Joel 3:1-21

  • Jehova ga-ekpe mba niile ikpe (1-17)

    • Ndagwurugwu Jehoshafat (2, 12)

    • Ndagwurugwu ikpe (14)

    • Jehova bụụrụ Izrel ebe a rụsiri ike (16)

  • Jehova ga-agọzi ndị ya (18-21)

3  “N’ihi na lee, n’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ,Mgbe m ga-akpọghachite ndị Juda na ndị Jeruselem a dọọrọ n’agha,+   M ga-achịkọtakwa mba niileMa kpọrọ ha bịa na Ndagwurugwu Jehoshafat.* M ga-ekpe ha ikpe n’ebe ahụ+N’ihi ndị m na ndị m ketara bụ́ Izrel,N’ihi na ha chụsasịrị ha ná mba dị iche iche,Ha kekwaara onwe ha ala m.+   Ha na-efe nza ka ha keere onwe ha ndị m.+ Ha na-eji nwata nwoke agbanweta akwụnaMa na-ere nwata nwaanyị ka ha zụta mmanya ha ga-aṅụ.   Taya na Saịdọn na ógbè niile dị na Filistia,Gịnị ka m mere unu? Ò nwere ihe m mere unu unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ na unu na-akwụghachi m ụgwọ,M ga-eme ka ihe unu mere m lọghachi n’isi unu ngwa ngwa, n’egbughị oge.+   Ebe ọ bụ na unu eburula ọlaọcha m na ọlaedo m,+Unu ebubakwala akụ̀ m ndị kacha mma n’ụlọ chi unu dị iche iche,   Unu ereela ndị Juda na ndị Jeruselem resị ha ndị Grik+Ka unu wee kpọpụ ha n’ala ha kpọga ha n’ebe dị anya,   M ga-eme ka ha si n’ebe unu refuru ha lọghachi.+ M ga-emekwa ka ihe unu mere ha lọghachi n’isi unu.   M ga-eresị ndị Juda ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+Ha ga-eresịkwa ha ndị Shiba, bụ́ mba dị anya,N’ihi na Jehova ekwuola ya.   Maanụ ọkwa ná mba dị iche iche,+ sị: ‘Jikerenụ agha! Kpọọnụ ndị dike ka ha pụta! Ka ndị agha niile bịa nso, ka ha lụọ agha!+ 10  Kpụgharịanụ mma ogè unu ka ha bụrụ mma agha nakwa mma unu ji akwa osisi ka ha bụrụ ube. Ka onye na-esighị ike sị: “Esiri m ike.” 11  Unu mba niile nọ gburugburu, bịanụ nyere ibe unu aka. Zukọtanụ.’”+ Jehova, biko, mee ka ndị dike* gị gbadata n’ebe ahụ. 12  “Ka mba dị iche iche zukọta ma bịa na Ndagwurugwu Jehoshafat,N’ihi na m ga-anọdụ ala n’ebe ahụ ikpe mba niile nọ gburugburu ikpe.+ 13  Werenụ mma e ji ewe ihe ubi wee ihe ubi n’ihi na ihe ubi achaala. Gbadatanụ zọchapụta mmanya n’ihi na mkpụrụ vaịn ejula n’ebe a na-azọchapụta mmanya.+ Olulu ebe mmanya a zọchapụtara na-asọba ejufeela ókè n’ihi na ihe ọjọọ ha dị ukwuu. 14  Ìgwè mmadụ, ìgwè mmadụ juru na ndagwurugwu ikpe,N’ihi na ụbọchị Jehova ga-ekpe ndị mmadụ ikpe na ndagwurugwu ahụ dị nso.+ 15  Anyanwụ na ọnwa ga-agba ọchịchịrị,Kpakpando agaghịkwa enye ìhè ha. 16  Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ. Ọ ga-esi na Jeruselem kwuo okwu. Eluigwe na ụwa ga-amakwa jijiji. Ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba,+Ọ ga-abụkwara ụmụ Izrel ebe a rụsiri ike. 17  Unu ga-amarakwa na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye bi na Zayọn, bụ́ ugwu nsọ m.+ Jeruselem ga-abụ ebe dị nsọ,+Ndị ala ọzọ agaghịkwa esi n’ime ya gafere ọzọ.+ 18  N’ụbọchị ahụ, mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu na-atapụsị.+ Mmiri ara ehi ga na-eru n’ugwu nta,Mmiri ga na-asọkwa n’iyi niile dị na Juda. Iyi ga-esi n’ụlọ Jehova na-asọpụta,+Ọ ga na-edekwa Ndagwurugwu Osisi Akeshịa. 19  Ma, Ijipt ga-atọgbọrọ chakoo,+Ịdọm ga-aghọkwa ala ịkpa a na-enweghị ihe dị na ya,+N’ihi na ha mesiri ndị Juda ike,+Bụ́ ndị ha nọ n’ala ha gbuo* ndị aka ha dị ọcha.+ 20  Ma ndị mmadụ ga-ebi na Juda mgbe niileNakwa na Jeruselem malite n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+ 21  Ndị m weere ka ndị aka ha na-adịghị ọcha* ka m ga-ewere ka ndị aka ha dị ọcha,*+Jehova ga-ebikwa na Zayọn.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jehoshafat pụtara “Jehova Bụ Onyeikpe.”
Ma ọ bụ “ndị agha.”
Na Hibru, “wụfuo ọbara.”
Na Hibru, “Ọbara ha m weere ka nke mere ihe ọjọọ.”
Na Hibru, “ka nke na-emeghị ihe ọjọọ.”