Ozi Ọma Matiu Dere 10:1-42

  • Ndịozi iri na abụọ (1-4)

  • Ntụziaka gbasara ikwusa ozi ọma (5-15)

  • A ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs (16-25)

  • Na-atụ Chineke egwu, atụla egwu mmadụ (26-31)

  • Iweta mma agha, ọ bụghị udo (32-39)

  • Ịnabata ndị na-eso ụzọ Jizọs (40-42)

10  N’ihi ya, ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya ma nye ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ*+ na ịgwọ ụdị ọrịa ọ bụla.  Aha ndịozi iri na abụọ ahụ bụ:+ Saịmọn, onye a na-akpọ Pita,+ na Andru+ nwanne ya, Jems nwa Zebedi na Jọn+ nwanne ya,  Filip na Batolomiu,+ Tọmọs+ na Matiu+ onye ọnaụtụ, Jems nwa Alfiọs, na Tadiọs,  Saịmọn, onye na-anụ ọkụ n’obi, na Judas Iskarịọt, onye mechara rara ya nye.+  Jizọs zipụrụ mmadụ iri na abụọ a ma sị ha:+ “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria.+  Kama, na-agakwurunụ atụrụ furu efu bụ́ mba Izrel.+  Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe adịla nso.’+  Gwọọnụ ndị ọrịa,+ kpọlitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ndị ekpenta dị ọcha, chụpụnụ ndị mmụọ ọjọọ. Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.  Unu ewerela ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ ọla kọpa unu ga-etinye n’obere akpa ego unu na-eke n’úkwù.+ 10  Unu ewerela obere akpa nri maka njem unu, unu achịrịla uwe abụọ,* ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, unu ewerekwala mkpara,+ n’ihi na e kwesịrị inye onye ọrụ nri.+ 11  “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ ndị kwesịrị ekwesị, nọrọkwanụ ebe ahụ ruo mgbe unu ga-apụ.+ 12  N’ụlọ ọ bụla unu bara, keleenụ* ndị ezinụlọ ahụ. 13  Ọ bụrụkwa na ha anabata unu, ha ga-enwe udo unu sị ka ha nwee.+ Ma ọ bụrụ na ha anabataghị unu, udo unu ga-alọghachikwute unu. 14  N’ebe ọ bụla a na-enweghị onye nabatara unu ma ọ bụ onye gere unu ntị, unu pụwa n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu.+ 15  N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-adịrị Sọdọm na Gọmọra+ mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa obodo ahụ. 16  “M na-eziga unu dị ka atụrụ ka unu gakwuru anụ ọhịa wolf. N’ihi ya, dịrịnụ akọ ka agwọ, bụrụkwanụ ndị na-adịghị aghụghọ otú ahụ nduru na-adịghị.+ 17  Lezienụ anya, n’ihi na ndị mmadụ ga-akpụpụ unu n’ụlọikpe obodo,+ ha ga-apịakwa unu ihe+ n’ụlọ nzukọ ha.+ 18  A ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze+ n’ihi m, ka unu si otú ahụ gbaara ha na ndị mba ọzọ àmà.+ 19  Ma, ha kpụta unu n’ihu ha, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu, n’ihi na a ga-agwa unu ihe unu ga-ekwu n’oge ahụ.+ 20  N’ihi na ọ bụghị ununwa na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.+ 21  Ihe ọzọ bụ na nwanne ga-enyefe nwanne ya ka e gbuo ya, nna ga-enyefekwa nwa ya, ụmụ ga-emegide nne na nna ha, meekwa ka e gbuo ha.+ 22  Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ Ma, ọ bụ onye tachiri obi* ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.+ 23  Ha kpagbuwe unu n’otu obodo, gbaganụ n’obodo ọzọ,+ n’ihi na n’eziokwu, ana m asị unu, unu agaghị agazuli obodo ndị dị n’Izrel ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute. 24  “Nwa akwụkwọ anaghị aka onye nkụzi ya, ohu anaghịkwa aka nna ya ukwu.+ 25  Ọ ga-ezuru nwa akwụkwọ ma ọ dịrị ka onye nkụzi ya, ọ ga-ezukwara ohu ma ọ dịrị ka nna ya ukwu.+ Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-akpọ onyeisi ezinụlọ Bielzebọb,*+ ọ̀ bụ na ha agaghị aka akpọ ya ndị ezinụlọ ya? 26  N’ihi ya, unu atụla ha egwu, n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, e nweghịkwa ihe nzuzo a na-agaghị amata.+ 27  Ihe m gwara unu n’ọchịchịrị, kwuonụ ya n’ìhè. Ihe unu nụkwara a takwunyere atakwunye, sinụ n’elu ụlọ kwusaa ya.+ 28  Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha agaghị egbuli mkpụrụ obi.*+ Kama na-atụnụ egwu onye ga-ebibili ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.*+ 29  Ọ̀ bụ na a naghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego* nke ga-azụta ntakịrị ihe? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma.+ 30  Ọ madị ole ntutu niile dị n’isi unu dị. 31  N’ihi ya, unu atụla egwu. Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.+ 32  “Onye ọ bụla nke na-agwa ndị mmadụ na ya ma m,+ m ga-agwakwa Nna m nke nọ n’eluigwe na m ma onye ahụ.+ 33  Ma onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, m ga-agọnahụkwa ya n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe.+ 34  Unu echela na m bịara ime ka udo dịrị n’ụwa. Abịara m iweta mma agha, ọ bụghị udo.+ 35  N’ihi na m bịara ikewa ezinụlọ. Nwoke ga na-emegide nna ya, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya, nwunye nwa ana-emegidekwa nne di ya.+ 36  N’eziokwu, ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya. 37  Onye hụrụ nne ya ma ọ bụ nna ya n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m. Onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.+ 38  Onye ọ bụla nke na-achọghị iburu osisi ịta ahụhụ* ya sowe m n’azụ erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.+ 39  Onye ọ bụla na-achọ ịzọ ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-adị ndụ ọzọ.+ 40  “Onye na-anabata unu na-anabatakwa m. Onye na-anabata m na-anabatakwa Onye zitere m.+ 41  Onye na-anabata onye amụma n’ihi na ọ bụ onye amụma ga-enweta ụgwọ ọrụ onye amụma.+ Onye na-anabatakwa onye ezi omume n’ihi na ọ bụ onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ onye ezi omume. 42  Onye ọ bụla nke nyere otu n’ime ndị a dị nta naanị otu iko mmiri jụrụ oyi ka ọ ṅụọ n’ihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, n’eziokwu, ana m asị unu, a ga-akwụrịrị ya ụgwọ ọrụ ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “uwe ọzọ.”
Ihe ndị Juu na-ekele ibe ha bụ, “udo dịrị gị.”
Ma ọ bụ “onye na-atachi obi.”
Bielzebọb bụ aha a na-akpọ Setan, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ onye na-achị ha.
Ma ọ bụ “ha agaghị egbochili mmadụ inwe olileanya ịdị ndụ ọzọ.”
Na Grik, “otu mkpụrụ ego asariọn.” Gụọ B14.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”