Mkpughe E Kpugheere Jọn 12:1-17

  • Otu nwaanyị na nwa ya nwoke na otu dragọn (1-6)

  • Maịkel lụsoro dragọn agha (7-12)

    • A chụdatara dragọn ahụ n’ụwa (9)

    • Ekwensu ma na oge ya fọrọ ntakịrị (12)

  • Dragọn ahụ kpagburu nwaanyị mụrụ nwa nwoke (13-17)

12  Ahụkwara m nnukwu ihe àmà n’eluigwe. Ihe àmà ahụ bụ: Otu nwaanyị+ nke yi anyanwụ dị ka uwe, ọnwa dịkwa n’okpuru ụkwụ ya. O kpukwa okpueze e ji kpakpando iri na abụọ mee.  Nwaanyị ahụ dị ime. Ebe ọ bụkwa na ime na-eme ya, ọ na-eti mkpu n’ihi mgbu ịmụpụta nwa na-egbu ya nakwa ụfụ ọ na-afụ ya.  Ahụkwara m ihe àmà ọzọ n’eluigwe. Ahụrụ m nnukwu dragọn* na-acha uhie uhie,*+ nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwa okpueze asaa n’isi ya.  Ọdụ ya dọkpụụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando+ ndị dị n’eluigwe, tụdata ha n’ụwa.+ Dragọn ahụ guzokwa n’ihu nwaanyị ahụ+ nke na-aga ịmụ nwa, ka ọ ga-abụ, ọ mụọ nwa, ya erie nwa ahụ.  Nwaanyị ahụ wee mụọ nwa nwoke,+ onye ga-eji mkpanaka ígwè taa mba niile ahụhụ.*+ E kukwaara nwa ya ozugbo kugara Chineke n’ocheeze ya.  Nwaanyị ahụ gbagakwara n’ala ịkpa, ebe Chineke kwadebere ọ ga-anọ, ka a na-enye ya nri ebe ahụ ruo otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii (1,260).+  Agha dakwara n’eluigwe: Maịkel*+ na ndị mmụọ ozi ya lụsoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya lụsokwara ha agha.  Ma, e meriri dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya,* nke na e nweghịzi ebe ha ga-anọ n’eluigwe.  A chụdataziri nnukwu dragọn+ ahụ n’ụwa.+ Ọ bụ ya bụ agwọ mbụ ahụ,+ onye a na-akpọ Ekwensu+ na Setan,+ onye na-eduhie ụwa niile.+ A chụdatara ya na ndị mmụọ ozi ya. 10  Anụkwara m oké olu nke si n’eluigwe sị: “Chineke anyị azọpụtala ndị mmadụ!+ O ji ike ya merie! Alaeze ya amalitela ịchị!+ Kraịst ya amalitela iji ikike o nwere akpa ike, n’ihi na a chụdala onye na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị!+ 11  Ha merikwara ya+ n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ,+ na n’ihi ozi ha zisara.+ Ha ahụghịkwa ndụ* ha n’anya.+ Ọ bụ ya mere na ha atụghị ụjọ ọnwụ. 12  N’ihi ya, ṅụrịanụ ọṅụ, unu ndị bi n’eluigwe. Ụwa na oké osimiri ga-ata ahụhụ+ n’ihi na Ekwensu agbadatala ebe ha nọ. Ezigbo iwe ji ya maka na ọ ma na oge ya fọrọ ntakịrị.”+ 13  Mgbe dragọn ahụ hụrụ na a chụdatala ya n’ụwa,+ ọ kpagburu nwaanyị ahụ+ mụrụ nwa nwoke. 14  Ma e nyere nwaanyị ahụ nku abụọ nke nnukwu ugo,+ ka o fega n’ala ịkpa, ebe a kwadebeere ya. N’ebe ahụ ka a ga-enye ya nri ruo otu oge na oge abụọ na ọkara otu oge*+ ebe agwọ ahụ+ na-anọghị. 15  Agwọ ahụ wee gbụpụta mmiri yiri osimiri n’ọnụ ya n’azụ nwaanyị ahụ, ka mmiri ahụ rie nwaanyị ahụ. 16  Ma ala nyeere nwaanyị ahụ aka. O meghere ọnụ loo mmiri ahụ dragọn ahụ gbụpụtara n’ọnụ ya. 17  Dragọn ahụ wee wesa nwaanyị ahụ iwe, gaakwa ịlụso ndị fọdụrụ n’ime ụmụ* ya agha,+ bụ́ ndị na-edebe iwu Chineke, ndị e nyekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nnukwu agwọ.”
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Ma ọ bụ “onye ga-eji mkpanaka ígwè chịa mba niile.”
Maịkel pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”
O nwere ike ịbụ, “Ma e meriri dragọn ahụ.”
Na Grik, “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, oge atọ na ọkara.
Na Grik, “mkpụrụ.”