Ozi Ọma Luk Dere 14:1-35
-
Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya na ụkwụ ya zara aza (1-6)
-
Gaa nọrọ ebe kacha ala ma a kpọọ gị oriri (7-11)
-
Kpọọ ndị na-enweghị ihe ha ga-eji kwụghachi gị oriri (12-14)
-
Ihe atụ gbasara ndị a kpọrọ oriri na-ekweghị abịa (15-24)
-
Ihe ọ ga-efu mmadụ iji bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs (25-33)
-
Ọ bụrụ na nnu anaghịzi atọ ka nnu (34, 35)
14 N’otu Ụbọchị Izu Ike, Jizọs banyere n’ụlọ otu onye na-achị achị bụ́ onye Farisii ịga rie nri. Ha nọkwa na-ele ya anya ka ha mara ihe ọ ga-eme.
2 Ma, e nwere otu nwoke nọ ebe ahụ ụkwụ ya na aka ya zara aza.
3 Jizọs wee jụọ ndị Farisii na ndị ahụ ma Iwu, sị: “È kwesịrị ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike, ka ọ̀ bụ na e kwesịghị?”+
4 Ma ha gbachiri nkịtị. N’ihi ya, o seere nwoke ahụ n’aka, gwọọ ya ma sị ya lawa.
5 O wee sị ha: “Ò nwere onye n’ime unu nwa ya nwoke ma ọ bụ ehi ya ga-adaba n’olulu mmiri+ n’Ụbọchị Izu Ike, ya ahapụ ịdọpụta ya ozugbo?”+
6 Ma, ha azalighị ya ajụjụ a.
7 Mgbe ọ hụrụ otú ndị a kpọrọ òkù si na-ahọrọ ebe kacha mma ha ga-anọ,+ ọ gwara ha, sị:
8 “Mgbe mmadụ kpọrọ gị oriri agbamakwụkwọ, agala nọdụ ebe kacha mma.+ O nwere ike ịbụ na e nwere onye a na-akwanyere ùgwù karịa gị ọ kpọkwara.
9 Onye ahụ kpọrọ unu oriri ga-abịa sị gị, ‘Ka onye a nọrọ ebe ahụ ị nọ.’ Ị ga-ejizi ihere bilie gaa nọrọ ebe kacha ala.
10 Kama, mgbe a kpọrọ gị oriri, gaa nọdụ n’ebe kacha ala, ka ọ ga-abụ na mgbe onye ahụ kpọrọ gị bịara, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, gaa nọdụ n’ebe ka elu.’ Ị ga-enwezi ùgwù n’anya ndị ọbịa ibe gị niile.+
11 N’ihi na onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala. Onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”+
12 Ọ gwakwara nwoke ahụ kpọrọ ya òkù, sị: “Mgbe ị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa rie nri ehihie ma ọ bụ nri anyasị, akpọla ndị enyi gị ma ọ bụ ụmụnne gị ma ọ bụ ndị ikwu gị ma ọ bụ ndị agbata obi gị bara ọgaranya, n’ihi na ha nwekwara ike ịkpọ gị ka ị bịa rie nri n’ụlọ ha.
13 Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, na ndị ìsì.+
14 Ị ga-enwekwa obi ụtọ maka na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ. N’ihi na a ga-akwụ gị ụgwọ mgbe a ga-akpọlite ndị ezi omume n’ọnwụ.”+
15 Mgbe otu n’ime ndị ọbịa ibe ya nụrụ ihe ndị a, ọ sịrị ya: “Onye ga-eri ihe* n’Alaeze Chineke ga-enwe obi ụtọ.”
16 Jizọs sịrị ya: “Otu nwoke mere nnukwu oriri,+ kpọọkwa ọtụtụ ndị ka ha bịa.
17 Mgbe oge oriri ahụ ruru, ọ gwara ohu ya ka ọ gaa gwa ndị ahụ ọ kpọrọ òkù, sị, ‘Bịanụ, n’ihi na a kwadochaala ihe niile.’
18 Ma, ha niile malitere ikwu ihe mere na ha agaghị abịali.+ Onye mbụ sịrị ya, ‘Azụrụ m ubi. M ga-aga hụ ya. Biko, ewela iwe. Agaghị m abịali.’
19 Onye ọzọ sịkwara, ‘Azụrụ m ehi iri e jikọrọ abụọ abụọ, m na-agakwa ileru ha anya. Biko, ewela iwe, agaghị m abịali.’+
20 Onye ọzọ sịkwara, ‘M ka lụrụ nwaanyị. N’ihi ya, agaghị m abịali.’
21 N’ihi ya, ohu ahụ lọtara kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị a. Nna ya ukwu ewee iwe ma sị ya, ‘Gaa ọsọ ọsọ n’okporo ámá, kpọta ndị ogbenye na ndị nwere nkwarụ na ndị ìsì na ndị ngwọrọ ebe a.’
22 Mgbe oge gatụrụ, ohu ahụ sịrị, ‘Nna anyị ukwu, emeela m ihe i kwuru. Ma, ụlọ gị ejubeghị.’
23 Nna ya ukwu asị ya, ‘Gaa n’okporo ụzọ na n’ụzọ ndị dị warara, gwasie ndị mmadụ ike ka ha bịa, ka ụlọ m ju eju.+
24 N’ihi na ana m asị unu, o nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ m kpọrọ òkù ga-eri nri a m siri.’”+
25 Mgbe e mechara, ìgwè mmadụ sooro ya gawa ebe ọ na-aga. O wee tụgharịa sị ha:
26 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m ma ọ hụghị m n’anya karịa nne ya na nna ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwaanyị, nakwa ndụ ya,*+ ọ gaghị abụli onye na-eso ụzọ m.+
27 Onye ọ bụla na-ebughị osisi ịta ahụhụ* ya, na-esokwa m, agaghị abụli onye na-eso ụzọ m.+
28 Dị ka ihe atụ, ò nwere onye n’ime unu chọrọ ịrụ ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka ọ mara ma ò nwere ihe ga-ezu iji rụchaa ya?
29 Ma ọ́ bụghị ya, o nwere ike ịtọ ntọala ya ma ọ gaghị arụchali ya. Ndị niile hụrụ ya ga-amalitekwa ịkwa ya emo,
30 na-asị: ‘Onye a bidoro ịrụ ụlọ ma ọ rụchalighị ya.’
31 Ọ bụrụ na eze nke nwere puku ndị agha iri (10,000) na-aga ịlụso eze ọzọ nwere puku ndị agha iri abụọ (20,000) agha, ọ ga-ebu ụzọ nọdụ ala, ya na ndị ndụmọdụ ya agbaa izu, ka ọ mara ma ọ̀ ga-emeri ma ọ bụ na ọ gaghị emeri.
32 N’eziokwu, ọ bụrụ na ọ chọpụta na ọ gaghị emerili eze nke ọzọ, ọ ga-eziga ndị nnọchianya ya mgbe eze ahụ ka nọ ebe dị anya, ka ha rịọ ya ka ya na ya mee udo.
33 N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime unu na-ahapụghị ihe niile o nwere agaghị abụli onye na-eso ụzọ m.+
34 “N’eziokwu, nnu dị mma. Ma ọ bụrụ na ọ naghịzi atọ ka nnu, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ tọwakwa ka nnu?+
35 Ọ dịghị mma ka e tinye ya n’ala ma ọ bụkwanụ ka e were ya mere nri ala. Ndị mmadụ na-awụfu ya. Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “ga-ata achịcha.”
^ Na Grik, “ma ọ kpọghị nne ya na nna ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwaanyị nakwa mkpụrụ obi ya asị.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu.