Joel 1:1-20

  • Igurube richapụrụ ihe (1-14)

  • “Ụbọchị Jehova dị nso” (15-20)

    • Onye amụma kpọkuru Jehova (19, 20)

1  Ihe a bụ okwu Jehova gwara Joel* nwa Petuel ka o kwuo:   “Unu ndị okenye, nụrụnụ ihe a,Unu niile ndị bi n’ala a,* geekwanụ ntị. Ụdị ihe a ò metụla n’oge unuMa ọ bụ n’oge ndị nna nna unu?+   Kọọrọnụ ya ụmụ unu,Ka ụmụ unu kọọrọ ya ụmụ ha,Ụmụ ha akọọkwara ya ọgbọ na-eso nke ha.   Igurube ndị na-abịa n’ìgwè eriela ihe igurube ndị na-eri ihe ọsọ ọsọ rifọrọ;+Igurube ndị na-enweghị nku eriekwala ihe igurube ndị na-abịa n’ìgwè rifọrọ;Igurube ndị na-erichapụ ihe ọ bụla ha hụrụ eriekwala ihe igurube ndị na-enweghị nku rifọrọ.+   Tetanụ, unu ndị aṅụrụma,+ beenụ ákwá. Tienụ mkpu ákwá, unu niile ndị na-aṅụ mmanya,N’ihi na a napụla unu mmanya dị ụtọ nke dị n’ọnụ unu.+   N’ihi na otu mba dị ike, nke a na-enweghịkwa ike ịgụta ndị ya ọnụ, abatala n’ala m.+ Ezé ya bụ ezé ọdụm,+ agba ya bụkwa agba ọdụm.   O mebichaala osisi vaịn m, meekwa ka osisi fig m fọ naanị úkwù ya. O kpechapụla azụ ha ma tụfuo ha. Alaka ha na-achazi ọcha.   Beenụ ákwá arịrị otú nwa agbọghọ* nke yi ákwà iru uju si ebe ákwá arịrịMa nwoke chọrọ ịlụ ya* nwụọ.   A naghịzi eweta àjà ọka+ na àjà mmanya+ n’ụlọ Jehova. Ndị nchụàjà, bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi, na-eru uju. 10  E bibiela ihe ndị dị n’ubi, ala na-eru uju,+N’ihi na e bibiela ọka,* mmanya ọhụrụ ataala, mmanụ anakwaghị agbapụta.+ 11  Obi adịghị ndị ọrụ ubi mma, ndị ọrụ ubi vaịn na-eti mkpu ákwá,N’ihi ọka wit na ọka bali,N’ihi na ihe ndị a kụrụ n’ubi emebiela. 12  Osisi vaịn akpọọla nkụ,Osisi fig akpọnwụọla. Osisi pomigranet, nkwụ, na osisi apụl,Osisi niile dị n’ubi akpọnwụọla,+N’ihi na ọṅụ alaala, ihere na-emezi ndị mmadụ. 13  Ndị nchụàjà, yirinụ ákwà iru uju, ruonụ uju;*Ndị na-eje ozi n’ebe ịchụàjà, tienụ mkpu ákwá.+ Batanụ, yirinụ ákwà iru uju nọrọ ruo mgbe chi bọrọ, unu ndị na-ejere Chineke m ozi;N’ihi na a naghịzi eweta àjà ọka+ na àjà mmanya+ n’ụlọ Chineke unu. 14  Kwuonụ ka e buo ọnụ. Maanụ ọkwa ka e nwee nzukọ pụrụ iche.+ Kpọkọtanụ ndị okenye, ha na ndị niile bi n’ala a,N’ụlọ Jehova bụ́ Chineke unu.+ Rịọnụ Jehova ka o nyere unu aka. 15  Ụbọchị ahụ ga-adị egwu! Ụbọchị Jehova dị nso,+Ọ ga-abịakwa ka mbibi nke si n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile! 16  Ọ̀ bụ na anyị ejibeghị anya anyị hụ na e nweghịzi ihe oriri dịnụ,Nakwa na obi ụtọ na ọṅụ adịghịzi n’ụlọ Chineke anyị? 17  Mkpụrụ* ndị dị n’okpuru shọvel ha akpọọla nkụ. E nweghịzi ihe dị n’ụlọ dị iche iche a na-akwasa ihe. A kwatuola ebe a na-ekposa ọka* n’ihi na ọka akpọnwụọla. 18  Anụ ụlọ na-ebe ubé.* Ìgwè ehi amaghịzi ebe ha na-aga aga n’ihi na ha enweghị ebe ha ga-ata ahịhịa. Ìgwè atụrụ na-atagbukwa onwe ha n’ahụhụ. 19  Jehova, ọ bụ gị ka m ga-akpọku;+N’ihi na ọkụ erepịala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa n’ala ịkpa, Ire ọkụ erepịakwala osisi niile dị n’ọhịa. 20  Anụ ọhịa na-atụ anya ka i nyere ha aka,N’ihi na iyi niile ataala,Ọkụ erepịakwala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa n’ala ịkpa.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Joel pụtara “Jehova Bụ Chineke.”
Ma ọ bụ “n’ụwa.”
Na Hibru, “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.”
Ma ọ bụ “di ya.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “tienụ aka n’obi.”
O nwere ike ịbụ, “Mkpụrụ fig ndị kpọnwụrụ akpọnwụ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “na-eti mkpu.”