Jona 1:1-17
1 Jehova gwara Jona*+ nwa Amitaị okwu, sị:
2 “Bilie, gaa Ninive+ bụ́ obodo ukwu ma kwusaara ndị bi na ya na a ga-ebibi ha n’ihi na anụla m ihe ọjọọ ndị ha na-eme.”
3 Ma, Jona biliri ka ọ gbaga Tashish kama ịga ozi Jehova dunyere ya. Ọ gawara Jọpa ma hụ otu ụgbọ mmiri na-aga Tashish. O wee kwụọ ụgwọ ma banye n’ime ya ka o soro ndị nọ na ya gaa Tashish, ka ọ gbapụ n’ihu Jehova.
4 Jehova mere ka oké ifufe fee n’oké osimiri ahụ. E wee nwee oké ebili mmiri n’oké osimiri ahụ nke na ọ fọrọ obere ka ụgbọ ahụ kpuo.
5 Ezigbo ụjọ jidere ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ nke na onye ọ bụla n’ime ha bidoro ịkpọku chi ya ka o nyere ha aka. Ha wee malite ịtụnye ihe ndị dị n’ụgbọ ahụ n’oké osimiri, ka ụgbọ ahụ ghara ịdị oké arọ.+ Ma Jona agaala n’ala ala ụgbọ ahụ, dinara ala na-ehi ezigbo ụra.
6 Onyeisi ụgbọ ahụ bịakwutere ya, sị ya: “Gịnị mere i ji na-ehi ụra? Bilie, kpọkuo chi gị! Ezi Chineke nwere ike imere anyị ebere, anyị aghara ịnwụ.”+
7 Ha wee gwa ibe ha, sị: “Bịanụ ka anyị fee nza,+ ka anyị mata onye mere ọdachi a ji adakwasị anyị.” Ha wee fee nza, nza ahụ ama Jona.+
8 Ha sịrị Jona: “Biko gwa anyị, ọ̀ bụ onye mere ọdachi a ji adakwasị anyị? Olee ọrụ ị na-arụ, oleekwa ebe i si bịa? Ebee bụ obodo gị, oleekwa ezinụlọ i si?”
9 O wee sị ha: “Abụ m onye Hibru. Ọ bụ Jehova Chineke nke eluigwe, Onye kere oké osimiri na elu ala, ka m na-atụ egwu.”*
10 Ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ wee tụkwuo egwu. Ha wee jụọ ya, sị: “Gịnị ka i mere?” (Ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ matara na ọ na-agbapụ n’ihu Jehova maka na ọ gwara ha.)
11 N’ihi ya, ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme gị ka oké osimiri a dajụọrọ anyị?” N’ihi na ebili mmiri nọ na-akakwu njọ.
12 Ọ sịrị ha: “Bulienụ m tụba n’oké osimiri a. Ọ ga-adajụrụ unu n’ihi na ama m na ọ bụ maka m ka oké ifufe a ji na-enye unu nsogbu.”
13 Ma ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ gbalịrị ịkwọrọ ụgbọ ahụ gaghachi n’elu ala. Ma, ha emelighị ya n’ihi na ebili mmiri nọ na-akakwu njọ n’oké osimiri ahụ gburugburu ha.
14 Ha wee kpọkuo Jehova, sị: “Biko, Jehova, biko, ka anyị ghara ịnwụ n’ihi nwoke a.* Ka ọbara onye na-emeghị ihe ọjọọ ghara ịdị n’isi anyị, ebe ọ bụ na i meela ihe masịrị gị, Jehova.”
15 Ha wee bulie Jona tụba ya n’oké osimiri ahụ, oké osimiri ahụ adajụọ.
16 Egwu Jehova jidere ha.+ Ha wee chụọrọ Jehova àjà, kwekwa ya nkwa.
17 Ma Jehova zigara otu nnukwu azụ̀ ka o loo Jona. Jona wee nọrọ n’afọ azụ̀ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Jona pụtara “Nduru.”
^ Ma ọ bụ “na-efe.”
^ Ma ọ bụ “n’ihi mkpụrụ obi nwoke a.”