Mkpughe E Kpugheere Jọn 7:1-17
7 Mgbe ihe a gachara, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo n’akụkụ anọ nke ụwa. Ha jidesiri ifufe si n’akụkụ anọ nke ụwa ike, ka ifufe ọ bụla ghara ife n’ụwa ma ọ bụ n’oké osimiri ma ọ bụ n’osisi ọ bụla.
2 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ na-agbago. O nwekwara akara nke Chineke dị ndụ. O wee jiri oké olu gwa ndị mmụọ ozi anọ ahụ e nyere ikike imebi ụwa na oké osimiri,
3 sị: “Unu emebila ụwa ma ọ bụ oké osimiri ma ọ bụ osisi, ruo mgbe anyị kachara ndị ohu Chineke anyị akara+ n’egedege ihu.”+
4 Anụkwara m na ndị ahụ a kara akara dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000).+ Ha si n’ebo niile nke ụmụ Izrel:+
5 Ndị si n’ebo Juda dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Ruben dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Gad dị puku iri na abụọ (12,000).
6 Ndị si n’ebo Asha dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Naftalaị dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Manase+ dị puku iri na abụọ (12,000).
7 Ndị si n’ebo Simiọn dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Livaị dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Ịsaka dị puku iri na abụọ (12,000).
8 Ndị si n’ebo Zebulọn dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Josef dị puku iri na abụọ (12,000).Ndị si n’ebo Benjamin dị puku iri na abụọ (12,000).
9 Mgbe ihe ndị a gachara, ka m nọ na-ele anya, ahụrụ m oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yi uwe mwụda na-acha ọcha,+ jirikwa igu nkwụ n’aka.+ Ha si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile.+
10 Ha jikwa oké olu na-eti mkpu, sị: “Ọ bụ Chineke anyị, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ nakwa Nwa Atụrụ ahụ zọpụtara anyị.”+
11 Ndị mmụọ ozi niile guzokwa gburugburu ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ+ na ndị mmụọ ozi anọ ahụ.* Ha gbukwara ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala n’ihu ocheeze ahụ ma kpọọrọ Chineke isiala,
12 sị: “Amen! Ka a na-eto Chineke anyị, onye nwere amamihe na ume, onye dịkwa ike. Ka a na-ekelekwa ya ma na-asọpụrụ ya ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen.”
13 Otu n’ime ndị okenye ahụ wee sị m: “Ole ndị bụ ndị a yi uwe mwụda na-acha ọcha?+ Oleekwa ebe ha si bịa?”
14 M wee sị ya ozugbo: “Onyenwe m, ọ bụ gịnwa ma.” Ya asị m: “Ndị a si n’oké mkpagbu ahụ pụta.+ Ha ejirila ọbara Nwa Atụrụ ahụ saa uwe mwụda ha, uwe mwụda ha ana-achazi ọcha.+
15 Ọ bụ ya mere ha ji nọrọ n’ihu ocheeze Chineke. Ha na-ejekwara ya ozi n’ụlọ nsọ ya ehihie na abalị. Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ ga-echebekwa ha.*+
16 Agụụ agaghị agụ ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọ ha nkụ ọzọ. Anwụ agaghị acha ha, oké okpomọkụ agaghịkwa adị ebe ha nọ,+
17 n’ihi na Nwa Atụrụ ahụ,+ onye nọ n’etiti ocheeze ahụ, ga-azụ ha dị ka atụrụ,+ dugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.+ Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”
^ Ma ọ bụ “ga-agbasakwa ụlọikwuu ya n’isi ha.”