Ozi Ọma Matiu Dere 20:1-34
20 “N’ihi na Alaeze eluigwe dị ka onyeisi ezinụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya.+
2 Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego dinarịọs* maka otu ụbọchị, o zigara ha n’ubi vaịn ya.
3 Mgbe ọ pụkwara n’ihe dị ka n’awa nke atọ,* ọ hụrụ ndị ọzọ ka ha guzo n’ọma ahịa n’enweghị ihe ha na-arụ.
4 O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m. M ga-enye unu ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị.’
5 Ha wee gawa. Ọ pụrụ ọzọ n’ihe dị ka n’awa nke isii* nakwa n’awa nke itoolu* wee mee otu ihe ahụ.
6 N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’ihe dị ka n’awa nke iri na otu* hụ ka ndị ọzọ guzo, wee sị ha, ‘Gịnị mere unu ji guzo ebe a ụbọchị niile n’enweghị ihe unu na-arụ?’
7 Ha sịrị ya, ‘N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.’ O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m.’
8 “Mgbe o ruru uhuruchi, onye nwe ubi vaịn ahụ gwara onye na-elekọtara ya ọrụ, sị, ‘Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha,+ malite n’onye ikpeazụ ruo n’onye mbụ.’
9 Mgbe ndị awa nke iri na otu bịara, onye ọ bụla n’ime ha natara otu mkpụrụ ego dinarịọs.*
10 N’ihi ya, mgbe ndị mbụ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka ukwuu. Ma a kwụkwara ha otu mkpụrụ ego dinarịọs.*
11 Mgbe ha natara ya, ha malitere ịkatọ onyeisi ezinụlọ ahụ
12 wee sị ya, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa. Ma, ị kwụrụ anyị ihe ị kwụrụ ha n’agbanyeghị na anyị nọ n’anwụ na-arụgbu onwe anyị n’ọrụ kemgbe ụtụtụ.’
13 Ma ọ gwara otu n’ime ha, sị, ‘Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. Ihe mụ na gị kwekọrịtara ọ́ bụghị na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs?*+
14 Were ego gị lawa. Otu ihe ahụ m nyere gị ka m chọrọ inye onye ikpeazụ a.
15 Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị iji ihe m mee ihe masịrị m? Ka ị̀ na-emere m anyaụfụ* maka na m bụ ezigbo mmadụ?’*+
16 Otú a ka ndị ikpeazụ ga-esi bụrụ ndị mbụ, ndị mbụ abụrụkwa ndị ikpeazụ.”+
17 Mgbe Jizọs na-agbago Jeruselem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya iche, wee gwa ha n’okporo ụzọ,+ sị:
18 “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ n’ebe ahụ. Ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ.+
19 Ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha were ya mee ihe ọchị, pịakwa ya ihe ma kpọgide ya n’osisi.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+
20 Nne ụmụ Zebedi+ wee bịakwute ya, ya na ụmụ ya ndị nwoke, kpọọrọ ya isiala. Ọ bịara ịrịọ ya ka o meere ya ihe.+
21 Jizọs sịrị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?” Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Kwuo ka ụmụ m ndị nwoke abụọ a soro gị nọdụ ala n’Alaeze gị, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị.”+
22 Jizọs wee sị: “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Ùnu ga-aṅụli ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ?”+ Ha asị ya: “Anyị ga-aṅụli ya.”
23 O wee sị ha: “Unu ga-aṅụ ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ,+ ma ọ bụghị m na-ekpebi onye ga-anọ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.”+
24 Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe a, ha wesoro ụmụnne abụọ ahụ iwe.+
25 Ma Jizọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Ọ sịrị ha: “Unu ma na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị isi ha na-ejikwa aka ike achị ha.+
26 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ.+ Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+
27 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu.+
28 Otú ahụ ka Nwa nke mmadụ mere. Ọ bịaghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi+ ma nye ndụ* ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.”+
29 Mgbe ha si Jeriko na-apụ, ìgwè mmadụ sooro ya.
30 Ma, mgbe ndị ìsì abụọ ndị nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ nụrụ na Jizọs na-agafe, ha tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”+
31 Ma ìgwè mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ. Ma ha tisikwuru mkpu ike, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”
32 Jizọs wee kwụsị, kpọọ ha, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
33 Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, mee ka anyị hụwa ụzọ.”
34 Jizọs meteere ha ebere, bitụ ha aka n’anya,+ ha ahụwa ụzọ ozugbo wee soro ya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere ise nke mgbede.
^ Na Grik, “anya gị ọ̀ dị njọ.”
^ Ma ọ bụ “m na-emesapụ aka.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”