Jona 2:1-10

  • Ekpere Jona nọ n’afọ azụ̀ kpee (1-9)

  • Azụ̀ gbọpụtara Jona n’elu ala (10)

2  Jona nọ n’afọ azụ̀ ahụ kpee ekpere gwa Jehova bụ́ Chineke ya okwu.+  Ọ sịrị: “M nọ n’ahụhụ kpọọ Jehova, ya aza m.+ M nọ n’ala ala ili* rịọ ka i nyere m aka.+ Ị nụrụ olu m.   Mgbe ị tụbara m n’ime ime mmiri, n’ala ala oké osimiri,Oké osimiri kpuchiri m.+ Oké ebili mmiri gị niile gafere n’elu isi m.+   M sịrị, ‘A chụpụla m n’ihu gị. Olee otú m ga-esi ahụ ụlọ nsọ gị ọzọ?’   Mmiri kpuchiri m, chọọ ịla ndụ m n’iyi;*+M mikpuru n’ime ime osimiri. Ahịhịa konyejuru m n’isi.   M mikpuru n’ala ala ugwu. Ụwa mechibidoro m ọnụ ụzọ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ma i si n’olulu kpọpụta m ná ndụ, Jehova bụ́ Chineke m.+   Mgbe m* nọ n’ọnụ ọnwụ, echetara m Jehova.+ Ekpere m wee ruo gị ntị, n’ụlọ nsọ gị.+   Ndị na-efe arụsị na-abaghị uru na-ahapụ onye hụrụ ha n’anya.*   Ma m ga-eji olu ekele chụọrọ gị àjà. M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.+ Nzọpụta si n’aka Jehova.”+ 10  Ka oge na-aga, Jehova nyere azụ̀ ahụ iwu, ya agbọpụta Jona n’elu ala.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’afọ Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Ili.”
Ma ọ bụ “Mmiri kpuchiri m ruo ná mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “na-akwụsị igosi ịhụnanya pụrụ iche.”