Ozi Ọma Matiu Dere 25:1-46
25 “E nwere ike iji Alaeze eluigwe tụnyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke, ndị buuru mpanaka* ha+ gaa izute nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ.+
2 Ise n’ime ha dị nzuzu, ma ise nwere uche.*+
3 Ndị nzuzu ahụ buuru mpanaka ha, ma ha ejighị mmanụ ọ bụla.
4 Ma ndị ahụ nwere uche ji mmanụ ha gbanyere n’ihe ha ji agbanye mmanụ, jirikwa mpanaka ha.
5 Mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ na-egbu oge, ha niile hulatara isi malite ihi ụra.
6 N’etiti abalị, e tiri mkpu, sị, ‘Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịawala! Pụtanụ ka unu zute ya.’
7 Mgbe ahụ, ụmụ agbọghọ ahụ niile na-amaghị nwoke biliri kwadebe mpanaka ha.+
8 Ndị nzuzu ahụ gwara ndị ahụ nwere uche, sị, ‘Gbanyetụnụ anyị mmanụ unu, n’ihi na ọkụ anyị agawala ịnyụ.’
9 Ndị ahụ nwere uche sịrị ha: ‘O nwere ike ọ gaghị ezuru anyị na unu. Gakwurunụ ndị na-ere mmanụ, zụrụ nke unu.’
10 Mgbe ha na-aga ịzụta mmanụ, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere. Ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị dị njikere, sooro ya banye n’oriri agbamakwụkwọ ahụ,+ e wee mechie ụzọ.
11 N’ikpeazụ, ụmụ agbọghọ ise ndị nke ọzọ na-amaghị nwoke bịakwara, sị, ‘Nna anyị ukwu, Nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ!’+
12 O wee sị ha, ‘Ana m agwa unu eziokwu, amaghị m ndị unu bụ.’
13 “N’ihi ya, na-echenụ nche,+ maka na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge ọ ga-abụ.+
14 “N’ihi na ọ dị ka nwoke na-achọ ije mba ọzọ wee kpọkọta ndị ohu ya ma nyefee ha ihe ndị o nwere.+
15 O nyere otu onye talent* ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ọzọ otu. O nyere onye nke ọ bụla dị ka ike ya hà, wee jewe mba ọzọ.
16 Ozugbo ahụ, onye natara talent ise gara jiri ya zụọ ahịa ma rite ise ọzọ n’uru.
17 Onye natakwara abụọ ritere abụọ ọzọ n’uru.
18 Ma ohu nke natara naanị otu gara gwuo ala zoo ego* nna ya ukwu.
19 “Mgbe ogologo oge gachara, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara, ya na ha emee mpịazi.+
20 N’ihi ya, onye natara talent ise bịara weta talent ise ọzọ, sị, ‘Nna m ukwu, i nyere m talent ise, ma, eritere m talent ise ọzọ n’uru.’+
21 Nna ya ukwu wee sị ya: ‘I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe.+ Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’+
22 E mechaa, onye natara talent abụọ bịara, sị, ‘Nna m ukwu, i nyere m talent abụọ, ma, eritere m talent abụọ ọzọ n’uru.’+
23 Nna ya ukwu sịrị ya: ‘I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe. Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’
24 “N’ikpeazụ, ohu nke natara otu talent bịara, sị: ‘Nna m ukwu, ama m na ị bụ onye aka ike, nke na-aghọrọ mkpụrụ ebe ọ na-akụghị mkpụrụ, onye na-ekpokọtakwa mkpụrụ ebe ọ na-afụchaghị mkpụrụ.+
25 N’ihi ya, atụrụ m egwu wee gaa zoo talent gị n’ala. Wekwara ihe gị.’
26 Nna ya ukwu asị ya: ‘Ajọ ohu nke dị umengwụ, ị̀ na-ekwu na ị ma na m na-aghọrọ mkpụrụ ebe m na-akụghị mkpụrụ, na-ekpokọtakwa mkpụrụ ebe m na-afụchaghị mkpụrụ?
