anaghị m ahụ ya. Ọ na-agafe m, ma anaghị m ama. 12  Ọ bụrụ na ọ napụwa mmadụ ihe, è nwere onye ga-egbochi ya? Ònye ga-asịli ya, ‘Gịnị ka ị na-eme?’+ 13  Chineke agaghị eme ka iwe ya dajụọ.+ Ndị na-enyedịrị Rehab*+ aka ga-adara ya n’ala. 14  N’ihi ya, mgbe m na-asa ya okwu,M ga-elezi anya họrọ okwu m ga-agwa ya. 15  Ọ bụrụgodị na aka m dị ọcha, agaghị m asa ya okwu.+ Naanị arịrịọ ka m ga na-arịọ onye na-ekpe m ikpe* ka o meere m ebere. 16  Ọ bụrụ na mụ akpọọ ya, ọ̀ ga-aza m? Ekwetaghị m na ọ ga-ege m ntị, 17  N’ihi na o ji oké ifufe na-emerụsị m ahụ́,Na-emekwa ka ọnyá na-apụtakwu m n’ahụ́ n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere.+ 18  Ọ naghị ekwe ka m kuru ume. Ọ na-eme ka nsogbu zuo m ahụ́. 19  A bịa n’ịdị ike, ọ bụ yanwa dị ike.+ A bịa n’ikpe ikpe ziri ezi, ọ ga-asị: ‘Ònye ka m ga-aza ajụjụ?’* 20  Ọ bụrụ na ọ bụ mụnwa bụ onye aka ya dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe. Ọ bụrụgodị na e nweghị ihe a ga-eji taa m ụta,* ọ ga-asị na ikpe mara m.* 21  Ọ bụrụgodị na e nweghị ihe a ga-eji taa m ụta,* obi akaghị m. Ndụ m agwụla m ike.* 22  E nweghị ihe dị iche. Ọ bụ ya mere m ji asị,‘Ọ na-ebibi ma onye aka ya dị ọcha ma onye ajọ omume.’ 23  Ọ bụrụ na idei mmiri egbuo ndị mmadụ na mberede,Ọ ga-achị ndị aka ha dị ọcha ọchị na ha enweghị ike ịzọ onwe ha ndụ. 24  E nyefeela ụwa n’aka ndị ọjọọ.+ Ọ na-ekpuchi anya* ndị ikpe e nwere n’ụwa. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, ọ̀ bụzi onye? 25  Ndụ m na-efezi ọsọ karịa onye na-agba ọsọ.+ O ji ọsọ na-agafe, ma e nweghị ihe ọma m na-ahụ. 26  Ọ na-agbafere ka ụgbọ epeepe e ji ahịhịa amị rụọ,Ka ugo nke na-efedata ka o buru ihe ọ ga-eri. 27  Ọ bụrụ na mụ asị, ‘M ga-akwụsị ikwu ihe na-enye m nsogbu n’obi,M ga-akwụsị ịgbarụ ihu m, nwewezie obi ụtọ,’ 28  Ụjọ ka ga na-atụ m n’ihi mgbu ahụ́ niile na-egbu m,+Amakwa m na ị gaghị ewere m ka onye aka ya dị ọcha. 29  A ga-ewere m ka onye ikpe mara.* Gịnịzi mere m ga-eji na-adọlị n’efu?+ 30  Ọ bụrụ na mụ ejiri mmiri si na snoo na-agbaze agbaze saa ahụ́,Jirikwa ncha* kwọọ aka m,+ 31  Ị ga-asụnyezi m n’olulu apịtị,Nke ga-emedị ka uwe m kpọọ m asị. 32  N’ihi na ọ bụghị mmadụ otú m bụ nke na m ga-asa ya okwu,Nke na mụ na ya ga-aga ikpe.+ 33  E nweghị onye ga-ebiri mụ na ya ikpe,Onye nwere ike ịbụrụ anyị onyeikpe.* 34  Ọ bụrụ na ọ ga-akwụsị ịpịa m ihe,*Kwụsịkwa imenye m ụjọ,+ 35  M ga-agwa ya okwu n’atụghị egwu,N’ihi na anaghị m eji ụjọ ekwu okwu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “achọọ ịkpọpụ Chineke ụlọikpe.”
Ma ọ bụ “na-ewepụ.”
Na Hibru, “ime ime ụlọ ndị dị n’ebe ndịda.”
O nwere ike ịbụ kpakpando Pledis ndị dị n’ìgwè kpakpando a na-akpọ Tọrọs.
O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn.
O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Nnukwu Anụ Bea (Ọsa Mejọ).
O nwere ike ịbụ na Rehab a bụ nnukwu anụ mmiri.
O nwere ike ịbụ, “onye mụ na ya nwere ikpe.”
Na Hibru, “Ònye ga-akpọ m ikpe?”
Ma ọ bụ “Ọ bụrụgodị na m kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.”
Na Hibru, “na m gbagọrọ agbagọ.”
Ma ọ bụ “Ọ bụrụgodị na m kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.”
Ma ọ bụ “M kpọọla ndụ m asị.”
Na Hibru, “ihu.”
Na Hibru, “ka onye ajọ omume.”
Ma ọ bụ “akanwụ.”
Na Hibru, “ibikwasị anyị abụọ aka.”
Na Hibru, “ga-ewepụ ụtarị ya n’ahụ́ m.”