27 Ebe ị ma otú ahụ, ị gaara etinye ego* m n’ụlọ akụ̀. Mgbe m bịara, m gaara anata ya na ọmụrụ nwa ya.
28 “‘N’ihi ya, natanụ ya talent ahụ nye onye ahụ nke nwere talent iri.+
29 N’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya, ọ ga-enwekwa ihe n’uju. Ma onye na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere enwe.+
30 Chụpụkwanụ ohu a na-abaghị uru ọ bụla n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.’
31 “Mgbe Nwa nke mmadụ+ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile,+ ọ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube.
32 A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya. Ọ ga-eke ndị mmadụ ụzọ abụọ, otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ si esi n’ebe ewu nọ họpụta atụrụ iche.
33 Ọ ga-eme ka atụrụ+ nọrọ n’aka nri ya, meekwa ka ewu nọrọ n’aka ekpe ya.+
34 “Mgbe ahụ, Eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya: ‘Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi. Ketanụ Alaeze a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.
35 N’ihi na agụụ gụrụ m, unu enye m nri ka m rie. Mmiri gụrụ m, unu ekunye m mmiri ka m ṅụọ. Abụ m ọbịa, unu anabata m nke ọma.+
36 Agba m ọtọ, unu eyiwe m uwe.+ Arịara m ọrịa, unu elekọta m. Anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu abịa leta m.’+
37 Mgbe ahụ, ndị ezi omume ga-asị ya: ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị nye gị nri, ma ọ bụ ka mmiri na-agụ gị kunye gị mmiri ka ị ṅụọ?+
38 Olee mgbe anyị hụrụ gị ka ị bụ ọbịa wee nabata gị nke ọma, ma ọ bụ ka ị gba ọtọ wee yiwe gị uwe?
39 Olee mgbe anyị hụrụ gị ka ị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ wee leta gị?’
40 Eze ahụ ga-asị ha, ‘N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụ m ka unu meere ihe ọ bụla unu meere otu n’ime ndị kacha nta n’ime ụmụnna m ndị a.’+
41 “Mgbe ahụ, ọ ga-asị ndị nọ n’aka ekpe ya: ‘Sinụ ebe m nọ pụọ,+ unu ndị a bụrụ ọnụ. Banyenụ n’ọkụ ebighị ebi*+ a kwadebeere Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.+
42 N’ihi na agụụ gụrụ m, ma ọ dịghị nri unu nyere m ka m rie. Mmiri gụrụ m, ma ọ dịghị mmiri unu kunyere m ka m ṅụọ.
43 Abụ m ọbịa, ma unu anabataghị m nke ọma. Agba m ọtọ, ma unu eyiweghị m uwe. Arịara m ọrịa, nọrọkwa n’ụlọ mkpọrọ, ma unu elekọtaghị m.’
44 Mgbe ahụ, ha ga-asị ya: ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka mmiri na-agụ gị, ma ọ bụ ka ị bụ ọbịa, ma ọ bụ ka ị gba ọtọ, ma ọ bụ ka ị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ ma ghara ijere gị ozi?’
45 Mgbe ahụ, ọ ga-asị ha: ‘N’eziokwu, ana m asị unu, ebe unu na-emereghị ya otu n’ime ndị a kacha nta, unu emereghị m ya.’+
46 Ndị a ga-anwụ ruo mgbe ebighị ebi,*+ ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Ma ọ bụ “ma ihe.”
^ Na Grik, “ọlaọcha.”
^ Na Grik, “ọlaọcha.”
^ Ọ pụtara mbibi ebighị ebi. Gụọ Nkọwa Okwu, “Ọdọ ọkụ.”
^ Na Grik, “A ga-egbupụ ha ruo mgbe ebighị ebi,” otú ahụ e si egbupụ alaka osisi.